Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 42 p. 217-221
  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-arụ Ọrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-arụ Ọrụ
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọkwá Nkà”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 42 p. 217-221

ISI NKE 42

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-arụ Ọrụ

OLEE nke na-amasị gị karị, ịrụ ọrụ ka ọ̀ bụ igwuri egwu?— N’ikwu eziokwu, o nweghị ihe ọjọọ dị n’igwuri egwu. Bible na-ekwu na Jeruselem ‘jupụtara n’ụmụntakịrị ndị ikom na ụmụntakịrị ndị inyom na-egwuri egwu n’ámá ya nile.’—Zekaraịa 8:5.

Ọ na-atọ Onye Ozizi Ukwu ahụ ụtọ ikiri ụmụaka na-egwuri egwu. Tupu ọ bịa n’ụwa, ọ sịrị: “Anọkwa m n’akụkụ [Chineke], dị ka onye ọkà . . . na-egwuri egwu n’ihu Ya mgbe nile.” Ọkpụkpọ a kpọrọ Jizọs “onye ọkà” na-egosi na o so Jehova rụọ ọrụ n’eluigwe. Mgbe ọ nọkwa n’ebe ahụ, ọ sịrị: “Ihe na-atọ m ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” Ee, dị ka anyị mụrụ na mbụ, Onye Ozizi Ukwu ahụ nwere ezi mmasị n’ebe onye ọ bụla nọ, gụnyere ndị na-eto eto.—Ilu 8:30, 31.

[Foto dị na peeji nke 217]

Gịnị na-atọ Onye Ozizi Ukwu ahụ ụtọ ime tupu ọ bịa n’ụwa?

Ì chere na Jizọs gwuriri egwu mgbe ọ bụ obere nwa?— Ikekwe o gwuriri. Ma ebe ọ bụ “onye ọkà” n’eluigwe, ọ̀ rụkwara ọrụ n’ụwa?— A kpọrọ Jizọs “nwa ọkwá nkà.” Ma a kpọkwara ya “ọkwá nkà.” Gịnị ka nke a na-egosi?— Ọ ghaghị ịbụ na Josef, bụ́ onye zụlitere Jizọs dị ka nwa ya, kụziiri ya ọrụ ahụ. Ya mere Jizọs ghọkwara ọkwá nkà.—Matiu 13:55; Mak 6:3.

Ụdị ọkwá nkà dị aṅaa ka Jizọs bụ?— Ebe ọ bụ onye ọkà n’eluigwe, í cheghị na ọ ghọrọ ọkà n’ọrụ ịkwa nkà n’ụwa?— Cheedị echiche otú ịbụ onye ọkwá nkà n’oge ahụ siruru ike. Ma eleghị anya, Jizọs na-apụ gaa gbutuo osisi, gbujisie ya, bulata ha, wee jirizie osisi ndị ahụ rụọ tebụl, bench, na ihe ndị ọzọ.

Ì chere na ọrụ a nyere Jizọs obi ụtọ?— Ị̀ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na i nwee ike ịrụ tebụl na oche na ihe ndị ọzọ mara mma ka ndị mmadụ jiri ha na-eme ihe?— Bible na-ekwu na ọ dị mma ka mmadụ ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ọrụ ya.’ Ọrụ na-eweta ụdị obi ụtọ nke ị na-apụghị inweta site n’igwuri egwu.—Eklisiastis 3:22.

N’ezie, ọrụ dị mma maka ma uche ma ahụ́ anyị. Ọtụtụ ụmụaka na-anọdụ ala na-ekiri TV ma ọ bụ na-egwu egwuregwu vidio. Ha na-ebubiga ibu ókè ma ghọọ ndị na-adịghị ike, ha adịghịkwa enwe obi ụtọ n’ezie. Ha adịghịkwa eme ka ndị ọzọ nwee obi ụtọ. Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee iji nwee obi ụtọ?—

Anyị mụrụ n’Isi nke 17 nke akwụkwọ a na inye ihe na ime ihe iji nyere ndị ọzọ aka na-eweta obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Bible kpọrọ Jehova “Chineke onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Dịkwa ka anyị gụrụ n’Ilu, Jizọs “na-egwuri egwú n’ihu Ya mgbe nile.” Gịnị mere Jizọs ji nwee obi ụtọ?— O kwuru otu n’ime ihe ndị kpatara ya mgbe ọ sịrị: “Nna m anọgidewo na-arụ ọrụ ruo ugbu a, anọgidewokwa m na-arụ ọrụ.”—Jọn 5:17.

Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ rụghị ọrụ dị ka onye ọkwá nkà ogologo ndụ ya nile. Jehova Chineke nyere ya ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụ n’ụwa. Ị̀ ma ọrụ ahụ?— Jizọs sịrị: ‘Aghaghịkwa m ịkpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.’ (Luk 4:43) Mgbe ụfọdụ, mgbe Jizọs kwusaara ndị mmadụ ozi ọma, ha kwenyere n’ihe o kwuru ma gwa ndị ọzọ ihe ndị o kwuru, otú nwanyị Sameria a ị na-ahụ n’ebe a mere.—Jọn 4:7-15, 27-30.

[Foto ndị dị na peeji nke 218]

Olee ụdị ọrụ abụọ Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa?

Olee otú ọrụ a dị Jizọs n’obi? Ì chere na ọ chọrọ ịrụ ya?— Jizọs sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche nke onye ahụ zitere m nakwa ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:34) Olee otú ị na-enweru mmasị n’iri nri kasị amasị gị?— Nke a ga-enyere gị aka ịghọta otú Jizọs nweruru mmasị n’ọrụ ahụ Chineke nyere ya ka ọ rụọ.

Chineke kere anyị n’ụzọ ga-eme ka ịmụta ịdị na-arụ ọrụ nyere anyị aka inwe obi ụtọ. O kwuru na onyinye O nyere mmadụ bụ ka o nwee ike “ịṅụrị ọṅụ n’ime ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.” Ya mere, ọ bụrụ na ị mụta ịdị na-arụ ọrụ mgbe ị ka bụ obere nwa, ị ga-enwe obi ụtọ karị ná ndụ gị nile.—Eklisiastis 5:19.

Ma nke ahụ apụtaghị na obere nwa pụrụ ịrụ ọrụ onye meworo okenye ga-arụ, ma anyị nile pụrụ ịrụ ọrụ ụfọdụ. Ndị mụrụ gị nwere ike ịdị na-aga ọrụ kwa ụbọchị iji kpata ego ka ezinụlọ unu wee nwee nri unu ga-eri na ebe unu ga-ebi. Dịkwa ka i kwesịrị ịma, e nwere ọtụtụ ọrụ ndị ọ dị mkpa ka a rụọ n’ụlọ iji mee ka ọ dị ọcha, dịkwa mma n’anya.

Olee ọrụ i nwere ike ịrụ nke ga-abara ezinụlọ dum uru?— Ị pụrụ inye aka dozie tebụl, saa efere, kpofuo ahịhịa, hichaa ọnụ ụlọ gị ma debe ihe ndị i ji egwuri egwu n’ebe ha kwesịrị ịdị. Ikekwe ị na-eme ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ. Ọrụ ahụ na-abara ezinụlọ uru n’ezie.

[Foto dị na peeji nke 221]

Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị na-edebe ihe ndị i ji egwuri egwu n’ebe ha kwesịrị ịdị mgbe i gwusịrị egwu?

Ka anyị lee otú ụdị ọrụ ahụ si aba uru. I kwesịrị idebe ihe ndị i ji egwuri egwu n’ebe ha kwesịrị ịdị mgbe i gwusịrị egwu. Olee ihe i chere mere nke a ji dị mkpa?— Ọ na-enye aka ime ka ụlọ dị mma n’anya, ọ pụkwara igbochi mmerụ ahụ́. Ọ bụrụ na i debeghị ihe ndị i ji egwuri egwu n’ebe ha kwesịrị ịdị, nne gị pụrụ iburu ihe n’aka na-agafe otu ụbọchị ma zọkwasị otu n’ime ha ụkwụ. Ọ pụrụ ịkwada ya, ya emerụọkwa ahụ́. Ọ pụrụ ọbụna ịgara ya ụlọ ọgwụ. Nke ahụ ọ́ gaghị abụ ihe jọgburu onwe ya?— Ya mere mgbe i debere ihe ndị e ji egwuri egwu n’ebe ha kwesịrị ịdị mgbe i gwusịrị egwu, nke ahụ na-abara mmadụ nile uru.

Ụmụaka nwekwara ọrụ ọzọ. Dị ka ihe atụ, ihe omume ụlọ akwụkwọ. Ị na-amụ otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ịgụ ihe na-atọ ụmụaka ụfọdụ ụtọ, ma ndị ọzọ na-ekwu na o siri ike. Ọ bụrụgodị na o yie ka o siri ike ná mmalite, ị ga-enwe obi ụtọ ma ị mụta ịgụ ihe nke ọma. Mgbe ị mụtara ịgụ ihe nke ọma, e nwere ọtụtụ ihe na-adọrọ mmasị ndị i nwere ike ịmụta. Ị ga-enwe ike ọbụna ịgụ akwụkwọ Chineke, bụ́ Bible, n’onwe gị. Ya mere, mgbe i mere ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ nke ọma, ọ na-aba uru n’ezie, ọ́ bụghị ya?—

E nwere ụfọdụ ndị na-agbalị izere ịrụ ọrụ. Ikekwe ị maara otu onye na-eme otú ahụ. Ma ebe Chineke mere anyị ka anyị na-arụ ọrụ, ọ dị mkpa ka anyị mụta ụzọ isi na-enweta obi ụtọ site n’ịrụ ọrụ. Olee otú Onye Ozizi Ukwu ahụ nweruru obi ụtọ n’ọrụ ya?— Ọ dị ya ka iri nri kasị amasị ya. Oleekwa ọrụ ọ na-ekwu maka ya?— Ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova Chineke na otú ha pụrụ isi nweta ndụ ebighị ebi.

Ya mere, lee ihe pụrụ inyere anyị aka inweta obi ụtọ n’ịrụ ọrụ. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere o ji dị mkpa ka a rụọ ọrụ a?’ Mgbe ị maara ihe mere otu ihe ji dị mkpa, ọ na-adịrị gị mfe karị ime ya. Ma ọrụ ahụ ò buru ibu ma ọ̀ dị ntakịrị, rụọ ya nke ọma. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị pụrụ inweta ọṅụ n’ọrụ nke aka gị, dị nnọọ ka Onye Ozizi Ukwu ahụ nwetara.

Bible pụrụ inyere mmadụ aka ịghọ ezigbo onye ọrụ. Gụọ ihe o kwuru n’Ilu 10:4; 22:29; Eklisiastis 3:12, 13 nakwa ná Ndị Kọlọsi 3:23.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya