Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 45 p. 232-237
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ụzọ Isi Gosi na Anyị Chọrọ Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ụzọ Isi Gosi na Anyị Chọrọ Ya
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Kụziri Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Hụ Jizọs n’Anya
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 45 p. 232-237

ISI NKE 45

Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ụzọ Isi Gosi na Anyị Chọrọ Ya

Ị̀ MA ekpere ahụ Jizọs kụziiri ụmụazụ ya?— Ọ bụrụ na ị maghị ya, anyị nwere ike ịgụkọ ya ọnụ na Bible, na Matiu 6:9-13. Ekpere ahụ ọtụtụ ndị na-akpọ Ekpere Onyenwe Anyị, nwere okwu bụ́: “Ka alaeze gị bịa.” Ị̀ ma ihe bụ́ Alaeze Chineke?—

Ọ dị mma, eze bụ onye na-achị mba ma ọ bụ otu ókèala. A na-akpọkwa ọchịchị ya alaeze. Ná mba ụfọdụ, a na-akpọ onyeisi ọchịchị president. Gịnị ka a na-akpọ Onye Ọchịchị nke ọchịchị Chineke?— A na-akpọ ya Eze. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ọchịchị Chineke Alaeze.

Ị̀ ma onye Jehova Chineke họọrọ ka ọ bụrụ Eze n’ọchịchị Ya?— Ọ bụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Gịnị mere o ji bụrụ onye ọchịchị dị mma karịa onye ọchịchị ọ bụla ụmụ mmadụ pụrụ ịhọrọ?— Ọ bụ n’ihi na Jizọs hụrụ Nna ya, bụ́ Jehova, n’anya n’ezie. Ya mere, ọ na-eme ihe ziri ezi mgbe nile.

Ogologo oge tupu a mụọ Jizọs na Betlehem, Bible kwuru okwu banyere ọmụmụ ya ma kwuo na ọ ga-aghọ Onye Ọchịchị Chineke họpụtara. Ka anyị gụọ banyere nke a n’Aịsaịa 9:6, 7. Ọ na-ekwu, sị: ‘A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị, ọchịchị ga-adịkwasịkwa n’ubu ya, a ga-akpọkwa ya Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ọchịchị ya na udo Ya ga-agwụ.’

Ị̀ ma ihe mere e ji kpọọ Onye Ọchịchị Alaeze Chineke “Onyeisi” n’ebe a?— Onyeisi a bụ ọkpara eze. Jizọs bụkwa Ọkpara nke Eze Ukwu ahụ, bụ́ Jehova. Ma Jehova emewokwa Jizọs Eze nke ọchịchị Ya, bụ́ nke ga-achị ụwa ruo otu puku afọ. (Mkpughe 20:6) Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, ọ malitere “ime nkwusa na-asị: ‘Chegharịanụ, n’ihi na alaeze nke eluigwe eruwo nso.’”—Matiu 4:17.

Gịnị ka i chere mere Jizọs ji kwuo na Alaeze ahụ eruwo nso?— Ọ bụ n’ihi na Eze ahụ, bụ́ onye ga-emesịa na-achị n’eluigwe, nọ kpọmkwem n’etiti ha! Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị mmadụ, sị: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu.” (Luk 17:21) Ị́ gaghị enwe mmasị ka Eze Jehova họpụtara nọrọ gị nnọọ nso nke na ị pụrụ ọbụna imetụ ya aka?—

Gwagodị m, olee ọrụ dị mkpa Jizọs bịara n’ụwa ịrụ?— Jizọs zara ajụjụ ahụ, na-asị: “Aghaghịkwa m ịkpọsara obodo ndị ọzọ ozi ọma banyere alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Jizọs maara na nanị ya apụghị ịrụ ọrụ nkwusa ahụ nile. Ya mere, gịnị ka i chere o mere?—

[Foto ndị dị na peeji nke 232, 233]

Olee ọrụ Jizọs bịara n’ụwa ịrụ?

Jizọs kpọọrọ ndị mmadụ ma gosi ha ụzọ isi rụọ ọrụ nkwusa ahụ. Ndị mbụ o nyere ọzụzụ n’ọrụ a bụ mmadụ 12 ahụ ọ họọrọ dị ka ndịozi. (Matiu 10:5, 7) Ma ọ̀ bụ nanị ndịozi ya ka Jizọs nyere ọzụzụ ịrụ ọrụ a? Ee e, Bible na-ekwu na Jizọs nyekwara ọtụtụ ndị ọzọ ọzụzụ n’ụzọ isi na-eme nkwusa. Ka oge na-aga, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ 70 ọzọ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gawa. Gịnịkwanụ ka ha na-akụziri ndị mmadụ?— Jizọs sịrị: “Gaakwanụ n’ihu na-asị ha, ‘Alaeze Chineke abịaruwo unu nso.’” (Luk 10:9) N’ụzọ dị otú a ndị mmadụ mụtara banyere ọchịchị Chineke.

Ogologo oge gara aga n’Izrel, ndị e chiri eze ọhụrụ na-eji nwa ịnyịnya ibu agagharị n’obodo ka ndị mmadụ hụ ha. Nke a bụ ihe Jizọs mere mgbe ikpeazụ ọ gara Jeruselem. Ị hụlanụ, Jizọs na-aga ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze Chineke. Ndị mmadụ hà chọrọ ka ọ bụrụ Eze ha?—

Ka ọ na-agafe, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ malitere ịgbasa uwe elu ha n’okporo ụzọ n’ihu ya. Ndị ọzọ na-egbute alaka osisi na-atụsa n’ụzọ. Site n’ime nke a, ha na-egosi na ha chọrọ ka Jizọs bụrụ Eze ha. Ha na-eti mkpu, na-asị: “Onye a gọzịrị agọzi ka Onye ahụ nke na-abịa dị ka Eze n’aha Jehova bụ!” Ma ọ bụghị mmadụ nile nwere obi ụtọ. N’ezie, ụfọdụ ndị ndú okpukpe ọbụna sịrị Jizọs, ‘Gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ.’—Luk 19:28-40.

[Foto ndị dị na peeji nke 235]

Gịnị mere ndị mmadụ ji gbanwee obi ha na ha achọkwaghị ka Jizọs bụrụ Eze ha?

Ụbọchị ise ka e mesịrị, e jidere Jizọs ma kpụga ya n’obí eze n’ihu gọvanọ, bụ́ Pọntịọs Paịlet. Ndị iro Jizọs sịrị na Jizọs na-ekwu na ya bụ eze nakwa na ọ na-emegide ọchịchị Rom. Ya mere, Paịlet jụrụ Jizọs ma ọ̀ bụ eziokwu. Jizọs gosiri na ya anaghị agbalị iweghara ọchịchị. Ọ gwara Paịlet, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a.”—Jọn 18:36.

Paịlet pụrụ n’èzí ma gwa ndị ahụ na ọ dịghị ihe ọjọọ ya hụrụ n’ebe Jizọs nọ. Ma ugbu a ndị ahụ achọghị ka Jizọs bụrụ Eze ha. Ha achọghị ka a tọhapụ ya. (Jọn 18:37-40) Mgbe ya na Jizọs kwurịtasịrị okwu ọzọ, o doro Paịlet anya na ọ dịghị ihe ọjọọ Jizọs mere. Ya mere, n’ikpeazụ, mgbe ọ kpọpụtara Jizọs n’èzí na nke ikpeazụ ya, Paịlet sịrị: “Lee! Eze unu!” Ma ndị mmadụ tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kpọgide ya n’osisi!”

When Pilate brings Jesus outside, the people shout

Paịlet jụrụ ha, sị: “M̀ ga-akpọgide eze unu n’osisi?” Ndị isi nchụàjà zara, sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ bụghị Siza.” Cheedị echiche! Ndị nchụàjà a nwere obi ọjọọ emewo ka ndị mmadụ jụ Jizọs!—Jọn 19:1-16.

Dị ka ọ dị nnọọ n’oge ahụ, otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ achọghị n’ezie ka Jizọs bụrụ Eze ha. Ha pụrụ ikwu na ha kwere na Chineke, ma ha achọghị ka Chineke ma ọ bụ Kraịst na-agwa ha ihe ha ga-eme. Ha chọrọ ọchịchị nke ha kpọmkwem n’ụwa ebe a.

Olee banyere anyị? Mgbe anyị mụtara banyere Alaeze Chineke na ihe nile dị ebube ọ ga-eme, olee mmetụta nke ahụ na-eme ka anyị nwee n’ebe Chineke nọ?— Anyị na-ahụ ya n’anya, ọ́ bụghị ya?— Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi gosi Chineke na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na anyị chọrọ ka Alaeze ya chịa anyị?—

[Foto dị na peeji nke 236]

Gịnị mere e ji mee Jizọs baptizim, oleekwa otú Chineke si gosi na ọ kwadoro ya?

Anyị pụrụ igosi Chineke mmetụta anyị site n’ịgbaso ihe nlereanya Jizọs. Gịnịkwanụ ka Jizọs mere iji gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya?— Jizọs kọwara, sị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe nile.” (Jọn 8:29) Ee, Jizọs bịara n’ụwa ‘ime uche Chineke’ nakwa ‘ịrụcha ọrụ ya.’ (Ndị Hibru 10:7; Jọn 4:34) Cheedị echiche banyere ihe Jizọs mere tupu ọ malite ọrụ ime nkwusa ya.

Jizọs gakwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim n’Osimiri Jọdan. Mgbe ha banyere n’ime mmiri, Jọn mikpuru Jizọs n’ime mmiri ma kulite ya ọzọ. Ị̀ ma ihe mere Jọn ji mee Jizọs baptizim?—

[Foto ndị dị na peeji nke 237]

N’ebee ka anyị pụrụ ịnọ gwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke?

Ọ bụ Jizọs gwara Jọn ka o mee ya baptizim. Ma olee otú anyị si mara na Chineke chọrọ ka Jizọs mee baptizim?— Anyị maara n’ihi na mgbe Jizọs si n’ime mmiri pụta, ọ nụrụ olu Chineke ka o si n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; anwapụtawo m gị.” Chineke zitere ọbụna mmụọ nsọ ya n’ụdị nduru ka o bekwasị Jizọs. Ya mere, site n’ịbụ onye e mere baptizim, Jizọs gosiri na ya chọrọ iji ndụ ya nile jeere Jehova ozi, ee, ruo mgbe ebighị ebi.—Mak 1:9-11.

Ị ka na-eto eto ugbu a. Ma gịnị ka ị ga-eme mgbe i toro?— Ị̀ ga-eme ka Jizọs, bụrụ onye e mere baptizim?— I kwesịrị iṅomi ya, n’ihi na Bible na-ekwu na ọ hapụụrụ gị ‘ihe nlereanya ka i wee gbasochie nzọụkwụ ya anya.’ (1 Pita 2:21) Mgbe e mere gị baptizim, ị na-egosi na ị chọrọ n’ezie ka Alaeze Chineke chịa gị. Ma ime baptizim ezughị.

Ọ dị anyị mkpa irube isi n’ihe nile Jizọs kụziri. Jizọs sịrị na anyị ekwesịghị ịbụ “akụkụ nke ụwa.” Ọ̀ ga-abụ irubere ya isi ma ọ bụrụ na anyị etinye aka n’ihe nke ụwa? Jizọs na ndịozi ya etinyeghị aka n’ihe ndị dị otú ahụ. (Jọn 17:14) Kama itinye aka na ha, gịnị ka ha mere?— Ha gwara ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Nke ahụ bụ ọrụ dị oké mkpa ná ndụ ha. Ànyị pụrụ imekwa ya?— Ee, anyị gakwa eme ya ma ọ bụrụ na ihe anyị na-ekwu mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa abụghị n’elu ọnụ.

Biko lee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ a, bụ́ ndị na-agwa anyị ihe anyị pụrụ ime iji gosi na anyị chọrọ ka Alaeze Chineke bịa: Matiu 6:24-33; 24:14; 1 Jọn 2:15-17; nakwa 1Jn 5:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya