Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jd isi 6 p. 70-82
  • Ikpe Ikpe Ziri Ezi—Ihe Dị Mkpa n’Ịmara Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpe Ikpe Ziri Ezi—Ihe Dị Mkpa n’Ịmara Chineke
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IME IHE N’IKPE IKPE ZIRI EZI N’ACHỤMNTA EGO NAKWA N’OKWU EGO
  • ‘NDỊ ISI GA-ACHỊ KA E WEE NWEE IKPE ZIRI EZI’
  • Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
    Bịaruo Jehova Nso
  • ‘Na-eme Ihe n’Ikpe Ziri Ezi’ n’Iso Chineke Na-eje Ije
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
jd isi 6 p. 70-82

ISI NKE ISII

Ikpe Ikpe Ziri Ezi—Ihe Dị Mkpa n’Ịmara Chineke

1. Gịnị mere i ji enwe mmasị n’ikpe ziri ezi?

KEMGBE ụwa, e nwere ndị a ma ama n’ihi ịkwalite ikpe ziri ezi. Ma chebara eziokwu a echiche: Ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ikpe ziri ezi n’ihi na e kere mmadụ n’onyinyo Chineke. I nwere mmasị n’ikpe ziri ezi ma na-achọ ka ndị ọzọ na-emeso gị ihe n’ụzọ ziri ezi n’ihi na e kere gị n’onyinyo Jehova, bụ́ onye ikpe ziri ezi ‘na-atọ ụtọ.’—Jeremaya 9:24; Jenesis 1:27; Aịzaya 40:14.

2, 3. Gịnị mere anyị ga-eji tụlee akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere iji mụta ihe banyere ikpe ziri ezi nke Jehova?

2 Ka ị na-agụ akwụkwọ dị iche iche dị na Baịbụl, ị ga-aghọtakwu ikpe ziri ezi nke Chineke. Ma ị ga-erite uru karịsịa n’ịtụle akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere. N’akwụkwọ ndị a, e kwusiri okwu ike banyere ikpe ziri ezi nke na a kpọrọ otu akwụkwọ nke e dere banyere amụma Hosia, Emọs, na Maịka, Justice Now! (Ikpe Ziri Ezi Ugbu A!). Ọ bụ otu òtù nke na-ahụ maka ibipụta Baịbụl bipụtara akwụkwọ a. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche n’arịrịọ a Emọs rịọrọ: “Meenụ ka ikpe ziri ezi na-eru dị ka mmiri, ka ezi omume na-asọkwa mgbe niile dị ka iyi.” Rịbakwa ama ihe mbụ Maịka kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị gị: “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—Emọs 5:24; Maịka 6:8.

3 Ya mere, iji matakwuo Jehova nke ọma wee nwee ike iṅomi ya, ọ dị anyị mkpa ịghọta ikpe ziri ezi ya. Ikpe ziri ezi nke Jehova bụ otu akụkụ nke ụdị onye ọ bụ. N’ihi ya, anyị apụghị ikwu na anyị maara ya, ọ gwụla ma ànyị ghọtara ikpe ziri ezi ya. Ọbụna ndị ohu ya n’oge ochie maara na “Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.”—Abụ Ọma 33:5; 37:28.

Ihe Osise dị na peeji nke 71

Habakọk

4. Nye ihe atụ iji gosi ihe mere akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere pụrụ iji mee ka obi ike i nwere banyere ikpe ziri ezi nke Chineke sikwuo ike.

4 Obere oge tupu Jehova emezuo ihe o kpere n’ikpe n’isi Jeruselem, Habakọk onye amụma jụrụ, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka? . . . Iwu adịkwaghị irè, a dịghị ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ n’ihi na ndị ajọ omume gbara ndị ezi omume gburugburu, ọ bụ ya mere e ji na-agbagọ ikpe ziri ezi.” (Habakọk 1:2, 4) Habakọk, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, maara Jehova site n’Akwụkwọ Nsọ ndị aka ya pụrụ iru nakwa site n’ahụmahụ ndị o nwere. N’ihi ya, o nwere obi ike na Chineke na-akwado ma na-agba ume ka a na-ekpe ikpe ziri ezi. Otú ọ dị, ihe na-echegbu onye amụma ahụ bụ ihe mere Jehova ji kwe ka ajọ omume dịrị. Chineke mesiri Habakọk obi ike na Ya ga-emeso ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe n’ụzọ ziri ezi. (Habakọk 2:4) Ọ bụrụ na Habakọk na ndị ọzọ nwere ụdị obi ike ahụ, e nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ karị mere ị ga-eji nwee obi ike. N’ihi gịnị? Baịbụl zuru ezu ugbu a. Ya mere, ị pụrụ ịgụ n’ụzọ buru ibu karị ihe ndị e dere banyere otú Jehova si meso ndị dị iche iche ihe nakwa otú o si gosipụta ụdị onye ọ bụ, tinyere ikpe ziri ezi ya. N’ihi nke ahụ, ị pụrụ ịmata Jehova nke ọma karị ma kwenyesie ike n’ikpe ziri ezi ya nke zuru okè.

5. Olee ihe anyị ga-atụle ugbu a banyere ime ihe n’ikpe ziri ezi?

5 Mgbe Jehova na-eziga ndị ozi n’Izrel, o kwusiri okwu ike banyere ikpe ikpe ziri ezi. (Aịzaya 1:17; 10:1, 2; Jeremaya 7:5-7; Ezikiel 45:9) O mere nnọọ ka nke a pụta ìhè site n’ọnụ ndị amụma iri na abụọ ahụ. (Emọs 5:7, 12; Maịka 3:9; Zekaraya 8:16, 17) Onye ọ bụla nke gụrụ akwụkwọ ha dere pụrụ ịhụ na ha na-ekwu ka mmadụ na-eme ihe n’ikpe ziri ezi n’ihe ọ bụla ọ na-eme kwa ụbọchị. E nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi tinye ihe ndị anyị mụtara n’akwụkwọ iri na abụọ a n’ọrụ. Ma ka anyị tụlee akụkụ abụọ ndị amụma ahụ kwusiri okwu ike banyere ikpe ziri ezi ma lee otú anyị pụrụ isi tinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ.

IME IHE N’IKPE IKPE ZIRI EZI N’ACHỤMNTA EGO NAKWA N’OKWU EGO

6, 7. Gịnị mere anyị niile kwesịrị iji nwee mmasị n’ihe banyere ime ihe n’ikpe ziri ezi n’achụmnta ego nakwa n’okwu ego?

6 Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ.” (Luk 4:4; Diuterọnọmi 8:3) Ọ sịghị na achịcha adịghị anyị mkpa—anyị ga-eri nri. Nke ahụ pụtara na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ga na-arụ ọrụ ma ọ bụ na otu onye n’ezinụlọ ha ga na-arụ ọrụ iji na-akpata ihe ha ga na-eri. Otú ahụkwa ka ọ dị ndị ohu Chineke n’oge ochie. Ụfọdụ n’ime ha na-arụrụ onwe ha ọrụ—ha na-akọ ugbo ma ọ bụ na-akpa ákwà, na-arụ oche, ma ọ bụ ihe ndị e ji esi nri. Ndị ọzọ na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ—ha na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ ka ha na-ewere ha ihe ubi, ma ọ bụ na-egwepụta ntụ ọka, na-azọchapụta mmanụ oliv, ma ọ bụ mmanya. Ndị ọzọ na-azụ ahịa—ha na-azụ ma na-ere ngwá ahịa. Ụfọdụ nwere ike inwe ihe ha na-arụrụ ndị mmadụ—ikekwe, ịrụzi elu ụlọ ma ọ bụ ịkụ egwú.—Ọpụpụ 35:35; Diuterọnọmi 24:14, 15; 2 Ndị Eze 3:15; 22:6; Matiu 20:1-8; Luk 15:25.

7 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị ma ọ bụ ndị enyi gị na ndị ikwu gị? Ọ bụ eziokwu na otú e si arụ ọrụ taa pụrụ ịdị iche n’otú e si arụ ya n’oge ahụ, ma, í kweghị na otú Chineke si ele ime ihe n’ikpe ziri ezi anya n’okwu ndị dị otú ahụ n’oge ahụ ka bụ otú o si ele ya anya? N’ozi Jehova si n’ọnụ ndị amụma iri na abụọ ahụ zie, o gosiri na ya na-atụ anya ka ndị ya na-eme ihe n’ikpe ziri ezi n’ihe ndị dị otú ahụ. Ka anyị na-atụle ihe atụ ndị na-egosi nke ahụ, chee echiche banyere otú a chọrọ ka i si na-egosi ikpe ziri ezi nke Chineke.—Abụ Ọma 25:4, 5.

8, 9. (a) Gịnị mere na okwu nkatọ ahụ e kwuru na Malakaị 3:5 abụghị obere okwu? (b) Olee echiche kwesịrị ekwesị Akwụkwọ Nsọ na-agba ume ka e nwee banyere iwe mmadụ n’ọrụ na ịrụ ọrụ?

8 Chineke si n’ọnụ Malakaị kwuo, sị: “M ga-abịaru unu nso ikpe unu ikpe, m ga-agba akaebe ọsọ ọsọ megide ndị dibịa afa, megidekwa di ma ọ bụ nwunye nke na-akwa iko, megidekwa ndị na-aṅụ iyi ụgha, megidekwa ndị na-aghọ aghụghọ n’ụgwọ e kwesịrị ịkwụ onye ọrụ, . . . ha adịghị atụ egwu m.” (Malakaị 3:5) Ee, Jehova katọrọ ndị na-emeso ndị na-arụrụ ha ọrụ, ma ọ bụ ndị ha goro ọrụ, ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Olee otú nke ahụ dịruru njọ? Ebe Chineke gụnyere ime mgbaasị, ịkwa iko, na ịgha ụgha, ka ọ gụnyere imegbu ndị ọrụ. Ndị Kraịst maara na Chineke ga-ekpe ‘ndị na-akwa iko na ndị na-eme mgbaasị na ndị ụgha niile’ ikpe.—Mkpughe 21:8.

9 Ihe nọ na-eme n’ebe ọrụ abụghị naanị okwu banyere mmadụ ime ihe ziri ezi; o metụtara ikpe ziri ezi nke Jehova. O kwuru na n’ihi aghụghọ nke ndị “na-aghọ aghụghọ n’ụgwọ e kwesịrị ịkwụ onye ọrụ” na-aghọ, na ya ‘ga-abịaru ha nso ikpe ha ikpe.’ N’eziokwu, Chineke ekwughị na onye were mmadụ n’ọrụ kwesịrị ime ihe ọ bụla onye na-arụrụ ya ọrụ ma ọ bụ ndị na-arụrụ ya ọrụ chọrọ. Site n’ihe atụ Jizọs nyere banyere ndị e goro ịrụ ọrụ n’ubi vaịn, ị ga-ahụ na onye were ndị mmadụ n’ọrụ nwere ikike ikwu ego ole ọ ga-akwụ ha nakwa otú ha ga-esi rụọ ọrụ. (Matiu 20:1-7, 13-15) Ọ dị mma ịmara na n’ihe atụ ahụ Jizọs nyere, a kwụrụ onye ọrụ ọ bụla otu dinariọs, nke bụ́ ‘ụgwọ ọrụ ụbọchị’ ha na onye nwe ọrụ kwekọrịtara, ma hà rụrụ ọrụ ụbọchị dum ma ọ bụ na ha arụghị. Anyị ga-ahụkwa na onye ahụ were ha n’ọrụ aghọgbughị ndị ahụ o goro ọrụ iji nwetakwuo uru.—Jeremaya 22:13.

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebara otú anyị si emeso ndị anyị were n’ọrụ echiche?

10 Ọ bụrụ na i nwere ihe i ji achụ nta ego, nweekwa ndị na-arụrụ gị ọrụ—ma ọ bụkwanụ naanị na i goro mmadụ ka ọ rụọrọ gị ọrụ—ego ole ị na-akwụ ha, ihe ndị ị na-achọ ka ha mee, na otú i si emeso ha n’ihe metụtara ego, ò kwekọrọ n’echiche Jehova nke e kwupụtara na Malakaị 3:5? Ọ dị mma ichebara nke a echiche n’ihi na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kwukwara okwu banyere emesoghị ndị mmadụ goro ọrụ ihe n’ụzọ ziri ezi. Jems onyeozi jụrụ banyere ndị na-emeso ndị ọrụ ha ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, sị: “[Jehova] ọ́ dịghị emegide unu?” (Jems 5:1, 4, 6) Anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ziri ezi, sị: Ndị na-adịghị eme ihe ziri ezi “n’ụgwọ e kwesịrị ịkwụ onye ọrụ” amaghị Jehova n’ezie, n’ihi na ha adịghị eṅomi ikpe ziri ezi ya.

11, 12. (a) Olee omume ọjọọ Hosia 5:10 mere ka ọ pụta ìhè? (b) Olee otú ị pụrụ isi tinye ụkpụrụ dị na Hosia 5:10 n’ọrụ?

11 Ugbu a, gụọ ihe mere Jehova ji megide ụfọdụ ndị a ma ama n’oge Hosia: “Ndị isi Juda adịwo ka ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ. M ga-awụsa ha oké iwe m dị ka mmiri.” (Hosia 5:10) Olee omume ọjọọ Hosia katọrọ? Onye Juda bụ́ onye ọrụ ugbo na-enweta ihe o ji adị ndụ site n’ala ya, a na-ejikwa okwute na osisi kpaa ókè ala ahụ. ‘Iwela ihe e ji kpaa ókè ala azụ’ ga-eme ka ala onye ọrụ ugbo dị obere wee na-anapụ ya ụfọdụ n’ime ihe ọ na-akpata o ji adị ndụ, si otú ahụ na-ezu ya ohi. Hosia ji ndị isi Juda, bụ́ ndị kwesịrị ịhụ na e nwere ikpe ziri ezi, tụnyere ndị na-ewela ihe e ji kpaa ókè ala azụ.—Diuterọnọmi 19:14; 27:17; Job 24:2; Ilu 22:28.

Ihe Osise dị na peeji nke 76

Ị̀ na-eme ihe n’ikpe ziri ezi n’ebe ọrụ gị nakwa n’achụmnta ego gị?

12 Ọ pụrụ ịdị ụfọdụ ndị taa, bụ́ ndị ọrụ ha bụ ire ala na ụlọ, ka ọ̀ bụ ha ‘welaa ókè ala azụ’ iji ghọgbuo ndị ahịa ha. Ma, ihe a e kwuru metụtakwara ndị na-azụ ahịa, ndị were mmadụ n’ọrụ, ndị e were n’ọrụ, ma ọ bụ ndị nwere ihe a na-emere ha—onye ọ bụla ya na ndị ọzọ na-enwe nkwekọrịta achụmnta ego. Ị manụ na ụfọdụ ndị na-achụ nta ego adịghị achọ ka e dee ihe ndị ha kwekọrịtara ede n’ihi na ha na-eche na mgbe oge na-aga, ọ ga-adịrị ha mfe karị ịhapụ imezu ihe niile e kwekọrịtara ma ọ bụkwanụ na ọ ga-adịrị ha mfe karị ikwu ihe ọhụrụ ndị ha ga-achọ ka e mee. Ndị ọzọ na-achọ ka e dee ihe ndị e kwekọrịtara ede, ma ha na-edenye ihe ndị na-edochaghị anya ka ha wee nwee ike ịgbanwe ihe ha pụtara otú ọ ga-adabara ha, ọ bụrụgodị na ọ ga-emetụta onye nke ọzọ n’ụzọ na-ezighị ezi. Ì chere na onye na-eme otú ahụ—ma ọ̀ na-ere ere ma ọ̀ na-azụ azụ, ma ọ̀ bụ onye were mmadụ n’ọrụ ma ọ bụ onye e were n’ọrụ—maara Chineke nke na-ekpe ikpe ziri ezi n’ezie? Jehova kwuru n’ime Okwu ya, sị: “Ewelala ókè ala [nke ụmụ na-enweghị nna] azụ. N’ihi na Onye Mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekpechite ọnụ ha n’okwu gị na ha.”—Ilu 23:10, 11; Habakọk 2:9.

13. Dị ka Maịka 6:10-12 kwuru, olee ụdị ikpe na-ezighị ezi ndị dị n’etiti ndị Chineke n’oge ochie?

13 Maịka 6:10-12 kọkwuuru anyị banyere ikpe ziri ezi, sị: “À ka nwere akụ̀ ajọ omume n’ụlọ onye ajọ omume, ma ọ bụ ntakịrị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa na-adịghị mma? M̀ pụrụ ịdị ọcha ma m nwee ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị mma na akpa nkume e ji atụ̀ ihe bụ́ nke aghụghọ? N’ihi na . . . ndị bi na ya ekwuwokwa okwu ụgha, ire dị ha n’ọnụ na-aghọkwa aghụghọ.” Taa, anyị na-atụ̀ ihe na lita na lita, ọ bụghị n’efa. Ma ọ bụkwanụ, anyị na-atụ̀ ihe na kilo na kilo ma ọ bụ na paụnd na paụnd kama iji nkume na-atụ̀ ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe Maịka kwuru doro anya. Ndị na-azụ ahịa ma ọ bụ ndị oji ego achụ ego nọ n’oge ya na-aghọ aghụghọ; ha na-emeso ndị mmadụ ihe n’ụzọ na-ezighị ezi site n’iji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-erughị eru atụ̀ ihe. Chineke kpọrọ ndị ‘ji ire dị ha n’ọnụ na-aghọ aghụghọ’ n’achụmnta ego ha ‘ndị ajọ omume.’—Diuterọnọmi 25:13-16; Ilu 20:10; Emọs 8:5.

Picture on page 74

14. Ndụmọdụ Maịka pụrụ inyere anyị aka izere ụdị ikpe na-ezighị ezi dị aṅaa nke oge a?

14 Ihe Maịka kwuru banyere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ aghụghọ ò metụtara otú i si achụ nta ego ma ọ bụ ihe ị na-eme dị ka onye e were n’ọrụ? E kwesịrị ichebara ya echiche, ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ụzọ e si aghọgbu ndị ahịa na ndị nwere ihe a na-emere ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọrụ ngo na-adịghị akwụwa aka ọtọ na-awụnyebiga ájá ókè na simenti ha ji arụ ọrụ. Ma ọ bụkwanụ, onye ọrụ aka nwere ike iji ihe ndị na-adịchaghị mma, ndị dị ọnụ ala karịa ndị nke a kwụrụ ya ụgwọ ka ọ zụta, rụọ ebe ndị ọ maara na a dịghị ahụ anya. Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa na-ere ihe meworo ochie n’ọnụ ahịa nke ọhụrụ. Ma eleghị anya, ị nụwokwa banyere aghụghọ ndị ọzọ a na-aghọ n’achụmnta ego iji nwetakwuo uru. Ọ̀ na-adị gị ka ọ̀ bụ gị mee ihe ndị ahụ? Otu akwụkwọ e bipụtara na nso nso a banyere mmadụ igbochi ndị ọzọ iji ihe ya eme ihe na-anataghị ikike kwuru na Ndịàmà Jehova “kwere na Onye kere ha na-ele ha, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha ga-ekwetakwa ịnwụ kama izu ohi.” O kwukwara, sị: “A na-achọ ha achọ n’ụlọ ọrụ dị iche iche ebe ego buru ibu na-abata.” N’ihi gịnị? N’ihi na ezi Ndị Kraịst maara na Jehova ‘chọrọ ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi,’ ma n’achụmnta ego ha ma n’okwu ego.—Maịka 6:8.

‘NDỊ ISI GA-ACHỊ KA E WEE NWEE IKPE ZIRI EZI’

15, 16. Olee otú ndị ndú si na-emeso ndị mmadụ n’oge Maịka?

15 Site n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere, ị pụrụ ịhụ na ọ dị mgbe ụfọdụ a na-enweghị ikpe ziri ezi. Ndị ike dị n’aka, bụ́ ndị kwesịrị ịbụ ezi ihe nlereanya ma a bịa n’ikpe ikpe ziri ezi, abụghị. (Ọpụpụ 18:21; 23:6-8; Diuterọnọmi 1:17; 16:18) Maịka rịọrọ ha, sị: “Biko, nụrụnụ, unu ndị isi Jekọb na unu ndị ọchịagha nke ụlọ Izrel. Ọ́ bụghị unu ka ọ dịịrị ịmara ihe bụ́ ikpe ziri ezi? Unu ndị kpọrọ ihe ọma asị ma hụ ihe ọjọọ n’anya, na-agba ndị mmadụ akpụkpọ, na-adọpụsịkwa uru ahụ́ n’ọkpụkpụ ha.”—Maịka 3:1-3; Aịzaya 1:17.

16 Okwu ndị ahụ kwesịrị ịwụ ndị bi n’ime obodo akpata oyi n’ahụ́. Mgbe ụfọdụ, onye na-azụ atụrụ na-akpacha atụrụ ọ na-elekọta ma na-echebe ajị. (Jenesis 38:12, 13; 1 Samuel 25:4) Ma “ndị ọchịagha nke ụlọ Izrel,” bụ́ ndị kwesịrị “ịmara ihe bụ́ ikpe ziri ezi,” rigburu ndị Chineke na-azụ n’ebe ịta nri ya, dị ka à ga-asị na ha na-agba atụrụ akpụkpọ, na-adọpụsịkwa uru ahụ́ ha ma na-agbaji ọkpụkpụ ha. (Abụ Ọma 95:7) Maịka jizi ihe atụ ọzọ metụtara ndụ ime obodo mee ihe. O kwuru na ndị isi, bụ́ ‘ndị na-ekpe ikpe iji nata ụgwọ ọrụ,’ yiri ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige. (Maịka 7:3, 4) Chegodị echiche isi ebe ahịhịa ogwu jupụtara gafere. Ikekwe, ihe ga-akawasị gị ahụ́, ọ ga-adọkakwa uwe gị. Nke ahụ na-egosi mmetụta ndị ndú nwere n’ahụ́ ndị Chineke. Kama imeso ụmụnna ha ihe n’ikpe ziri ezi, ha dị aghụghọ, ha rụkwara arụ.—Maịka 3:9, 11.

17. Dị ka Zefanaya 3:3 kwuru, olee àgwà ndị ndú ahụ nwere?

17 Zefanaya kwuru ihe yiri ya, sị: “Ndị isi nọ n’ime ya bụ ọdụm na-ebigbọ ebigbọ. Ndị na-ekpe ikpe na ya bụ anụ ọhịa wolf mgbede ndị na-adịghị atafọ ọkpụkpụ ọ bụla ruo ụtụtụ.” (Zefanaya 3:3) Cheedị echiche banyere ndị ndú nke ndị Chineke, bụ́ ndị leghaara ezi omume anya dị ka ọdụm nke na-adọgbu anụ. Ma ọ̀ bụkwanụ, chee banyere ndị ikpe, bụ́ ndị tariri ihe niile dị ka anụ ọhịa wolf afọ na-adịghị eju eju nke na ọ bụ naanị ọkpụkpụ ka a hụrụ mgbe chi bọrọ. Olee otú a ga-esi nwee ikpe ziri ezi n’ụdị ebe ahụ? Ndị ndú, bụ́ ndị ripịara ndị mmadụ kama ilekọta ha, mere ka ikpe ziri ezi laa n’iyi.

Ihe Osise dị na peeji nke 79

Ndị isi e nwere n’oge Maịka na Zefanaya amaghị Jehova

18. Olee otú ndị ikpe n’Izrel kwesịrị isi mesoo ndị Chineke?

18 O doro anya na ndị ndú ahụ ndị nọ ná mba raara onwe ha nye Chineke amaghị onye ọ bụ. A sị na ha maara ya, ha gaara erube isi n’ihe Zekaraya 8:16 kwuru, sị: “Ihe ndị a ka unu ga na-eme: Na-agwanụ ibe unu eziokwu. Na-ekpenụ ikpe n’eziokwu, na-ekpekwanụ ikpe udo n’ọnụ ụzọ ámá unu.” Ndị okenye e nwere n’Izrel na-ezukọta n’ọnụ ụzọ ámá obodo. Ha kwesịrị ileba anya n’okwu ikpe dị iche iche n’ụzọ kwekọrọ n’echiche Chineke, ọ bụghị dabere n’ihe mbụ ha hụrụ ma ọ bụ n’echiche nke ha. (Diuterọnọmi 22:15) Jehova dọkwara ha aka ná ntị ka ha ghara ile mmadụ anya n’ihu, dị ka ile ndị ọgaranya ma ọ bụ ndị a ma ama anya n’ihu. (Levitikọs 19:15; Diuterọnọmi 1:16, 17) Ndị ikpe ga-agbalị idoziri ndị na-ese okwu okwu ha, ‘na-ekpe ikpe udo.’

19, 20. (a) Gịnị mere ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst pụrụ iji mụta ihe dị ukwuu site n’aka ndị amụma iri na abụọ ahụ? (b) Olee otú ndị okenye pụrụ isi gosi na ha maara Jehova nakwa ikpe ziri ezi ya?

19 Pọl onyeozi kwughachiri ụfọdụ n’ime ihe e kwuru na Zekaraya 8:16 mgbe ọ na-edegara Ndị Kraịst akwụkwọ ozi. (Ndị Efesọs 4:15, 25) Ya mere, anyị pụrụ ijide n’aka na ịdọ aka ná ntị na ndụmọdụ ndị amụma iri na abụọ ahụ nyere banyere ikpe ziri ezi dị mkpa n’ọgbakọ taa. Ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, kwesịrị ịbụ ezi ihe nlereanya n’ịmara Jehova nakwa n’iṅomi ya n’ikpe ikpe ziri ezi. Aịzaya 32:1 kọwara n’ụzọ na-adọrọ mmasị na ha bụ “ndị isi ka e wee nwee ikpe ziri ezi.” Olee ihe ndị bara uru anyị pụrụ ịmụta banyere ndị okenye dị otú ahụ site na ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị ndị dị n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere?

20 Ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iburu eziokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ nakwa ihe ndị e kwuru banyere otú Chineke si ele ihe anya n’uche. Ha aghaghị ịhụ na mkpebi ha dabeere n’ihe ndị ahụ kama ịdabere n’echiche nke ha ma ọ bụ n’ihe obi ha gwara ha. Baịbụl na-egosi na a pụrụ inwe okwu ndị tara akpụ, ndị ga-achọ ka e tinyekwuoro ha oge iji mee nkwadebe site n’inyocha Baịbụl nakwa akwụkwọ ndị ndụmọdụ amamihe dị na ha, ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, bipụtara. (Ọpụpụ 18:26; Matiu 24:45) Mgbe ndị okenye tinyere mgbalị dị otú ahụ, o yikarịrị ka hà ga-akpọ ihe ọjọọ asị ma hụ ezi ihe n’anya dị ka Chineke si ele ihe anya. Nke a ga-enyere ha aka ime “ka e nwee ikpe ziri ezi n’ọnụ ụzọ ámá,” ka ha wee ‘na-ekpe ikpe ziri ezi.’—Emọs 5:15; Zekaraya 7:9.

21. N’ihi gịnị ka ndị okenye ga-eji zere ile mmadụ anya n’ihu, ma gịnị pụrụ ime ka ha lee mmadụ anya n’ihu?

21 Ọ bụrụgodị na onye na-ekpe ikpe maara Baịbụl nke ọma, ọ pụrụ ile mmadụ anya n’ihu mgbe ụfọdụ. O wutere Malakaị na ndị nchụàjà, bụ́ ndị e kwesịrị ịdị na-amụta ihe n’aka ha, nọ “na-ele mmadụ anya n’ihu n’ihe metụtara iwu.” (Malakaị 2:7-9) Olee otú nke a si mee? Maịka kwuru na ụfọdụ ndị isi ‘anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị, ndị nchụàjà anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ.’ (Maịka 3:11) Olee otú onye okenye pụrụ isi nwee ụdị echiche ahụ? Ọ bụrụkwanụ na onye ọ na-eleba anya n’okwu ya na-emesapụrụ ya aka tupu mgbe ahụ, ma ọ bụkwanụ na okenye ahụ achọpụta na ya pụrụ irite ihe n’ọdịnihu? Ọ bụrụkwanụ na okwu ahụ metụtara onye ikwu ya ma ọ bụ onye ikwu nwunye ya? Ọ̀ bụ mmekọrịta ezinụlọ ga-ekpebi ihe ọ ga-eme ka ọ̀ bụ ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ? Onye okenye pụrụ ile mmadụ anya n’ihu mgbe ọ na-eleba anya n’okwu metụtara onye mere ihe ọjọọ ma ọ bụ mgbe ọ na-atụle ma onye ọzọ ò ruru eru dị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru inwetakwu ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ.—1 Samuel 2:22-25, 33; Ọrụ 8:18-20; 1 Pita 5:2.

Ihe Osise dị na peeji nke 81

Ndị okenye kwesịrị ‘ime ka e nwee ikpe ziri ezi n’ọnụ ụzọ ámá’ n’ihe ọ bụla ha na-eme

22. (a) Olee ọrụ ndị okenye nwere n’ihe banyere ikpe ikpe ziri ezi? (b) Olee àgwà ndị ọzọ a kọwara n’Okwu Chineke ndị ndị okenye kwesịrị igosipụta mgbe ha na-eleba anya n’okwu metụtara ndị mere ihe ọjọọ?

22 Mgbe mmadụ mere mmehie dị oké njọ, ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ nọ n’ọgbakọ na-eme ihe iji chebe ọgbakọ ka omume dị ize ndụ ghara imerụ ya. (Ọrụ 20:28-30; Taịtọs 3:10, 11) Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ mere ihe ọjọọ enwee nchegharị n’ezie, ndị okenye kwesịrị “iji mmụọ dị nwayọọ gbazie onye ahụ.” (Ndị Galeshia 6:1) Kama ịkpọ obi nkụ, ha na-agbaso ntụziaka bụ́: “Na-ekpenụ ikpe ziri ezi; jirikwanụ obiọma na ọmịiko na-emeso ibe unu ihe.” (Zekaraya 7:9) Iwu dị iche iche Jehova nyere banyere ikpe ikpe n’Izrel oge ochie na-egosi ikpe ziri ezi na obi ebere ya. Ndị ikpe a họpụtara nweere onwe ha ikpebi ihe ha ga-eme n’ọtụtụ mkpebi ndị ha na-eme; ha pụrụ imere mmadụ ebere, dabere n’ọnọdụ e nwere nakwa n’otú onye ahụ mere ihe ọjọọ si mee omume. N’otu aka ahụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta aghaghị ịgbalị ‘ikpe ikpe ziri ezi’ na igosi “obiọma na ọmịiko,” si otú ahụ na-egosi na ha amarawo Jehova.

23, 24. (a) Olee otú ndị okenye pụrụ isi na-ekpe “ikpe udo”? (b) Olee ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ nyeere gị aka ịghọta n’ihe banyere ikpe ziri ezi?

23 Cheta ihe e kwuru na Zekaraya 8:16: “Na-ekpenụ ikpe n’eziokwu, na-ekpekwanụ ikpe udo n’ọnụ ụzọ ámá unu.” N’ihi gịnị? Iji kpee “ikpe udo.” Ọbụna mgbe ndịozi dị ndụ, ụfọdụ Ndị Kraịst na ibe ha nwere nghọtahie ma ọ bụ esemokwu. Dị ka Pọl nyeere Yuodia na Sintiki aka, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị okenye nye aka taa. (Ndị Filipaị 4:2, 3) Ndị okenye kwesịrị ịgbalịsi ike ikpe “ikpe udo,” ịgbalị ịhụ na e doziiri ndị na-ese okwu okwu ha. Ndụmọdụ si n’Akwụkwọ Nsọ ha na-enye na omume ha na-eme mgbe ha na-enye ya kwesịrị ime ka ndị nọ n’ọgbakọ na ibe ha nakwa ha na Chineke dị n’udo. N’ụzọ dị otú a, ọ ga-edo anya na ha maara Jehova n’ezie, marakwa ikpe ziri ezi ya.

24 Akụkụ abụọ a e kwuru n’elu na-egosi na ọ dị oké mkpa ka anyị na-etinye ndụmọdụ ndị amụma iri na abụọ ahụ nyere banyere ikpe ikpe ziri ezi n’ọrụ ná ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị. Lee ihe ngọzi ọ bụ mgbe anyị na ndị gbara anyị gburugburu ‘na-eme ka ikpe ziri ezi na-eru dị ka mmiri’!

GỊNỊ KA Ị MỤTARA?

  • N’ihe banyere ikpe ziri ezi, olee ihe nlereanya anyị kwesịrị iṅomi?—Abụ Ọma 37:28; Hosia 2:19, 20.

  • N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji mụta ikpe ziri ezi, na-emekwa ihe n’ikpe ziri ezi?—Emọs 5:6, 7; Zefanaya 2:3.

  • Olee otú ị pụrụ isi na-eme ihe n’ikpe ziri ezi n’achụmnta ego ma ọ bụ n’okwu ego gị?—Hosia 5:10; 12:6, 7; Emọs 8:5; Maịka 2:1, 2; Malakaị 3:5.

OLEE OTÚ A GA-ESI TINYE YA N’ỌRỤ TAA?

  • Gịnị mere ndị okenye bụ́ Ndị Kraịst ji kwesị ịgbaso ikpe ziri ezi?—Maịka 3:9.

  • Olee ntụziaka Zekaraya 8:16 nyere ndị okenye na ndị ọzọ?

  • Olee ụzọ dị iche iche anyị kwesịrị izere, bụ́ ndị a pụrụ isi lee mmadụ anya n’ihu, n’ihi gịnịkwa?—Malakaị 2:7-9; 1 Timoti 5:21, 22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya