ISI NKE ITOOLU
“Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”
Gịnị ka onye ọrụ ubi pụrụ ime ma ọ bụrụ na mkpụrụ ya dị ukwuu nke na naanị ya apụghị ịghọcha ya?
1-3. (a) Gịnị ka onye ọrụ ubi na-eme mgbe mkpụrụ ya dị ukwuu nke na naanị ya apụghị ịghọcha ya? (b) Olee ihe ịma aka nke chere Jizọs ihu n’oge opupu ihe ubi n’afọ 33 O.A., oleekwa otú o si merie ya?
CHEE echiche banyere oké ihe ịma aka nke chere otu onye ọrụ ubi ihu. N’ọnwa ole na ole gara aga, ọ kọrọ ubi ya, kụọ mkpụrụ. O leruru anya ala wee hụ mgbe ha puru ome. Obi tọkwara ya ụtọ mgbe ihe ọ kụrụ toro. Ugbu a, ọ hụla uru ọ ga-erite n’ọrụ dum ọ rụsiri ike, n’ihi na oge ịghọrọ mkpụrụ eruola. Ma nsogbu o nwere bụ: Mkpụrụ ahụ dị ukwuu nke na naanị ya apụghị ịghọcha ya. Iji merie ihe ịma aka a, o ji amamihe kpebie igo ụfọdụ ndị ọrụ wee ziga ha n’ubi ya. N’eziokwu, oge o nwere ịghọ mkpụrụ niile ahụ dị oké ọnụ ahịa dị ntakịrị.
2 N’oge opupu ihe ubi n’afọ 33 O.A., ihe ịma aka yiri nke a chere Jizọs ihu mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. N’oge ọ na-eje ozi n’ụwa, ọ kụrụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ. Ugbu a, e nweela ihe ubi a ga-ewe, mkpụrụ a ga-aghọ dịkwa ukwuu. E kwesịrị ịchịkọta ọtụtụ ndị nabatara ozi ahụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ. (Jọn 4:35-38) Olee otú Jizọs si merie ihe ịma aka a? Mgbe ọ nọ n’otu ugwu nke dị na Galili, n’oge na-adịghị anya tupu ya arịgoo eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ka ha gaa chọkwuo ndị ọrụ, sị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim . . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.
3 Ọ bụ ọrụ ahụ bụ kpọmkwem isi ihe ịbụ ezi onye na-eso ụzọ Kraịst pụtara. Ya mere, ka anyị tụlee ajụjụ atọ. Gịnị mere Jizọs ji nye iwu ka a chọkwuo ndị ọrụ? Olee otú o si zụọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa chọọ ha? Olee otú ọrụ a si gbasa anyị?
Ihe Mere E Ji Chọkwuo Ndị Ọrụ
4, 5. Gịnị mere na Jizọs agaghị arụcha ọrụ ahụ ọ malitere, olee ndị ga na-arụ ọrụ ahụ mgbe ọ laghachisịrị n’eluigwe?
4 Mgbe Jizọs malitere ozi ya n’afọ 29 O.A., ọ maara na ihe ahụ ọ na-amalite bụ ọrụ naanị ya na-agaghị arụcha. N’ime ntakịrị oge fọọrọ ya n’ụwa, ebe ọ ga-eziru ozi Alaeze ahụ na mmadụ ole ọ ga-ezi ya ga-adị ntakịrị. N’eziokwu, ndị o lekwasịrị anya mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma bụ naanị ndị Juu na ndị ha tọghatara atọghata, ya bụ, “atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.” (Matiu 15:24) Otú ọ dị, ‘atụrụ ndị ahụ furu efu’ bi n’ebe dị iche iche n’ala Izrel dum, nke bụ́ ala ogologo ya na obosara ya dị ọtụtụ puku kilomita. Ihe ọzọ bụ na a ga-emecha ziri ozi ọma ahụ ruo n’ebe ndị ọzọ fọrọ afọ n’ụwa dum.—Matiu 13:38; 24:14.
5 Jizọs ghọtara na a ka ga-arụ ọrụ dị ukwuu mgbe ọnwụ ya gasịrị. Ọ gwara ndịozi iri na otu ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, onye ahụ ga-arụkwa ọrụ m na-arụ; ọ ga-arụkwa ọrụ karịrị ọrụ ndị a, n’ihi na m na-alakwuru Nna m.” (Jọn 14:12) Ebe ọ bụ na Ọkpara ahụ na-alaghachi n’eluigwe, ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ ọrụ nkwusa ahụ na ọrụ izi ihe ahụ, ọ bụghị naanị ndịozi ya, kamakwa, ndị niile ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya n’ọdịnihu. (Jọn 17:20) Jizọs ji ịdị umeala n’obi kwuo na ọrụ ha ga-arụ ‘ga-aka’ nke ọ rụrụ. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu? Ka anyị tụlee ụzọ atọ.
6, 7. (a) Olee ụzọ dị iche iche ọrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi karịa nke ọ rụrụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na obi ike ahụ Jizọs nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ kwesịrị ekwesị?
6 Nke mbụ, ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-eziru ozi ọma ga-aka ebe o ziri. Taa, ọrụ ịgba àmà ahụ eruola n’ebe niile ụwa sọtụrụ, n’ebe gafere nnọọ ala dum Jizọs kwusara ozi ọma. Nke abụọ, ndị ha ga-ekwusara ozi ọma ga-aka ndị o kwusaara. Ndị na-eso ụzọ ole na ole ahụ Jizọs hapụrụ mụbara ngwa ngwa wee ghọọ ọtụtụ puku mmadụ. (Ọrụ 2:41; 4:4) Ugbu a, ha dị ọtụtụ nde mmadụ, a na-emekwa ọtụtụ narị puku ndị ọhụrụ baptizim kwa afọ. Nke atọ, oge ha ga-eziru ozi ọma ga-aka oge o ziri ozi ọma. Ha ga-ezi ya rute kpọmkwem n’oge anyị a, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ kemgbe Jizọs jesịrị ozi ya afọ atọ na ọkara.
7 Mgbe Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ‘ga-arụ ọrụ karịrị ọrụ ndị a,’ ọ na-egosi obi ike o nwere n’ebe ha nọ. Ọ nọ na-enyefe ha ọrụ nke dị oké mkpa, ya bụ, ikwusa “ozi ọma alaeze Chineke” na ịkụzi ya. (Luk 4:43) O kwenyesiri ike na ha ga-eji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ ahụ. Gịnị ka nke a pụtaara anyị taa? Mgbe anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na obi anyị dum na-eje ozi ahụ, anyị na-egosi na obi ike ahụ Jizọs nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ kwesịrị ekwesị. Nke a ọ́ bụghị ihe ùgwù pụrụ iche?—Luk 13:24.
O Nyere Ha Ọzụzụ Ịgba Àmà
Ịhụnanya na-akpali anyị ikwusa ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị pụrụ ịhụ ndị mmadụ
8, 9. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’ozi ya, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya n’ozi anyị?
8 Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ kasị mma maka ozi ahụ. Nke ka nke, o setịpụụrụ ha ihe nlereanya zuru okè. (Luk 6:40) N’Isi nke Asatọ, anyị tụlere otú o si lee ozi ya anya. Chetụgodị echiche banyere ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị so ya na-aga ebe dị iche iche ikwusa ozi ọma. Ha hụrụ na o kwusara ozi ọma n’ebe ọ bụla ndị mmadụ na-anọ—n’akụkụ ọdọ mmiri, n’akụkụ ugwu, n’obodo, n’ọma ahịa, nakwa n’ụlọ ndị mmadụ. (Matiu 5:1, 2; Luk 5:1-3; 8:1; 19:5, 6) Ha hụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike. Ọ na-ebili n’isi ụtụtụ, rụgide ọrụ ruo n’abalị. Ozi ahụ abụrụghị ya ọrụ o ji egbu oge! (Luk 21:37, 38; Jọn 5:17) O doro anya na ha ghọtara na ihe kpaliri ya ije ozi bụ ịhụnanya dị ukwuu o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ. Ma eleghị anya, ha hụrụ na ihu ya na-egosi obi ọmịiko o nwere. (Mak 6:34) Gịnị ka i chere ihe nlereanya Jizọs kpaliri ndị na-eso ụzọ ya ime? Gịnị ka ọ gaara akpali gị ime?
9 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị na-eṅomi ihe nlereanya ya n’ozi anyị. N’ihi ya, n’ihe banyere “ịgba àmà nke ọma,” anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime. (Ọrụ 10:42) Dị ka Jizọs, anyị na-achọ ndị mmadụ aga n’ụlọ ha. (Ọrụ 5:42) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, anyị na-ahazigharị ihe anyị na-eme ka anyị wee nwee ike ịkpọtụrụ ndị mmadụ mgbe o yikarịrị ka hà ga-anọ n’ụlọ. Anyị na-achọ ndị mmadụ aga n’ebe ọha na eze na-anọkarị—n’okporo ámá, n’ebe a na-anọ atụrụ ndụ, n’ụlọ ahịa, nakwa n’ebe ọrụ—jirikwa akọ kwusaara ha ozi ọma. Anyị “na-arụsi ọrụ ike, na-adọgbukwa onwe anyị n’ọrụ” n’ozi anyị, n’ihi na anyị ji ọrụ a kpọrọ ihe. (1 Timoti 4:10) Ịhụnanya dị ukwuu nke anyị ji obi anyị hụ ndị ọzọ na-akpali anyị ịnọgide na-achọ ohere dị iche iche anyị ga-eji kwusaa ozi ọma n’ebe ọ bụla na mgbe ọ bụla a pụrụ inweta ndị mmadụ.—1 Ndị Tesalonaịka 2:8.
‘Mmadụ iri asaa ahụ ji ọṅụ lọta’
10-12. Olee ihe ndị dị mkpa Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya tupu ya ezipụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma?
10 Ụzọ ọzọ Jizọs si zụọ ndị na-eso ụzọ ya bụ site n’inye ha ntụziaka niile dị ha mkpa. Tupu Jizọs ezipụ ndịozi iri na abụọ ya, mesịakwa zipụ mmadụ iri asaa na-eso ụzọ ya, ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ya na ha nọkọrọ, o wee nye ha ọzụzụ. (Matiu 10:1-15; Luk 10:1-12) Ọzụzụ ahụ rụpụtara ihe ọma, n’ihi na Luk 10:17 kọrọ, sị: ‘Mmadụ iri asaa ahụ ji ọṅụ lọta.’ Ka anyị tụlee abụọ n’ime ihe dị mkpa Jizọs kụziri. Ka anyị buru n’obi na anyị kwesịrị ịghọta okwu ya dị ka omenala ndị Juu n’oge ochie si dị.
11 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha tụkwasị Jehova obi. Ọ sịrị ha: “Unu ewerela ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ ọla kọpa unu ga-etinye n’obere akpa ego unu na-eke n’úkwù, unu ewerela obere akpa nri maka njem unu, unu achịrịla uwe ime abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, unu ewerekwala mkpara; n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ka e nye ya nri.” (Matiu 10:9, 10) Ihe ndị njem na-emekarị bụ iwere obere akpa ego a na-eke n’úkwù, obere akpa a ga-etinye nri, na akpụkpọ ụkwụ ọzọ.a Site n’ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ichegbu onwe ha banyere ihe ndị ahụ, ihe Jizọs na-agwa ha n’ezie bụ: “Tụkwasịnụ Jehova obi kpamkpam, n’ihi na ọ ga-egboro unu mkpa unu niile.” Jehova ga-egboro ha mkpa ha site n’ịkpali ndị nabatara ozi ọma ahụ ka ha lee ha ọbịa, nke bụ́ omenala ndị Izrel.—Luk 22:35.
12 Jizọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha zere ihe ndọpụ uche na-enweghị isi. Ọ sịrị: “Unu amakụkwala onye ọ bụla mgbe unu na-ekele ya n’okporo ụzọ.” (Luk 10:4) Jizọs ọ̀ na-agwa ha ka ha na-agbarụ ihu ma ọ bụ ka ha ghara igosi mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’oge ahụ, ikele ekele abụghị naanị ịsị mmadụ ndeewo. Otú ha si ekele mmadụ gụnyere ịgbaso ụkpụrụ dị iche iche na inwe mkparịta ụka na-adịghị ebi ebi. Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru, sị: “Otú ndị Ọwụwa Anyanwụ si ekele mmadụ abụghị otú anyị si ekele mmadụ, ya bụ, ihulatatụ isi, ma ọ bụ ikwe mmadụ n’aka, kama, ha na-ekele mmadụ site n’ịmakụ ya ọtụtụ ugboro, kpọọrọ ya isiala, ọbụnakwa daara ya n’ala. Ihe a niile na-eri oge dị ukwuu.” Site n’ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ikele ndị mmadụ ụdị ekele ahụ, ihe Jizọs na-ekwu n’ezie bụ: “Jirinụ oge unu mee ihe bara uru karịsịa, n’ihi na ozi unu na-ezisa bụ ozi e kwesịrị izi dị ngwa ngwa.”b
13. Olee ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi gosi na anyị bu ntụziaka ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ n’obi?
13 Anyị ga-eburu ntụziaka ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ n’obi. Mgbe anyị na-eje ozi anyị, anyị na-atụkwasị Jehova obi kpamkpam. (Ilu 3:5, 6) Anyị maara na ọ dịghị mgbe ihe dị anyị mkpa ná ndụ ga-akọ anyị ma ọ bụrụ na anyị ‘eburu ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’ (Matiu 6:33) N’ụwa niile, ndị nkwusa oge niile bụ́ ndị na-ekwusa Alaeze Chineke pụrụ ịgba akaebe na ọbụna n’oge ihe isi ike, ọ dịghị mgbe aka Jehova na-adị mkpụmkpụ. (Abụ Ọma 37:25) Anyị na-aghọtakwa na anyị kwesịrị izere ihe na-adọpụ uche. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ọ pụrụ ịdị mfe ka usoro ihe a dọpụ uche anyị. (Luk 21:34-36) Ma, ugbu a abụghị mgbe e kwesịrị ịdọpụ uche anyị. Ebe ọ bụ na ndụ ndị mmadụ dị n’ihe ize ndụ, ozi anyị bụ ozi e kwesịrị izi dị ngwa ngwa. (Ndị Rom 10:13-15) Iburu n’obi mgbe niile na oge agwụwala ga-eme ka anyị ghara ikwe ka ihe ndọpụ uche ndị dị n’ụwa rikpọọ oge anyị na ike anyị nke anyị gaara eji jee ozi anyị. Cheta, oge fọdụrụ dị ntakịrị, ma ihe ubi hiri nne.—Matiu 9:37, 38.
Ọrụ nke Gbasara Anyị
14. Gịnị gosiri na ọrụ ahụ e dere na Matiu 28:18-20 dịịrị ndị niile na-eso ụzọ Kraịst? (Leekwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
14 Mgbe a kpọlitesịrị Jizọs n’ọnwụ, ọ sịrị, “Gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ.” Ọ bụ ọrụ dị ukwuu ka o nyere ndị na-eso ụzọ ya. Ndị o bu n’obi kwuo okwu ahụ abụghị naanị ndị na-eso ụzọ ya ndị ha na ya nọ mgbe ahụ n’ugwu Galili n’oge opupu ihe ubi ahụ.c Ọrụ ahụ o nyere ha gụnyere ikwusara “ndị mba niile” ozi ọma. A ga na-arụkwa ya ruo “ọgwụgwụ usoro ihe a.” O doro anya na ọrụ a dịịrị ndị niile bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ma anyị ndị nọ taa. Ka anyị lebakwuo anya n’okwu ahụ Jizọs kwuru nke e dere na Matiu 28:18-20.
15. Gịnị mere anyị ji kwesị irube isi n’iwu ahụ Jizọs nyere ka anyị mee ndị na-eso ụzọ?
15 Tupu Jizọs enye ọrụ ahụ, ọ sịrị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Amaokwu nke iri na asatọ) Jizọs ò nwere ikike dị ukwuu otú ahụ n’ezie? Ee, o nwere! Ọ bụ ya bụ onyeisi ndị mmụọ ozi, onye na-achị puku kwuru puku ndị mmụọ ozi. (1 Ndị Tesalonaịka 4:16; Mkpughe 12:7) Ebe ọ bụ “isi nke ọgbakọ ahụ,” ndị na-eso ụzọ ya n’ụwa nọ n’okpuru ya. (Ndị Efesọs 5:23) Kemgbe 1914, ọ bụ Eze Mesaya nke na-achị achị n’eluigwe. (Mkpughe 11:15) Ikike ya ruru ọbụna n’ili, n’ihi na o nwere ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:26-28) Site n’ibu ụzọ kwuo ikike dị ukwuu e nyere ya, Jizọs gosiri na ihe ọ na-aga ikwu abụghị ịtụ aro, kama ọ bụ inye iwu. Anyị kwesịrị irubere ya isi, n’ihi na ọ zọtaghị ikike ya azọta kama ọ bụ Chineke nyere ya ikike ahụ.—1 Ndị Kọrịnt 15:27.
16. Site n’ịgwa anyị ka anyị ‘gaa,’ gịnị ka Jizọs na-enye anyị iwu ka anyị mee, oleekwa otú anyị ga-esi mee nke a?
16 Jizọs kwuziri ọrụ ahụ a ga-arụ. Ọ bụ otu okwu ka o ji malite ya, ya bụ, “Gaanụ.” (Amaokwu nke iri na itoolu) O si otú ahụ nye anyị iwu ka anyị gaa zie ndị ọzọ ozi Alaeze Chineke. E nwere ụzọ dị iche iche anyị pụrụ isi mee nke a. Ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ụzọ kasị irè anyị pụrụ isi gwa ndị mmadụ okwu n’onwe anyị. (Ọrụ 20:20) Anyị na-achọkwa ohere ndị anyị ga-eji gbaa àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi; anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi amalite nkwurịta okwu banyere ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị kwesịrị ime otú ahụ mgbe anyị na-arụ ọrụ dịịrị anyị kwa ụbọchị. Ụzọ ndị anyị na-esi ekwusa ozi ọma pụrụ ịdị iche iche, dị ka mkpa na ọnọdụ ndị e nwere n’ókèala anyị si dị. Ma, otu ihe nke na-adịghị agbanwe agbanwe bụ: Anyị ‘na-aga,’ na-achọ ndị kwesịrị ekwesị.—Matiu 10:11.
17. Olee otú anyị ga-esi ‘mee ndị na-eso ụzọ’?
17 Ihe ọzọ Jizọs mere bụ ịkọwa ihe mere a ga-eji rụọ ọrụ ahụ, ya bụ, ‘ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Amaokwu nke iri na itoolu) Olee otú anyị ga-esi ‘mee ndị na-eso ụzọ’? Isi ihe onye na-eso ụzọ pụtara bụ onye na-amụ ihe, onye a na-akụziri ihe. Otú ọ dị, ime ndị na-eso ụzọ abụghị naanị ịkụziri ndị ọzọ ihe. Mgbe anyị na-amụrụ ndị nwere mmasị Baịbụl, ihe anyị na-agbalị ime bụ inyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe ọ bụla o kwere omume, anyị na-eme ka ihe nlereanya Jizọs pụta ìhè, ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl wee lekwasị anya na ọ bụ ya bụ Onye Ozizi ha na Onye Nlereanya ha, na-ebi ndụ otú o si bie ndụ, na-arụkwa ọrụ ahụ ọ rụrụ.—Jọn 13:15.
18. Gịnị mere baptizim ji bụrụ ihe mgbaru ọsọ kasị mkpa ná ndụ onye na-eso ụzọ?
18 E kwuru banyere otu n’ime akụkụ dị mkpa nke ọrụ ahụ, sị: “Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Amaokwu nke iri na itoolu) Baptizim bụ ihe mgbaru ọsọ kasị mkpa ná ndụ onye na-eso ụzọ, n’ihi na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị nke na-egosi na onye ahụ ewerela obi ya dum rara ndụ ya nye Chineke. N’ihi ya, baptizim dị mkpa iji nweta nzọpụta. (1 Pita 3:21) Ee, site n’iji ike ya niile na-ejere Jehova ozi, onye na-eso ụzọ nke e mere baptizim pụrụ ịtụ anya inweta ngọzi na-agaghị agwụ agwụ n’ime ụwa ọhụrụ nke na-abịa abịa. Ọ̀ dịla onye i nyeere aka ịghọ onye na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim? N’ozi Ndị Kraịst, ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka mmadụ nwee ọṅụ karịrị nke a.—3 Jọn 4.
19. Gịnị ka anyị na-ezi ndị ọhụrụ, gịnịkwa mere a pụrụ iji na-ezi ha ihe mgbe e mesịrị ha baptizim?
19 Jizọs kọwara ihe ọzọ a ga-arụ n’ọrụ ahụ, sị: “Na-ezi ha ka debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Amaokwu nke iri abụọ) Anyị na-ezi ndị ọhụrụ ka ha rube isi n’iwu Jizọs, nke gụnyere iwu ịhụ Chineke n’anya, ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya, na ịbụ ndị na-eme ndị na-eso ụzọ. (Matiu 22:37-39) Anyị na-eji nke nta nke nta ezi ha otú ha ga-esi na-akọwa eziokwu Baịbụl, na-agbachitekwara okwukwe ha nke ha ka na-amụta amụta. Mgbe ha toruru iso na-ekwusa ozi ọma n’ihu ọha, anyị na ha na-eso, anyị esite n’okwu ọnụ nakwa n’omume na-ezi ha otú ha ga-esi soro na-arụpụta ihe n’ọrụ a. Izi ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ihe adịghị akwụsị mgbe e mere ha baptizim. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka e nyekwuo ndị e mere baptizim ọhụrụ ntụziaka nke ga-enyere ha aka imeri ihe ịma aka ndị a na-enweta n’iso Kraịst.—Luk 9:23, 24.
“M Nọnyeere Unu Ụbọchị Niile”
20, 21. (a) Mgbe anyị na-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị, gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ egwu? (b) Gịnị mere anyị ekwesịghị iselata aka ugbu a, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
20 Ihe ikpeazụ Jizọs kwuru n’ọrụ ahụ o nyere na-eme ka obi sie anyị ike nke ukwuu, ya bụ: “Lee! M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Matiu 28:20) Jizọs ghọtara na ọrụ a bụ ọrụ dị mkpa. Ọ makwaara na ịrụ ya ga-akpasu ndị mmegide iwe mgbe ụfọdụ. (Luk 21:12) Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịtụ egwu. Onye Ndú anyị anaghị atụ anya ka anyị rụọ ọrụ a n’enwetaghị enyemaka, ma ọ bụ rụọ ya naanị anyị. Ọ́ bụghị ihe na-akasi obi ịmara na Onye ahụ nke nwere “ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa” nọnyeere anyị ịkwado anyị n’ịrụ ọrụ a?
21 Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ya ga-anọnyere ha n’ozi ha n’ime ọtụtụ narị afọ ruo “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Anyị aghaghị ịnọgide na-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị ruo mgbe ọgwụgwụ ahụ bịara. Ugbu a abụghị mgbe anyị kwesịrị iselata aka. A na-ewe ihe ubi dị ukwuu ugbu a n’ụzọ ime mmụọ! A na-achịkọta ọtụtụ ndị na-anabata ozi ahụ. Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ka anyị kpebisie ike ịrụ ọrụ ahụ dị mkpa e nyere anyị. Ka anyị kpebisiekwa ike iji oge anyị, ike anyị, na akụ̀ anyị na-edebe iwu ahụ Kraịst nyere, sị: “Gaanụ mee . . . ndị na-eso ụzọ.”
a Ma eleghị anya, obere akpa a na-eke n’úkwù bụ otu n’ime ájị̀ nke nwere ebe a na-etinye ego. Obere akpa nri bụ akpa ka nke ahụ, nke a na-ejikarị akpụkpọ anụ eme. A na-anyara ya anyara. A na-ejikwa ya etinye nri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị mkpa.
b Ọ dị mgbe Ịlaịsha onye amụma nyere ụdị ntụziaka ahụ. Mgbe Ịlaịsha na-edunye onye na-ejere ya ozi bụ́ Gehezaị ka ọ gaa n’ụlọ otu nwaanyị nke nwa ya nwoke nwụrụ, ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na i zute onye ọ bụla, ekelela ya.” (2 Ndị Eze 4:29) Ozi ahụ bụ ozi e kwesịrị izi dị ngwa ngwa. N’ihi ya, ọ baghị uru igbuwe oge na-enweghị isi.
c Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ na Galili, ọ pụrụ ịbụ n’oge ahụ a kọwara na Matiu 28:16-20 ka Jizọs pụtara n’ihu “ihe karịrị narị ụmụnna ise” mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị. (1 Ndị Kọrịnt 15:6) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ narị mmadụ nọ mgbe Jizọs nyere ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.