Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 12 p. 118-127
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ na O Jighị Ihe Atụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ na O Jighị Ihe Atụ”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Jizọs Ji Jiri Ihe Atụ Zie Ihe
  • Iji Otu Ihe Dị Mfe Nghọta Tụnyere Ihe Ọzọ
  • Iji Ihe Ndị Na-eme Eme ná Ndụ Kwa Ụbọchị Na-eme Ihe Atụ
  • Iji Ihe E Kere Eke Na-eme Ihe Atụ
  • Iji Ihe Ndị Mmadụ Ma Ama Na-eme Ihe Atụ
  • “Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ Na O Jighị Ihe Atụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jiri Ihe Atụ Na-akụzi Ihe
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Ṅomie Onye Ozizi Ahụ Bụ́ Ọkà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ihe Atụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 12 p. 118-127

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

“Ọ Dịghị Agwa Ha Okwu Ma Ọ Bụrụ na O Jighị Ihe Atụ”

1-3. (a) Olee ihe ùgwù pụrụ iche ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị ya na ha so na-aga njem, nwere, oleekwa otú o si mee ka ọ dịrị ha mfe karị icheta ihe ọ na-ezi ha? (b) Gịnị mere o ji dị mfe icheta ihe atụ ndị dị irè?

NDỊ na-eso ụzọ Jizọs, ndị ya na ha so na-aga njem, nwere ihe ùgwù pụrụ iche. Ha na-amụta ihe kpọmkwem n’ọnụ Onye Ozizi Ukwu ahụ. Ha na-anụ olu ya ka ọ na-akọwara ha Okwu Chineke, na-akụzikwara ha eziokwu ndị na-akpali akpali. Ka ọ dị ugbu a, ha aghaghị iburu ihe ọma ndị a ọ na-ekwu n’uche ha nakwa n’obi ha; oge a ga-ede okwu ya ede erubeghị.a Otú ọ dị, Jizọs mere ka ọ dịrị ha mfe karị icheta ihe ọ na-akụziri ha. Olee otú o si mee nke a? Ọ bụ site n’otú o si zie ihe, karịsịa, nkà o nwere n’ime ihe atụ.

2 N’ezie, a dịghị echefu ihe atụ ndị dị irè ọsọ ọsọ. Otu onye nke dere akwụkwọ kwuru na “ihe atụ na-eme ka ihe a na-anụ ná ntị yie ka ọ̀ bụ anya ka e ji na-ahụ ya.” Ọ “na-emekwa ka o kwe ndị na-ege ntị omume iji anya nke uche ha na-ahụ ihe ha na-anụ.” Ebe ọ bụ na anyị na-aghọta ihe karịsịa ma ọ bụrụ na anyị ji anya nke uche anyị na-ahụ ya, ihe atụ pụrụ ime ka ọ dịrị anyị mfe karị ịghọta ọbụna ihe siri ike nghọta. Ihe atụ pụrụ ime ka a ghọta okwu e kwuru. Ọ na-akụziri anyị ihe anyị na-agaghị echefu echefu.

3 Ọ dịghị onye nkụzi ọ bụla nọ n’ụwa nke bụ́ aka ochie n’ime ihe atụ karịa Jizọs Kraịst. Ruo taa, a na-echeta ihe atụ ya ngwa ngwa. Gịnị mere Jizọs ji emekarị ihe atụ mgbe ọ na-ezi ihe? Gịnị mere ihe atụ ya ji dị nnọọ irè? Olee otú anyị pụrụ isi mụta iji ihe atụ ezi ihe?

Ihe Mere Jizọs Ji Jiri Ihe Atụ Zie Ihe

4, 5. Gịnị mere Jizọs ji jiri ihe atụ zie ihe?

4 Baịbụl kwuru ihe abụọ dị mkpa mere Jizọs ji jiri ihe atụ zie ihe. Nke mbụ bụ na o si otú ahụ mezuo amụma. Matiu 13:34, 35 sịrị: “Ihe ndị a niile ka Jizọs ji ihe atụ dị iche iche gwa ìgwè mmadụ ahụ. N’ezie, ọ dịghị agwa ha okwu ma ọ bụrụ na o jighị ihe atụ; ka e wee mezuo ihe e kwuru site n’ọnụ onye amụma, bụ́ onye sịrị: ‘M ga-emeghe ọnụ m jiri ihe atụ kwuo okwu.’” Onye amụma ahụ Matiu kwuru banyere ya bụ onye dere Abụ Ọma 78:2. Onye ọbụ abụ ahụ si n’ike mmụọ nsọ nke Chineke dee ihe a ọtụtụ narị afọ tupu a mụọ Jizọs. Tụlee ihe nke a pụtara. Ọtụtụ narị afọ tupu Mesaya ahụ abịa, Jehova kpebiri na ọ ga-eji ihe atụ zie ihe. Ya mere, anyị pụrụ ijide n’aka na iji ihe atụ ezi ihe dị Jehova mma.

5 Nke abụọ, Jizọs kọwara na ya na-eme ihe atụ ka e wee mata ndị obi ha ‘na-adịkwaghị anabata ihe.’ (Matiu 13:10-15; Aịzaya 6:9, 10) Gịnị mere ihe atụ ya ji kpughee ihe ndị mmadụ bu n’obi? Mgbe ụfọdụ, ọ na-achọ ka ndị nụrụ ihe atụ ya rịọ ya ka ọ kọwaa ihe o kwuru, ka ha wee ghọtachaa ihe okwu ya pụtara. Ndị dị umeala n’obi na-adị njikere ịrịọ ka ọ kọwaara ha ihe o kwuru. Ma, ndị mpako ma ọ bụ ndị na-achọghị ịma adịghị arịọ. (Matiu 13:36; Mak 4:34) Ya mere, ihe atụ ndị Jizọs mere kpugheere ndị eziokwu na-agụsi agụụ ike eziokwu ahụ. N’otu mgbe ahụ, ihe atụ ya zochiiri ndị obi ha dị mpako eziokwu ahụ.

6. Olee uru ihe atụ ndị Jizọs mere bara?

6 Ihe atụ ndị Jizọs mere bara uru n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. Ha kpaliri mmasị ndị mmadụ, mee ka ha gee ntị. Ha mere ka ndị mmadụ jiri anya nke uche ha na-ahụ ihe ọ na-agwa ha, o wee dịrị ha mfe ịghọta ya. Dị ka e kwuru ná mmalite, ihe atụ ndị Jizọs mere nyeere ndị gere okwu ya aka icheta ihe o kwuru. Ozizi Elu Ugwu ahụ e dere na Matiu 5:3-7:27 bụ otu ihe atụ pụrụ iche nke na-egosi na Jizọs mere ihe atụ ọtụtụ ugboro. Dị ka e si gụkọọ ya otu mgbe, e nwere ihe karịrị nkà okwu iri ise n’ozizi a. Iji ghọta ihe nke a pụtara, buru n’obi na a pụrụ ịgụpụtacha ozizi a n’ihe dị ka minit iri abụọ. Ọ bụrụ na a gụọ ya otú a, ná nkezi, a ga-agụpụta otu nkà okwu n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa sekọnd iri abụọ ọ bụla! O doro anya na Jizọs hụrụ na ọ bara uru ime ihe atụ!

7. Gịnị mere anyị ga-eji ṅomie otú Jizọs si jiri ihe atụ zie ihe?

7 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị kwesịrị iṅomi otú o si zie ihe, tinyere otú o si mee ihe atụ. Dị ka nnu na ose si eme ka nri tọkwuo ụtọ, ihe atụ ndị dị irè pụrụ ime ka ihe anyị na-ezi tọkwuo ndị ọzọ ụtọ. Ihe atụ ndị e chebaara echiche nke ọma pụrụ ime ka ọ dịkwuo mfe ịghọta eziokwu ndị dị mkpa. Ka anyị lerukwuo anya n’ihe ụfọdụ mere ihe atụ ndị Jizọs mere ji dị irè otú a. Mgbe ahụ, anyị ga-enwe ike ịhụ otú anyị pụrụ isi jiri ụzọ a bara uru na-ezi ihe.

Iji Otu Ihe Dị Mfe Nghọta Tụnyere Ihe Ọzọ

Ihe Osise dị na peeji nke 123

Olee otú Jizọs si jiri nnụnụ na okooko osisi gosi na Chineke na-elekọta anyị?

8, 9. Olee otú Jizọs si were otu ihe dị mfe nghọta tụnyere ihe ọzọ, gịnịkwa mere ihe atụ ndị ahụ ji dị nnọọ irè?

8 Mgbe Jizọs na-ezi ihe, ọ na-ejikarị otu ihe nke na-adịghị mgbagwoju anya tụnyere ihe ọzọ, n’ekwughị ọtụtụ okwu. Ma, okwu ndị dị mfe nghọta o kwuru mere ka ndị mmadụ jiri anya nke uche ha hụ ihe ọ na-ekwu nke ọma. Okwu ndị ahụ kụziri eziokwu ime mmụọ ndị dị mkpa. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ na-adụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha ghara ichegbu onwe ha banyere ihe ndị dị ha mkpa n’ụbọchị, ọ gwara ha banyere “anụ ufe nke eluigwe” na ‘okooko lili dị n’ọhịa.’ Nnụnụ adịghị akụ mkpụrụ, ọ dịghịkwa aghọrọ mkpụrụ. Okooko lili adịghị akpa ogho, ọ dịghịkwa ekwe ákwà. Ma, Chineke na-elekọta ha. Ọ dị mfe ịghọta ihe ọ na-ekwu—ya bụ, ọ bụrụ na Chineke na-elekọta nnụnụ na okooko osisi, n’ezie, ọ ga-elekọta ụmụ mmadụ ndị ‘bu ụzọ na-achọ alaeze ahụ.’—Matiu 6:26, 28-33.

9 E nwere ụzọ ọzọ dị irè Jizọs si were otu ihe tụnyere ihe ọzọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụ site n’ịsị na otu ihe bụ ihe ọzọ. Mgbe ọ na-emekwa ụdị ihe atụ a, o mere ka ọ dị mfe nghọta. Otu mgbe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ìhè nke ụwa.” Ndị na-eso ụzọ ya ghọtara isi ihe ihe atụ a na-ekwu, ya bụ, site n’okwu ha na omume ha, ha pụrụ ime ka ìhè nke eziokwu ime mmụọ na-enwu enwu wee nyere ndị ọzọ aka inye Chineke otuto. (Matiu 5:14-16) Leekwa ihe atụ ndị ọzọ dị irè Jizọs mere: “Unu bụ nnu nke ụwa” na “Abụ m osisi vaịn, unu bụ alaka ya.” (Matiu 5:13; Jọn 15:5) Nkà okwu ndị a magburu onwe ha n’ihi na ha dị mfe nghọta.

10. Olee ihe atụ ụfọdụ na-egosi otú ị pụrụ isi na-eme ihe atụ mgbe ị na-ezi ihe?

10 Olee otú ị pụrụ isi mee ihe atụ mgbe ị na-ezi ihe? Ọ dịghị mkpa ka i chepụta ogologo akụkọ dị mgbagwoju anya. Naanị ihe ị ga-eme bụ ịchọ ihe atụ ndị dị mfe nghọta. Ka e were ya na ị na-ekwu okwu banyere mbilite n’ọnwụ. Ị chọrọ ime ihe atụ na-egosi na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ esirighị Jehova ike. Olee ihe atụ ga-abata gị n’obi? Baịbụl ji ọnwụ tụnyere ụra. Ị pụrụ ịsị, “Ọ dịịrị Chineke mfe ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ dị ka ọ dịịrị anyị mfe ịkpọte mmadụ n’ụra.” (Jọn 11:11-14) Ka e were ya na ị chọrọ ime ihe atụ na-egosi na ịhụnanya dị ụmụaka mkpa ka ha wee tolite nke ọma. Olee ihe atụ ị pụrụ ime? Baịbụl mere ihe atụ a: Ụmụaka dị “ka ome osisi oliv.” (Abụ Ọma 128:3) Ị pụrụ ịsị, “Ịhụnanya dị ụmụaka mkpa dị ka anwụ na mmiri dị osisi mkpa.” Ọ bụrụ na ihe i ji tụnyere ihe ọzọ dị mfe nghọta, ọ ga-adịrị ndị na-ege okwu gị mfe ịghọta ihe ị na-ekwu.

Iji Ihe Ndị Na-eme Eme ná Ndụ Kwa Ụbọchị Na-eme Ihe Atụ

11. Nye ihe atụ ndị na-egosi na ihe ndị Jizọs ji mee ihe atụ bụ n’ezie ihe ndị ọ hụrụ mgbe ọ na-eto na Galili.

11 Jizọs bụ ọkà n’ime ihe atụ ndị metụtara ndụ ndị mmadụ. N’ọtụtụ ihe atụ o mere, a pụrụ ịhụ ihe ndị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị, ndị ọ pụrụ ịbụ na ọ hụrụ mgbe ọ na-eto na Galili. Chetụgodị echiche banyere mgbe ọ bụ nwata. Ugboro ole ka ọ hụrụ mgbe nne ya gwere ọka, tinye ihe na-eko achịcha ná ntụ ọka ọ gwọrọ agwọ, mụnye oriọna, ma ọ bụ zaa ụlọ? (Matiu 13:33; 24:41; Luk 15:8) Ugboro ole ka o kiriri ndị ọkụ azụ̀ ka ha na-awụnye ụgbụ ha n’Oké Osimiri Galili? (Matiu 13:47) Ugboro ole ka ọ hụrụ ka ụmụaka na-egwuri egwu n’ọma ahịa? (Matiu 11:16) Ọ ghaghị ịbụ na Jizọs ji anya ya hụ ihe ndị ọzọ na-abụghị oké ihe o ji mee ihe atụ, ya bụ, ebe a na-agha mkpụrụ, oriri agbamakwụkwọ obi ụtọ, na ọka ndị dị n’ubi anwụ na-acha, ha ewee kaa.—Matiu 13:3-8; 25:1-12; Mak 4:26-29.

12, 13. Gịnị mere o ji bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Jizọs ji ụzọ “si Jeruselem na-agbada Jeriko” kwuo ihe o bu n’obi mgbe ọ na-atụ ilu onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi?

12 N’ihe atụ ndị Jizọs mere, o kwuru irighiri ihe ndị na-ege okwu ya maara nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ malitere ilu onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi site n’ịsị: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe, bụ́ ndị gbara ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, . . . hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma.” (Luk 10:30) E kwesịrị ịrịba ama na Jizọs kwuru banyere ụzọ “si Jeruselem na-agbada Jeriko” mgbe ọ na-ekwu ihe o bu n’obi. Mgbe Jizọs na-atụ ilu a, ọ nọ na Judia, bụ́ ebe na-adịghị anya na Jeruselem; ya mere, o doro anya na ndị gere okwu ya maara ụzọ ọ na-ekwu okwu ya. Ndị mmadụ maara na ụzọ ahụ dị ize ndụ, karịsịa, ma ọ bụrụ na mmadụ na-aga njem naanị ya. Ụzọ ahụ nwere ọtụtụ ebe gbagọrọ agbagọ, ndị mmadụ adịghị esikarị na ya eme njem. Nke a mere ka ndị ohi nwee ọtụtụ ebe ha pụrụ izo.

13 Jizọs kwuru irighiri ihe ndị ọzọ ndị mmadụ maara banyere ụzọ ahụ “si Jeruselem na-agbada Jeriko.” Dị ka o kwuru n’ilu ahụ, onye nchụàjà bu ụzọ si n’ụzọ ahụ na-agafe, e mesịa, onye Livaị sikwa na ya na-agafe—ọ bụ ezie na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha kwụsịrị nyere onye ahụ e merụrụ ahụ́ aka. (Luk 10:31, 32) Ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ndị Livaị na-enyekwara ha aka. Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà na ndị Livaị biri na Jeriko mgbe ha na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ; Jeriko dị naanị kilomita iri abụọ na atọ ma e si na Jeruselem gawa ya. Ya mere, a pụrụ ịhụ ha n’ụzọ ahụ. Rịbakwa ama na Jizọs kwuru na onye njem ahụ “si Jeruselem na-agbada”—ọ bụghị ịgbago agbago. Ndị gere okwu ya ghọtara ihe ọ na-ekwu. Ebe Jeruselem dị dị elu karịa ebe Jeriko dị. Ya mere, ọ bụrụ na onye njem “si Jeruselem” na-apụta, n’ezie, ọ ga “na-agbada” agbada.b O doro anya na Jizọs bu ndị gere okwu ya n’obi.

14. Mgbe anyị na-eme ihe atụ, olee otú anyị pụrụ isi buru ndị anyị na-agwa okwu n’obi?

14 Mgbe anyị na-eme ihe atụ, anyị kwesịrị iburu ndị anyị na-agwa okwu n’obi. Olee ihe ụfọdụ gbasara ndị na-ege okwu anyị ndị pụrụ inyere anyị aka ikpebi ihe atụ ndị anyị ga-ahọrọ? Ma eleghị anya, anyị kwesịrị ichebara ihe ndị dị ka afọ ndụ ha, omenala ha ma ọ bụ ezinụlọ ha si, na aka ọrụ ha, echiche. Dị ka ihe atụ, ihe atụ nke kwuru banyere ihe dị iche iche metụtara ọrụ ubi ga-edo ndị mmadụ anya ngwa ngwa n’ebe a na-arụ ọrụ ubi karịa n’obodo ukwu. Ndụ ndị na-ege okwu anyị na-ebi kwa ụbọchị na ọrụ ha na-arụ—ụmụ ha, ụlọ ha, ihe ha ji atụrụ ndụ, nri ha na-eri—pụrụ ịbụ ihe anyị ga-eji mee ihe atụ kwesịrị ekwesị.

Iji Ihe E Kere Eke Na-eme Ihe Atụ

15. Gịnị mere ọ bụghị ihe ijuanya na Jizọs maara ihe e kere eke nke ọma?

15 Ọtụtụ n’ime ihe atụ ndị Jizọs mere gosiri na ọ maara ihe e kere eke nke ọma, ma ihe ọkụkụ ma anụmanụ ma ihu ígwé. (Matiu 16:2, 3; Luk 12:24, 27) Olee ebe o si mata ihe ndị a? O doro anya na mgbe ọ na-eto na Galili, o nwere ohere buru ibu ịhụ ihe e kere eke. E kwesịrị ịrịba ama karịsịa na Jizọs bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” Jehova jikwa ya rụọ ọrụ dị ka “onye ọkà ọrụ” mgbe ọ na-eke ihe niile. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16; Ilu 8:30, 31) Ọ̀ bụ ihe ijuanya na Jizọs maara ihe e kere eke nke ọma? Ka anyị hụ otú o si jiri ihe ọ maara zie ihe dị ka aka ochie.

16, 17. (a) Olee ihe gosiri na Jizọs maara nke ọma otú atụrụ si akpa àgwà? (b) Olee ihe atụ na-egosi na atụrụ na-anụ olu onye na-azụ ya?

16 Cheta na Jizọs kwuru na ya bụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma,” kwuokwa na ndị na-eso ụzọ ya bụ “atụrụ ya.” Okwu Jizọs gosiri na ọ maara nke ọma otú atụrụ si akpa àgwà. Ọ maara na ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha na-akpachi anya nke ukwuu. Ọ hụrụ na anụ a nke na-atụkwasị onyenwe ya obi na-ekwe ka a na-edu ya edu, hụkwa na ọ na-eso onye na-azụ ya ebe ọ bụla ọ na-aga. Gịnị mere atụrụ ji eso onye na-azụ ya? Jizọs sịrị na ọ bụ “n’ihi na ha maara olu ya.” (Jọn 10:2-4, 11) Ọ̀ bụ eziokwu na atụrụ maara olu onye na-azụ ya?

Picture on page 125

17 George A. Smith dere ihe o ji anya ya hụ n’akwụkwọ ya bụ́ The Historical Geography of the Holy Land, sị: “Mgbe ụfọdụ, anyị na-ezu ike ehihie n’akụkụ otu n’ime olulu mmiri ndị dị na Judia. Ndị ọzụzụ atụrụ atọ ma ọ bụ anọ na-edu ìgwè atụrụ ha abịa n’ebe ahụ. Ìgwè atụrụ ndị ahụ na-agwakọta ọnụ, anyị ana-eche otú onye ọzụzụ atụrụ nke ọ bụla ga-esi duru atụrụ nke ya. Ma mgbe ha ṅụchara mmiri, gwuchaa egwuregwu, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-agbago otu otu n’akụkụ dị iche iche na ndagwurugwu ahụ. Onye nke ọ bụla na-akpọ atụrụ ya òkù n’olu nke ya; atụrụ onye nke ọ bụla na-esi n’ìgwè atụrụ ndị ahụ gakwuru onye na-azụ ya. Ha na-aga n’usoro otú ha si bịa.” O nweghị ihe atụ ọzọ ka mma Jizọs gaara eji kwuo ihe o bu n’obi, ya bụ, na ọ bụrụ na anyị amata ihe ọ na-ezi ma na-erube isi na ya, ọ bụrụkwa na anyị esoro ya mgbe ọ na-edu anyị, “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ ga na-elekọta anyị.

18. Olee ebe anyị pụrụ ịmụta banyere ihe dị iche iche Jehova kere eke?

18 Olee otú anyị pụrụ isi mụta iji ihe e kere eke na-eme ihe atụ? Àgwà ụfọdụ pụrụ iche e ji mara anụmanụ pụrụ ịbụ ihe anyị ga-eji mee ihe atụ dị mfe nghọta ma dị irè. Olee ebe anyị pụrụ ịmụta banyere ihe dị iche iche Jehova kere eke? Baịbụl bụ otu ebe anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu banyere anụmanụ dị iche iche. Mgbe ụfọdụkwa, ọ na-eji àgwà anụmanụ na-akpa eme ihe atụ. Baịbụl kwuru banyere ịwụ ọsọ dị ka nne mgbada ma ọ bụ agụ owuru, ịdị akọ dị ka agwọ, na ịbụ ndị na-adịghị aghụghọ dị ka nduru.c (1 Ihe E Mere 12:8; Habakọk 1:8; Matiu 10:16) Ebe ndị ọzọ anyị pụrụ ịmụta ihe bara uru bụ n’Ụlọ Nche, Teta!, na akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta. Ị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ịhụ otú akwụkwọ ndị a si eji otu ihe dị mfe nghọta n’ime ọtụtụ ihe dị ebube Jehova kere eke atụnyere ihe ndị ọzọ.

Iji Ihe Ndị Mmadụ Ma Ama Na-eme Ihe Atụ

19, 20. (a) Olee ụzọ dị irè Jizọs si jiri ihe mere n’oge na-adịbeghị anya gosi na ihe ndị mmadụ kweere ezighị ezi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe atụ mere eme na ahụmahụ ndị mmadụ nwere na-ezi ihe?

19 A pụrụ iji ihe ndị na-eme eme mee ihe atụ. Otu mgbe, Jizọs ji ihe mere n’oge na-adịbeghị anya gosi na ihe ndị mmadụ kweere, nke bụ́ na ọdachi na-adakwasị ndị o kwesịrị, bụ ụgha. Ọ sịrị: “Ùnu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ ụlọ elu dị na Siloam dagburu bụ ndị mmehie karịa ndị ọzọ niile bi na Jeruselem?” (Luk 13:4) N’ezie, mkpụrụ obi iri na asatọ ahụ anwụghị n’ihi na ha mere mmehie nke kpasuru Chineke iwe. Kama nke ahụ, ọnwụ mberede ha nwụrụ bụ n’ihi “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya.” (Ekliziastis 9:11) Ya mere, Jizọs kụghasịrị ozizi ụgha site n’ikwu banyere ihe ndị na-ege okwu ya maara nke ọma.

20 Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe atụ ndị mere eme na ahụmahụ ndị mmadụ nwere na-ezi ihe? Ka e were ya na ị na-ekwu banyere mmezu amụma Jizọs buru banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya. (Matiu 24:3-14) Ị pụrụ ikwu banyere akụkọ ị nụrụ n’oge na-adịbeghị anya banyere agha, ụnwụ, ma ọ bụ ala ọma jijiji iji gosi na ihe ndị a kpọmkwem na-emezu ihe e kwuru n’ihe ịrịba ama ahụ. Ma ọ bụ, ka e were ya na ị chọrọ iji otu ahụmahụ gosi mgbanwe dị iche iche e kwesịrị ime n’iyiri mmadụ ọhụrụ. (Ndị Efesọs 4:20-24) Olee ebe ị pụrụ inweta ụdị ahụmahụ ahụ? Ị pụrụ ịtụle ụdị ndụ dị iche iche ndị kwere ekwe ibe gị biri n’oge gara aga, ma ọ bụ, ị pụrụ iji ahụmahụ e dere n’otu n’ime akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara.

21. Olee uru dị iche iche onye na-ezi Okwu Chineke n’ụzọ dị irè na-erite?

21 N’ezie, Jizọs bụ Ọkà n’izi ihe! Dị ka anyị hụrụ ná nkebi nke a, ‘izi ihe na ikwusa ozi ọma’ bụ ọrụ bụ́ isi ọ rụrụ. (Matiu 4:23) Ọ bụkwa ọrụ bụ́ isi anyị na-arụ. Uru onye na-ezi ihe n’ụzọ dị irè na-erite buru ibu. Mgbe anyị na-ezi ihe, anyị na-enye ndị ọzọ ihe, nke ahụ na-ewetakwara anyị obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Obi ụtọ ahụ bụ ọṅụ anyị na-enwe maka na anyị maara na anyị na-enye ha ezi ihe nke uru ya na-adịgide adịgide, ya bụ, eziokwu banyere Jehova. Anyị pụkwara inwe afọ ojuju nke a na-enweta n’ịmara na anyị na-eso ihe nlereanya Jizọs bụ́ Onye Ozizi kasị ukwuu nke bitụworo n’ụwa.

a O doro anya na akwụkwọ mbụ e si n’ike mmụọ nsọ dee nke kọrọ banyere ndụ Jizọs biri n’ụwa bụ Oziọma Matiu. E dere ya n’ihe dị ka afọ asatọ mgbe Jizọs nwụsịrị.

b Jizọs sịkwara na onye nchụàjà ahụ na onye Livaị ahụ “si Jeruselem” na-agbada. Ha si n’ụlọ nsọ ahụ na-ala. Ya mere, o nweghị onye ga-asị na ihe mere ha ji zere nwoke ahụ nke tọgbọ ka ozu bụ na ha achọghị ihe ga-emerụ ha ka ha ghara ije ozi n’ụlọ nsọ.—Levitikọs 21:1; Ọnụ Ọgụgụ 19:16.

c Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe e depụtachara otú Baịbụl si jiri àgwà anụmanụ mee ihe atụ, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke Mbụ, peeji nke 268, 270 ruo 271, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee ihe ụfọdụ e kere eke Jizọs ji mee ihe atụ, oleekwa otú ị pụrụ isi jiri ụdị ihe ndị ahụ mee ihe atụ?—Matiu 13:24-32.

  • Olee otú Jizọs si jiri ihe atụ dị mfe nghọta kwuo okwu gbara ọkpụrụkpụ, gịnịkwa ka ị mụtara n’ihe nlereanya ya?—Matiu 18:12-14.

  • Olee ihe ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị Jizọs ji mee ihe atụ, oleekwa otú ihe nlereanya ya pụrụ isi nyere gị aka ịhọrọ ihe atụ ndị ị ga na-eme?—Luk 11:5-8; 12:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya