ISI NKE IRI NA ISE
“O Nwere Ọmịiko”
“Onyenwe anyị, ka e meghee anya anyị”
1-3. (a) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị ìsì abụọ bụ́ ndị arịrịọ rịọrọ ya ka o nyere ha aka? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘o nwere ọmịiko’ pụtara? (Lee ihe e dere n’ala ala peeji.)
NDỊ ìsì abụọ nọ ọdụ n’akụkụ okporo ụzọ e si abanye Jeriko. Ha na-abịa ebe ahụ kwa ụbọchị, chọta ebe ha chere ndị mmadụ ga-esi na-agafe, nọrọ ebe ahụ na-arịọ arịrịọ n’ihu ọha. Otú ọ dị, taa, ha na-aga ịhụ ihe ga-agbanwe ndụ ha nke ukwuu.
2 Na mberede, ndị arịrịọ abụọ ahụ nụrụ mkpọtụ a na-eme. Ebe ọ bụ na ha apụghị ịhụ ihe na-emenụ, otu n’ime ha jụrụ ihe mere e ji na-eme mkpọtụ ahụ. E wee sị ya: “Jizọs onye Nazaret na-agafe!” Jizọs na-aga Jeruselem nke ikpeazụ ya. Ma ọ bụghị naanị ya na-aga; oké ìgwè mmadụ so ya. Mgbe a gwara ndị arịrịọ ahụ onye na-agafe, ha malitere ime mkpọtụ, na-eti mkpu, sị: “Onyenwe anyị, meere anyị ebere, Nwa Devid!” O were ìgwè mmadụ ahụ iwe. Ha wee gwa ha ka ha mechie ọnụ. Ma ndị ikom ahụ chọsiri ike ka e nyere ha aka. Ha akwụsịghị iti mkpu.
3 Jizọs nụrụ mkpu ha na-eti n’agbanyeghị oké ụzụ ìgwè mmadụ ahụ na-eme. Gịnị ka ọ ga-eme? Ihe na-echegbu ya dị ọtụtụ. Ọ na-aga ịbanye n’izu ikpeazụ ná ndụ o biri n’ụwa. Ọ maara na ya na-aga ịta ahụhụ nakwa na a ga-eji obi ọjọọ gbuo ya na Jeruselem. Ma o legharaghị mkpu ahụ ha na-eti anya. Ọ kwụsịrị, sị ka a kpọta ndị na-eti mkpu ahụ. Ha rịọrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ka e meghee anya anyị.” “N’ihi ọmịiko Jizọs nwere,” o bitụrụ ha aka n’anya, ha wee hụwa ụzọ.a N’egbughị oge, ha malitere iso Jizọs.—Luk 18:35-43; Matiu 20:29-34.
4. Olee otú Jizọs si mezuo amụma nke kwuru na ‘ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere’?
4 Ọ bụghị naanị n’oge a ka Jizọs gosiri ọmịiko. Ọtụtụ mgbe, o metụrụ Jizọs n’obi nke ukwuu igosi ọmịiko mgbe ihe dị iche iche mere. Baịbụl buru amụma na ‘ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere.’ (Abụ Ọma 72:13) Jizọs mezuru okwu ndị ahụ, o chebaara otú obi dị ndị ọzọ echiche. O nyeere ndị mmadụ aka n’echeghị ka a rịọ ya arịọ. Ọ bụ ọmịiko ya kpaliri ya ikwusa ozi ọma. Ka anyị hụ otú Matiu, Mak, Luk na Jọn si mee ka a mata na ọ bụ obi ọmịiko kpaliri Jizọs ikwu ihe ndị o kwuru na ime ihe ndị o mere, tụleekwa otú anyị pụrụ isi gosi ọmịiko dị otú ahụ.
O Chebaara Otú Obi Dị Ndị Ọzọ Echiche
5, 6. Olee ihe atụ ndị na-egosi na Jizọs bụ nwoke ọmịiko?
5 Jizọs bụ nwoke nke nwere ọmịiko dị ukwuu. Ọ maara otú obi dị ndị na-ata ahụhụ. Ebere ha mekwaara ya. Ọ bụ ezie na ọ nọtụbeghị n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ, ihe na-ewute ha metụrụ ya n’obi n’ezie. (Ndị Hibru 4:15) Mgbe ọ na-agwọ otu nwaanyị nke na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ, ọ kọwara na ihe na-arịa nwaanyị ahụ bụ ‘ọrịa ọjọọ.’ O si otú ahụ kwuo na ọrịa ahụ enyewo nwaanyị ahụ nsogbu dị ukwuu, taakwa ya ahụhụ. (Mak 5:25-34) Mgbe ọ hụrụ ka Meri na ndị so ya na-akwa ákwá n’ihi ọnwụ Lazarọs, uju ha na-eru metụrụ ya n’ahụ́ nke na o nyere ya nsogbu n’obi. Ọ bụ ezie na Jizọs maara na ya na-aga ime ka Lazarọs si n’ọnwụ bilie, o metụrụ ya n’ahụ́ nke na anya mmiri juru ya n’anya.—Jọn 11:33, 35.
6 N’oge ọzọ, onye ekpenta bịakwutere Jizọs, rịọ ya, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Gịnị ka Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè nke na-arịatụbeghị ọrịa, mere? Ọrịa onye ekpenta ahụ metụrụ ya n’obi. N’ezie, “o nwere ọmịiko.” (Mak 1:40-42) O wee mee otu ihe pụrụ iche. Ọ maara nke ọma na ndị ekpenta bụ ndị na-adịghị ọcha dị ka e kwuru n’Iwu Mozis, na ha ekwesịghịkwa ịnọ n’etiti ndị ọzọ. (Levitikọs 13:45, 46) N’ezie, Jizọs pụrụ ịgwọ nwoke ahụ n’ebitụghị ya aka. (Matiu 8:5-13) Ma, o kpebiri ịmatị aka, bitụ onye ekpenta ahụ, sị: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” Ekpenta nwoke ahụ lara ozugbo. Lee obi ọmịiko Jizọs gosiri!
Gosi na ‘ihe banyere onye ọzọ na-emetụ gị n’obi’
7. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịmụta inwe ọmịiko, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi ọmịiko?
7 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị iṅomi Jizọs n’inwe ọmịiko. Baịbụl gbara anyị ume ‘ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ anyị n’obi.’b (1 Pita 3:8) Ọ pụrụ isiri anyị ike ịmata otú obi dị ndị na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala ma ọ bụ ndị dara mbà n’obi—karịsịa ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị enwetụbeghị ụdị nsogbu ahụ. Ma, cheta na anyị inwe ọmịiko abụghị n’ihi na ụdị ihe ahụ emetụla anyị. Jizọs nwere ọmịiko n’ebe ndị ọrịa nọ n’agbanyeghị na ya onwe ya arịatụbeghị ọrịa. Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi mụta inwe ọmịiko? Ọ bụ site n’iji ndidi na-ege ntị mgbe ndị na-ata ahụhụ na-akọrọ anyị otú obi dị ha. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘A sị na ọ bụ m ka ihe a na-eme, olee otú ọ ga-adị m?’ (1 Ndị Kọrịnt 12:26) Ọ bụrụ na anyị amụtakwuo ichebara otú obi dị ndị ọzọ echiche, ọ ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Mgbe ụfọdụ, ihe anyị pụrụ iji gosi ọmịiko abụghị naanị okwu ọnụ, kamakwa, ọ bụ anya mmiri. Ndị Rom 12:15 sịrị: “Soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.”
8, 9. Olee otú Jizọs si chebara otú obi dị ndị ọzọ echiche?
8 Jizọs chebaara ndị ọzọ echiche. Otú o si mee ihe gosiri na ọ ghọtara otú obi dị ha. Cheta mgbe a kpọtaara Jizọs otu nwoke ntị chiri, nke ọ na-esiri ike ikwu okwu. O doro anya na Jizọs ghọtara na ahụ́ erughị nwoke ahụ ala. N’ihi ya, o mere ihe ọ na-adịghị emekarị mgbe ọ na-agwọ ndị ọzọ: ‘O si n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ kpọrọ naanị nwoke ahụ pụọ.’ Ọ gwọrọ nwoke ahụ n’ebe naanị ya nọ, n’ebe ìgwè mmadụ na-adịghị ele ya anya.—Mak 7:31-35.
9 Otú ahụ ka Jizọs chebaara otu nwoke kpuru ìsì echiche mgbe ndị mmadụ du nwoke ahụ bịakwute ya, rịọ ya ka ọ gwọọ ya. Jizọs ‘seere nwoke ahụ kpuru ìsì n’aka, kpọrọkwa ya pụọ n’obodo nta ahụ.’ O wee jiri nke nta nke nta gwọọ nwoke ahụ. Ma eleghị anya, nke a mere ka ihe na-egbu maramara na ìhè anyanwụ nke na-enwu gburugburu nwoke ahụ ghara ịchachi ya anya, gharakwa ime ka ihe niile gbaa ya gharịị. (Mak 8:22-26) Jizọs chebaara ya echiche nke ukwuu.
10. Olee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi chebara otú obi dị ndị ọzọ echiche?
10 Anyị ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs pụtara na anyị ga na-echebara otú obi dị ndị ọzọ echiche. Ya mere, anyị na-akpachara anya n’otú anyị si ekwu okwu. Anyị kwesịrị icheta na iji ire ekwu okwu n’echeghị echiche pụrụ iwute ndị ọzọ. (Ilu 12:18; 18:21) Okwu ọjọọ, okwu mkparị, na njakịrị nke na-akpasu iwe ekwesịghị ịdị n’etiti Ndị Kraịst ndị na-echebara otú obi dị ndị ọzọ echiche. (Ndị Efesọs 4:31) Ndị okenye, olee otú unu pụrụ isi chebara otú obi dị ndị ọzọ echiche? Mgbe unu na-enye ndụmọdụ, jirinụ obiọma mee ka okwu unu ghara ịda ike ike, ka unu ghara imenye onye unu na-agwa okwu ihere. (Ndị Galeshia 6:1) Ndị mụrụ ụmụ, olee otú unu pụrụ isi chebara otú obi dị ụmụ unu echiche? Mgbe unu na-adọ ha aka ná ntị, gbalịanụ ime ya n’ụzọ na-agaghị emechu ụmụ unu ihu.—Ndị Kọlọsi 3:21.
O Nyeere Ndị Ọzọ Aka n’Echeghị Ka A Rịọ Ya Arịọ
11, 12. Olee akụkọ ndị dị na Baịbụl gosiri na a rịọghị Jizọs arịọ tupu ya egosi ndị ọzọ ọmịiko?
11 Ọ bụghị mgbe niile ka a rịọrọ Jizọs arịọ tupu ya egosi ndị ọzọ ọmịiko. N’ezie, ọmịiko abụghị àgwà na-adị mmadụ naanị n’ime obi, kama, ọ bụ àgwà na-eme ka mmadụ mee ihe ọma. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụ obi ọmịiko mere ka Jizọs nyere ndị ọzọ aka n’echeghị ka a rịọ ya arịọ. Dị ka ihe atụ, mgbe oké ìgwè mmadụ bịakwutere ya, nọrọ ruo ụbọchị atọ n’erighị nri, ọ dịghị onye gwara Jizọs na agụụ na-agụ ndị ahụ ma ọ bụ gwa ya ka o nye ha nri. Baịbụl sịrị: “Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, wee sị: ‘Enwere m ọmịiko n’ebe ìgwè mmadụ a nọ, n’ihi na ka ọ dị ugbu a, o ruworị ụbọchị atọ mụ na ha nọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri; achọghịkwa m ịsị ha lawa n’agụụ. Ha nwere ike ịda mbà n’okporo ụzọ.’” Ya mere, o kpebiri n’onwe ya ịrụ ọrụ ebube wee nye ìgwè mmadụ ahụ nri.—Matiu 15:32-38.
12 Tụlee ihe ọzọ a kọrọ na Baịbụl. N’afọ 31 O.A., mgbe Jizọs na-abịaru obodo Nen nso, ọ hụrụ ihe dị mwute nke merenụ. Ìgwè mmadụ ndị na-aga ili ozu si n’obodo ahụ na-apụta. Ma eleghị anya, ha na-aga n’ili ndị dị nso, ndị dị n’akụkụ ugwu, ka ha gaa lie ‘nwa nwoke nke nwaanyị di ya nwụrụ mụrụ naanị ya.’ Lee nnọọ ka o si na-ewute nne ya n’obi! Ọ na-aga ili nwa nwoke ọ mụrụ naanị ya. O nweghị di nke ga-enyere ya aka n’oge iru uju a. N’ime ndị niile so n’ìgwè mmadụ ahụ, Jizọs “hụrụ” nwaanyị ahụ di ya nwụrụ, nke gba aka nwa ugbu a. Ihe ọ hụrụ metụrụ ya n’obi—ee, “o nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ.” Ọ dịghị onye rịọrọ ya arịọ. Obi ọmịiko ya kpaliri ya inyere ya aka n’echeghị ka a rịọ ya arịọ. Ya mere, ‘ọ garuru nso ma bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka,’ mee ka nwa okorobịa ahụ dị ndụ. Gịnị meziri? Jizọs agwaghị nwa okorobịa ahụ ka o soro oké ìgwè mmadụ ahụ so Ya na-eme njem. Kama nke ahụ, Jizọs ‘kpọnyere ya nne ya,’ mee ka ha bụrụghachi otu ezinụlọ, hụkwa na a ga-elekọta nwaanyị ahụ di ya nwụrụ.—Luk 7:11-15.
Nyere ndị nọ ná mkpa aka n’echeghị ka a rịọ gị arịọ
13. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ime ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nyere ndị nọ ná mkpa aka n’echeghị ka a rịọ anyị arịọ?
13 Olee otú anyị pụrụ isi soro ihe nlereanya Jizọs? N’ezie, anyị apụghị inye ndị mmadụ nri site n’ịrụ ọrụ ebube, ma ọ bụ mee ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ. Otú ọ dị, anyị pụrụ iṅomi Jizọs site n’inyere ndị nwere mkpa aka n’echeghị ka a rịọ anyị arịọ. Oké ọdachi pụrụ ịdakwasị onye kwere ekwe ibe anyị wee mee ka ọ ghara inwekwa ego, ma ọ bụ a pụrụ ịchụ ya n’ọrụ. (1 Jọn 3:17) Ọ pụrụ ịdị mkpa ozugbo ka a rụzie ụlọ nwaanyị di ya nwụrụ. (Jems 1:27) Anyị pụrụ ịma ezinụlọ mmadụ nwụnahụrụ, nke e kwesịrị ịkasi obi ma ọ bụ inyere aka. (1 Tesalonaịka 5:11) Mgbe e nwere ezigbo mkpa, anyị ekwesịghị ichere ka a rịọ anyị arịọ tupu anyị enyere ndị mmadụ aka. (Ilu 3:27) Ọmịiko ga-akpali anyị ime ihe anyị kwesịrị ime ka anyị nyere ha aka dị ka ọnọdụ anyị si dị n’echeghị ka a rịọ anyị arịọ. Echefula na ime ihe ọ bụla obiọma kpaliri anyị ime, ma ọ bụ okwu nkasi obi ole na ole ndị si anyị n’ala ala obi, pụrụ igosi na anyị nwere ọmịiko dị ukwuu.—Ndị Kọlọsi 3:12.
Ọmịiko Kpaliri Ya Ikwusa Ozi Ọma
14. Gịnị mere Jizọs ji were ọrụ ikwusa ozi ọma dị ka ihe kasị mkpa?
14 Dị ka anyị hụrụ ná Nkebi nke Abụọ n’akwụkwọ a, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya pụrụ iche n’ikwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.” (Luk 4:43) Gịnị mere o ji were ọrụ a dị ka ihe kasị mkpa? Isi ihe kpatara ya bụ na ọ hụrụ Chineke n’anya. Ma, ọ dị ihe ọzọ kpaliri Jizọs. Ọ bụ obi ọmịiko ya. Ọ kpaliri ya igbo mkpa ime mmụọ nke ndị ọzọ. N’ime ụzọ niile o si gosi ọmịiko, ọ dịghị nke dị ya mkpa karịa inyeju ndị agụụ ihe ime mmụọ na-agụ afọ. Ka anyị tụlee ihe abụọ merenụ ndị gosiri otú Jizọs si lee ndị o kwusaara ozi ọma anya. Ịtụle ihe ndị a ga-enyere anyị aka inyocha ihe na-akpali anyị ikwusa ozi ọma.
15, 16. Kọọ ihe abụọ merenụ ndị gosiri otú Jizọs si lee ndị o kwusaara ozi ọma anya.
15 N’afọ 31 O.A., mgbe Jizọs rụsiri ọrụ ike n’ozi ya ruo ihe dị ka afọ abụọ, o tinyekwuru mgbalị site n’ịmalite “ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile” dị na Galili. Ihe ọ hụrụ metụrụ ya n’obi. Matiu onyeozi kọrọ, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:35, 36) Ebere ndị mmadụ meere Jizọs. Ọ maara nke ọma na ọnọdụ ime mmụọ ha dị mwute. Ọ maara na ọ bụ ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị kwesịrị ịzụ ha dị ka atụrụ, na-emegbu ha, na-elegharakwa ha anya. Ọmịiko dị ukwuu Jizọs nwere kpaliri ya ịrụsi ọrụ ike izi ndị mmadụ ozi olileanya. Ọ dịghị ihe dị ha mkpa karịa ozi ọma Alaeze Chineke.
16 Ihe yiri nke ahụ mere mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị, mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka oge Ememme Ngabiga nke afọ 32 O.A. ruo. N’oge ahụ, Jizọs na ndịozi ya banyere n’ụgbọ mmiri gafee Oké Osimiri Galili ka ha chọta ebe dị jụụ ha ga-anọ zuru ike. Ma ìgwè mmadụ si n’ụsọ osimiri ahụ gbara ọsọ buru ụgbọ mmiri ha ụzọ ruo n’ofe osimiri ahụ. Gịnị ka Jizọs mere? “Mgbe ha pụtara, ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ, ma o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ, n’ihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O wee malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:31-34) Jizọs ‘nwekwara ọmịiko n’ebe ha nọ’ n’ihi na ọnọdụ ime mmụọ ha dị mwute. Dị ka “atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha,” agụụ nri ime mmụọ nọ na-agụgbu ha. Ọ dịghịkwa onye na-elekọta ha. Ihe kpaliri Jizọs ikwusa ozi ọma bụ ọmịiko ya, ọ bụghị ka a sị na ọ rụọla ọrụ dịịrị ya.
Jiri ọmịiko na-ekwusa ozi ọma
17, 18. (a) Gịnị na-akpali anyị ikwusa ozi ọma? (b) Olee otú anyị pụrụ isi mụta inwe ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ?
17 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, gịnị na-akpali anyị ikwusa ozi ọma? Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Itoolu n’akwụkwọ a, e nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20; 1 Ndị Kọrịnt 9:16) Ma ihe mere anyị ji na-arụ ọrụ a ekwesịghị ịbụ ka a sị na anyị arụọla ọrụ dịịrị anyị ma ọ bụ ka anyị mezuo iwu. Ihe kasịnụ mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma Alaeze Jehova bụ na anyị hụrụ Jehova n’anya. Ihe ọzọ mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma bụ ọmịiko anyị nwere n’ebe ndị na-abụghị ndị kwere ekwe ibe anyị nọ. (Mak 12:28-31) Ma, olee otú anyị pụrụ isi mụta inwe ọmịiko n’ebe ndị ọzọ nọ?
18 Anyị kwesịrị ile ndị mmadụ anya otú Jizọs si lee ha anya, ya bụ, na “a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” Ka e were ya na ị hụrụ nwa atụrụ nke kpafuru akpafu n’amaghịzi ebe ọ ga-aga. Agụụ na-agụgbu nwa atụrụ ahụ, mmiri na-agụkwa ya, n’ihi na ọ dịghị onye ọzụzụ atụrụ nke ga-eduga ya n’ebe ahịhịa ndụ na mmiri dị. Ọ̀ bụ na ebere nwa atụrụ ahụ agaghị emere gị? Ọ̀ bụ na ị gaghị agbalịsi ike inye ya nri na mmiri? Ọtụtụ ndị na-aghọtabeghị ozi ọma yiri nwa atụrụ ahụ. Ndị ọzụzụ atụrụ nke okpukpe ụgha leghaara ha anya, agụụ ana-agụgbu ha, akpịrị ana-akpọkwa ha nkụ, n’ụzọ ime mmụọ. Ha enweghịkwa ezi olileanya maka ọdịnihu. Anyị nwere ihe dị ha mkpa, ya bụ, nri ime mmụọ nke na-edozi ahụ́, na mmiri nke na-enye ume, nke bụ́ eziokwu dị n’Okwu Chineke. (Aịzaya 55:1, 2) Ọ bụrụ na anyị echebara mkpa ime mmụọ nke ndị gbara anyị gburugburu echiche, ebere ha ga-emere anyị. Dị ka Jizọs, ọ bụrụ na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ anyị n’obi nke ukwuu, anyị ga-eme ihe niile anyị pụrụ ime ịkọrọ ha banyere olileanya Alaeze Chineke.
19. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nye aka kpalie onye anyị na-amụrụ Baịbụl, bụ́ onye ruru eru, ka ọ malite ikwusa ozi ọma?
19 Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka isoro ihe nlereanya Jizọs? Ka e were ya na anyị chọrọ ịgba onye anyị na-amụrụ Baịbụl ume, bụ́ onye ruru eru, ka ọ malite ikwusa ozi ọma. Ma ọ bụ, ikekwe, anyị chọrọ inyere onye na-adịghị ejekwa ozi aka ka ọ malite ọzọ ikwusa ozi ọma. Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị dị otú a aka? Anyị kwesịrị iru ha n’obi. Cheta na Jizọs bu ụzọ ‘nwee ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ.’ O wee zie ha ihe. (Mak 6:34) Ya mere, ọ bụrụ na anyị pụrụ inyere ha aka ịmụta inwe ọmịiko, ọ pụrụ imetụ ha n’obi ime ka Jizọs, wee na-ezi ndị ọzọ ozi ọma. Anyị pụrụ ịjụ ha, sị: “Olee otú ịnabata ozi Alaeze Chineke si mee ka ndụ gị ka mma? Gịnị banyere ndị na-aghọtabeghị ozi a—ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ịnụ ozi ọma a? Gịnị ka ị pụrụ ime iji nyere ha aka?” N’ezie, ihe kasịnụ mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma bụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, chọọkwa ijere ya ozi.
20. (a) Gịnị ka ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Isii?
20 Ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs apụtaghị naanị ịgwa ndị mmadụ ihe ọ kụziri na iṅomi ihe o mere. Anyị kwesịrị ịmụta “ụdị echiche” o nwere. (Ndị Filipaị 2:5) Ya mere, anyị kwesịrị inwe obi ekele dị ukwuu na Baịbụl kpugheere anyị echiche Jizọs na ihe mere o ji kwuo ihe ndị o kwuru, meekwa ihe ndị o mere. Ọ bụrụ na anyị amata “uche nke Kraịst” nke ọma, ọ ga-eme ka ọ kara anyị mfe ịmụta ichebara ndị ọzọ echiche na inwe obi ọmịiko. Anyị ga-esikwa otú ahụ na-emeso ndị ọzọ ihe otú Jizọs si meso mmadụ niile ihe. (1 Ndị Kọrịnt 2:16) N’Isi nke Iri na Isii, anyị ga-atụle ụzọ dị iche iche Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya.
a Otu akwụkwọ kwuru na okwu Grik nke a sụgharịrị ‘o nwere ọmịiko’ bụ otu n’ime okwu kasị mkpa e ji akọwa obi ọmịiko n’asụsụ Grik. Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru na ihe okwu a na-egosi “abụghị naanị na ihe na-ewute mmadụ mgbe ọ hụrụ ahụhụ mmadụ na-ata, kamakwa, ọ na-egosi na onye ahụ chọsiri ike ime ka ahụhụ ahụ belata, na iwepụ ya.”
b N’asụsụ Grik, otú e si dee okwu a a sụgharịrị ‘ihe banyere onye ọzọ imetụ anyị n’obi’ bụ “iso mmadụ taa ahụhụ.”