Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 16 p. 161-171
  • “Jizọs . . . Hụrụ Ha n’Anya Ruo Ọgwụgwụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Jizọs . . . Hụrụ Ha n’Anya Ruo Ọgwụgwụ”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Nwere Ndidi
  • O Gboro Mkpa Ha
  • Ọ Na-adị Njikere Ịgbaghara Mmehie
  • O Gosiri na Ọ Tụkwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Ya Obi
  • Ì Nwere “Uche nke Kraịst”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “Ịmara Ịhụnanya nke Kraịst Ahụ”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ọ Mụtara Mgbaghara n’Aka Nna Ya Ukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 16 p. 161-171

ISI NKE IRI NA ISII

“Jizọs . . . Hụrụ Ha n’Anya Ruo Ọgwụgwụ”

1, 2. Olee otú Jizọs na ndịozi ya si nọrịa n’anyasị ikpeazụ ya na ha nọrọ, oleekwa ihe mere oge a fọdụụrụ ya ji dị ya mkpa?

MGBE Jizọs kpọkọtara ndịozi ya n’ọnụ ụlọ dị n’elu otu ụlọ na Jeruselem, ọ maara na anyasị ahụ bụ nke ikpeazụ ya na ha ga-anọ. Mgbe ọ ga-alakwuru Nna ya adịla nso. N’ime awa ole na ole, a ga-ejide Jizọs, nwaleekwa okwukwe ya otú a na-anwaletụbeghị ya. N’agbanyeghị na ọ ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, o lebaara mkpa ndịozi ya anya.

2 Jizọs agwalarị ndịozi ya na ya ga-ahapụ ha. Ma, ọ ka nwere ihe ndị ọzọ ọ ga-agwa ha iji mee ka ha dị ike n’ihi ihe na-aga ime. Ya mere, o ji oge a dị mkpa fọdụụrụ ya na-ezi ha ihe ndị dị mkpa ga-enyere ha aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. N’ime ihe niile ọ gwatụworo ha, ihe ọ na-ekwu ugbu a bụ otu n’ime isiokwu kasị emetụ n’ahụ́, nke na-egosikwa ezi mmekọrịta. Ma, gịnị mere Jizọs ji eche banyere ndịozi ya karịa ka ọ na-eche banyere onwe ya? Gịnị mere awa ikpeazụ ndị a ya na ha nọ ji dị ya oké mkpa? Ná nkenke, azịza ya bụ ịhụnanya. Ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu.

3. Olee otú anyị si mara na Jizọs echereghị ruo anyasị ikpeazụ fọdụụrụ ya tupu ya amalite igosi na ya hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya?

3 Mgbe ọtụtụ afọ iri gasịrị, n’oge Jọn onyeozi na-amalite ihe o si n’ike mmụọ nsọ dee banyere ihe mere n’anyasị ahụ, ọ sịrị: “Ebe Jizọs maara tupu ememme ngabiga ahụ na oge awa ya eruwo ka ọ pụọ n’ụwa lakwuru Nna ya, ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya, ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) Jizọs echereghị ruo n’abalị ahụ tupu ya amalite igosi na ọ hụrụ “ndị nke ya” n’anya. N’oge dum o jere ozi ya, o gosiri n’ụzọ dị iche iche na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. Ọ ga-abara anyị uru ileba anya n’ụzọ ụfọdụ o si gosi ịhụnanya ya, n’ihi na site n’iṅomi ya n’ime nke a, anyị na-egosi na anyị bụ ezi ndị na-eso ụzọ ya.

O Nwere Ndidi

4, 5. (a) Gịnị mere ndidi ji dị Jizọs mkpa mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya na-emekọ ihe? (b) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndịozi ya atọ na-amụghị anya n’ogige Getsemeni?

4 E nwere ihe jikọrọ ịhụnanya na ndidi. Ndị Kọrint nke Mbụ 13:4 kwuru, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi.” Inwe ogologo ntachi obi pụtara iji ndidi na-edi ihe ndị ọzọ na-eme. Inwe ndidi ọ̀ dị Jizọs mkpa mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya na-emekọ ihe? N’ezie, ọ dị ya! Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Atọ, ndịozi ya amụtaghị ịdị umeala n’obi ngwa ngwa. Ha rụrụ ụka ihe karịrị otu ugboro banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha. Olee ihe Jizọs mere? Ò were iwe ma nwee mgbakasị ahụ́ ma ọ bụ buru iwe n’obi? Ee e, o ji ndidi mee ka ha tụgharịa uche ọbụna mgbe “esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ” bilitere n’ihi otu ihe a n’anyasị ikpeazụ ya na ha nọrọ!—Luk 22:24-30; Matiu 20:20-28; Mak 9:33-37.

5 Mgbe e mesịrị n’abalị ikpeazụ ahụ, mgbe Jizọs gara n’ogige Getsemeni, ya na ndịozi iri na otu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, a nwalere ndidi ya ọzọ. Jizọs hapụrụ mmadụ asatọ n’ime ndịozi ahụ ma kpọrọ Pita, Jems, na Jọn bamikwuo n’ime ogige ahụ. Jizọs sịrị ha: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu ọbụna ruo ọnwụ. Nọrọnụ n’ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.” Ọ gatụkwuru wee malite ikpesi ekpere ike. Mgbe o kpesịrị ekpere ruo ogologo oge, ọ gaghachikwuuru ndịozi ya atọ. Gịnị ka ọ hụrụ? N’oge a, mgbe ọnwụnwa kasịnụ bịaara ya, ha na-ehi ụra! Ọ̀ baara ha mba maka na ha amụghị anya? Ee e, o ji ndidi gbaa ha ume. Okwu o ji obiọma kwuo gosiri na ọ ghọtara ahụhụ ndị ha tarala, ghọtakwa adịghị ike ha.a Ọ sịrị, “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.” Jizọs nwere ndidi n’anyasị ahụ, ọbụna mgbe ọ bịara hụ ka ha na-ehi ụra, ọ bụghị naanị otu ugboro, kama ugboro abụọ ọzọ!—Matiu 26:36-46.

6. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe?

6 Ọ bụ ihe na-agba ume na ike ndị na-eso ụzọ Jizọs agwụghị Jizọs. Ndidi ya mesịrị rụpụta ihe dị mma, n’ihi na ndị ikom a, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, mụtara na ọ dị mkpa ịdị umeala n’obi na ịmụrụ anya. (1 Pita 3:8; 4:7) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe? Inwe ndidi dị ndị okenye mkpa karịsịa. Ndị kwere ekwe ibe anyị pụrụ iburu nsogbu ha bịakwute okenye mgbe ike gwụchara ya ma ọ bụ mgbe nsogbu nke ya na-echegbu ya. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ na ndị enyemaka dị mkpa agaghị anara ndụmọdụ e nyere ha ngwa ngwa. N’agbanyeghị nke a, ndị okenye bụ́ ndị na-enwe ndidi ga-eji “nwayọọ” zie ìgwè atụrụ ahụ ihe ma ‘meere ha ebere.’ (2 Timoti 2:24, 25; Ọrụ 20:28, 29) Ndị mụrụ ụmụ kwesịkwara iṅomi Jizọs n’inwe ndidi, n’ihi na mgbe ụfọdụ, ụmụaka adịghị anara ndụmọdụ ma ọ bụ mgbazi ngwa ngwa. Ịhụnanya na ndidi ga-enyere ndị mụrụ ụmụ aka ka ha ghara ịda mbà ná mgbalị ha na-eme ịzụ ụmụ ha. N’ezie, ụgwọ ọrụ a na-enweta n’inwe ndidi otú a pụrụ ibu ibu nke ukwuu.—Abụ Ọma 127:3.

O Gboro Mkpa Ha

7. Olee ụzọ dị iche iche Jizọs si gboo mkpa anụ ahụ́ nke ndị na-eso ụzọ ya?

7 Mmadụ na-egosi ịhụnanya site n’ime omume ndị na-egosi na ya adịghị achọ ọdịmma onwe ya naanị. (1 Jọn 3:17, 18) Ịhụnanya ‘adịghị achọ ọdịmma nke ya.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:5) Ịhụnanya kpaliri Jizọs igbo mkpa anụ ahụ́ nke ndị na-eso ụzọ ya. Ọtụtụ ugboro, o meere ha ihe ọbụna tupu ha ekwuo ihe bụ́ mkpa ha. Mgbe ọ hụrụ na ike gwụrụ ha, ọ gwara ha ka ya na ha “gaa zurutụ ike n’ebe ndị mmadụ na-adịghị anọkarị.” (Mak 6:31) Mgbe ọ ghọtara na agụụ na-agụ ha, o nyere ha ihe oriri n’echeghị ka ha rịọ ya arịọ—ha na ọtụtụ puku ndị ọzọ ndị bịara igere ihe ọ na-ezi.—Matiu 14:19, 20; 15:35-37.

8, 9. (a) Olee ihe gosiri na Jizọs ghọtara mkpa ime mmụọ nke ndị na-eso ụzọ ya ma gboo ya? (b) Mgbe Jizọs nọ n’elu osisi, olee otú o si gosi na ọ na-echegbu onwe ya maka nne ya?

8 Jizọs ghọtara mkpa ime mmụọ nke ndị na-eso ụzọ ya wee gboo ya. (Matiu 4:4; 5:3) Mgbe ọ na-ezi ihe, ọ na-elebara ha anya n’ụzọ pụrụ iche. O ziri Ozizi Elu Ugwu ya karịsịa ka ọ baara ndị na-eso ụzọ ya uru. (Matiu 5:1, 2, 13-16) Mgbe o ji ihe atụ zie ihe, ‘ọ na-akọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe niile mgbe naanị ha nọ.’ (Mak 4:34) Jizọs buru amụma na ya ga-ahọpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” iji hụ na a ga na-enyeju ndị na-eso ụzọ ya nri ime mmụọ afọ n’oge ikpeazụ. Ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna Jizọs nọ n’ụwa, bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Kemgbe afọ 1919, ha na-enye nri ime mmụọ “n’oge kwesịrị ekwesị.”—Matiu 24:45.

9 N’ụbọchị Jizọs nwụrụ, o gosiri n’ụzọ na-emetụ n’obi na ọ na-echegbu onwe ya maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọ hụrụ n’anya. Jiri anya nke uche gị hụ ihe mere mgbe ahụ. Jizọs nọ n’elu osisi ahụ a kpọgidere ya. Ọ nọ n’oké ihe mgbu. Iji kute ume, o doro anya na ọ na-agbagidesi ụkwụ ike n’ebe a kụnyere ya ntu wee bulie onwe ya elu. Ọ bụghị ihe ijuanya na nke a fụrụ ya ụfụ nke ukwuu n’ihi na ahụ́ ya dum nyịgidere ebe ahụ a kụnyere ya ntu n’ụkwụ, mee ka ọ na-adọwakwu, osisi ahụ ana-echi ya n’azụ ya ahụ e ji ụtarị pịarichaa. Ebe ọ bụ na mmadụ aghaghị ịdị na-ekuru ume mgbe ọ na-ekwu okwu, ọ ga-abụrịrị na o siiri ya ike, fụọkwa ya ụfụ, ikwu okwu. N’agbanyeghị nke ahụ, obere oge tupu Jizọs anwụọ, o kwuru okwu gosiri na ọ hụrụ nne ya, bụ́ Meri, n’anya nke ukwuu. Jizọs hụrụ Meri na Jọn onyeozi ka ha guzo n’ebe na-adịghị anya. O wee gwa nne ya okwu n’olu dara ụda nke na ndị guzo n’akụkụ nụrụ ya. Ọ sịrị ya: “Nne, lee nwa gị!” Mgbe ahụ, ọ sịrị Jọn: “Lee nne gị!” (Jọn 19:26, 27) Jizọs maara na onyeozi a nke kwesịrị ntụkwasị obi ga-elekọta Meri, ọ bụghị naanị na ọ ga-egboro ya mkpa anụ ahụ́ ya, kamakwa, ọ ga-egboro ya mkpa ime mmụọ ya.b

Ihe Osise ndị dị na peeji nke 164 na 165

Ndị nne na nna ndị hụrụ ụmụ ha n’anya na-enwe ndidi, na-egbokwara ụmụ ha mkpa ha

10. Olee otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi ṅomie Jizọs ka ha na-egbo mkpa ụmụ ha?

10 Ndị nne na nna ndị hụrụ ụmụ ha n’anya maara na ọ bara uru ichebara ihe nlereanya Jizọs echiche. Nna nke hụrụ ezinụlọ ya n’anya n’ezie ga-egboro ha mkpa anụ ahụ́ ha. (1 Timoti 5:8) Ndị isi ezinụlọ ndị hụrụ ezinụlọ ha n’anya ma nwee uche ziri ezi na-ewepụta oge mgbe ụfọdụ ka ezinụlọ ha zurutụ ike, tụrụkwa ndụ. Karịsịa, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-egboro ụmụ ha mkpa ime mmụọ ha. Olee otú ha si eme nke a? Ha na-eme ndokwa maka inwechi ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ anya. Ha na-agbalịkwa ka ọmụmụ ihe a bụrụ nke na-ewuli ụmụ ha elu, na-atọkwa ha ụtọ. (Diuterọnọmi 6:6, 7) Site n’okwu ọnụ na n’omume, ndị mụrụ ụmụ na-akụziri ụmụ ha na ozi anyị bụ ọrụ dị mkpa, na-akụzikwara ha na ịkwadebe nzukọ Ndị Kraịst na ije nzukọ ndị ahụ so n’ihe dị mkpa n’ofufe anyị.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Ọ Na-adị Njikere Ịgbaghara Mmehie

11. Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya banyere ịgbaghara mmehie?

11 Ịgbaghara mmehie bụ otu n’ime ihe e ji mara ịhụnanya. (Ndị Kọlọsi 3:13, 14) E kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 13:5 na ịhụnanya ‘adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’ Ọtụtụ mgbe, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na ịgbaghara mmehie dị mkpa. Ọ gbara ha ume ka ha gbaghara ndị ọzọ, “ọ bụghị, Ruo ugboro asaa, kama, Ruo ugboro iri asaa na asaa”—ya bụ, n’akwụsịghị akwụsị. (Matiu 18:21, 22) Ọ kụziiri ha na e kwesịrị ịgbaghara onye mere mmehie ma ọ bụrụ na mgbe a baara ya mba, ya egosi na ya echegharịwo. (Luk 17:3, 4) Otú ọ dị, Jizọs adịghị ka ndị Farisii bụ́ ndị ihu abụọ, ndị na-akụzi ihe naanị n’ọnụ; ọ kụzikwara ihe site n’ihe nlereanya o setịpụrụ. (Matiu 23:2-4) Ka anyị hụ otú Jizọs si gosi na ya dị njikere ịgbaghara enyi ya ọ tụkwasịrị obi ọbụna mgbe o mere ihe wutere ya.

Ihe Osise juru ihu peeji dị na peeji nke 166

12, 13. (a) Olee otú Pita si mee ihe wutere Jizọs n’abalị ahụ e jidere Jizọs? (b) Olee otú ihe Jizọs mere mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ si mee ka o doo anya na ọ bụghị naanị n’ọnụ ka o kwusara banyere ịgbaghara mmehie?

12 Jizọs na Pita dị ná mma nke ukwuu. Pita bụ nwoke obiọma. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ihe n’echeghị echiche. Jizọs hụrụ àgwà ọma ndị Pita nwere ma nye ya ihe ùgwù ndị pụrụ iche. Pita na Jems na Jọn ji anya ha hụ ọrụ ebube ụfọdụ ndịozi itoolu ndị ọzọ na-ahụghị. (Matiu 17:1, 2; Luk 8:49-55) Dị ka anyị kwuru na mbụ, Pita bụ otu n’ime ndịozi ahụ so Jizọs bamikwuo n’ogige Getsemeni n’abalị ahụ e jidere Ya. Ma, n’otu abalị ahụ a raara Jizọs nye ma jide ya, Pita na ndịozi ndị ọzọ hapụrụ Jizọs gbaa ọsọ. E mesịa, Pita kara obi gaa guzoro n’èzí ka a na-ekpe Jizọs ikpe iwu na-akwadoghị. Ma, ụjọ mesịrị tụọ Pita, o wee mee mmehie dị oké njọ—ọ gọrọ agọ ugboro atọ sị na ya amatụdịghị onye Jizọs bụ! (Matiu 26:69-75) Olee ihe Jizọs mere? Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ezi enyi gị emee ihe wutere gị otú a?

13 Jizọs dị njikere ịgbaghara Pita. Ọ maara na mmehie ahụ Pita mere wutere Pita nke ukwuu. N’ezie, onyeozi ahụ nke chegharịrị echegharị ‘ejitelighị onwe ya, o wee malite ibe ákwá.’ (Mak 14:72) N’ụbọchị Jizọs bilitere n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Pita. Ma eleghị anya, Jizọs mere nke a iji kasie onyeozi a obi, meekwa ka obi sie ya ike. (Luk 24:34; 1 Ndị Kọrịnt 15:5) Mgbe ihe na-erughị ọnwa abụọ gasịrị, Jizọs nyere Pita ihe ùgwù site n’ikwe ka o bute ụzọ n’ikwusara ìgwè mmadụ ozi ọma na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst. (Ọrụ 2:14-40) Ka anyị chetakwa na Jizọs eburughị ndịozi ya niile iwe n’obi maka na ha hapụrụ ya gbaa ọsọ. Kama nke ahụ, ọ kpọrọ ha “ụmụnna m” mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. (Matiu 28:10) Ọ̀ bụ na o doghị anya na ọ bụghị naanị n’ọnụ ka Jizọs kwusara banyere ịgbaghara mmehie?

14. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụta ịgbaghara ndị ọzọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị dị njikere ịgbaghara?

14 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị kwesịrị ịmụta ịgbaghara ndị ọzọ. N’ihi gịnị? Anyị adịghị ka Jizọs. Anyị ezughị okè—otú ahụ ndị pụrụ imehie anyị na-ezughịkwa okè. Mgbe ụfọdụ, anyị niile na-asụ ngọngọ n’okwu nakwa n’omume. (Ndị Rom 3:23; Jems 3:2) Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ mgbe anyị kwesịrị ime otú ahụ, anyị na-eme ka Chineke gbaghara anyị mmehie nke anyị. (Mak 11:25) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị dị njikere ịgbaghara ndị mehiere anyị? Ọtụtụ mgbe, ịhụnanya na-enyere anyị aka ileghara mmehie na-adịghị oké njọ na adịghị ike nke ndị ọzọ anya. (1 Pita 4:8) Mgbe ndị mejọrọ anyị ji obi ha chegharịa, dị ka Pita chegharịrị, n’ezie, anyị kwesịrị iṅomi Jizọs n’ịdị njikere ịgbaghara ha. Kama ibu iwe n’obi, anyị ga-eji amamihe kpebie iwepụ iwe n’obi. (Ndị Efesọs 4:32) Site n’ime nke a, anyị na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ, na-emekwa ka anyị onwe anyị nwee udo nke uche na nke obi.—1 Pita 3:11.

O Gosiri na Ọ Tụkwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Ya Obi

15. Gịnị mere Jizọs ji tụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi n’agbanyeghị adịghị ike ha?

15 E nwere ihe jikọrọ ịhụ mmadụ n’anya na ịtụkwasị mmadụ obi. Ịhụnanya “na-ekwere ihe niile.”c (1 Ndị Kọrịnt 13:7) Ịhụnanya kpaliri Jizọs igosi na ọ dị njikere ịtụkwasị ndị na-eso ụzọ ya obi n’agbanyeghị na ha ezughị okè. O nwere obi ike n’ebe ha nọ, kwerekwa na, n’ime obi ha, ha hụrụ Jehova n’anya n’ezie, chọọkwa ime uche Ya. Ọbụna mgbe ha mehiere ihe, Jizọs echeghị na ha bu ihe ọjọọ n’obi. Dị ka ihe atụ, o doro anya na ndịozi bụ́ Jems na Jọn gwara nne ha ka ọ rịọ Jizọs ka ha nọrọ n’akụkụ ya n’Alaeze ya. Nke a emeghị ka Jizọs nwee obi abụọ ma hà ka guzosikwara ike n’ebe ọ nọ. Ọ chụpụghịkwa ha ka ha ghara ịbụkwa ndịozi.—Matiu 20:20-28.

16, 17. Olee ọrụ dị iche iche Jizọs nyefere ndị na-eso ụzọ ya?

16 Jizọs gosiri na ọ tụkwasịrị ndị na-eso ụzọ ya obi site n’inyefe ha ọrụ dị iche iche. Ugboro abụọ ọ rụrụ ọrụ ebube wee mee ka nri mụbaa ma nye ìgwè mmadụ ihe oriri, o nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikesara ndị ahụ nri. (Matiu 14:19; 15:36) Mgbe ọ na-akwadebe maka Ememme Ngabiga ikpeazụ ya, ọ gwara Pita na Jọn ka ha gaa Jeruselem kwadebe ihe. Ha hụrụ maka iweta nwa atụrụ, mmanya, achịcha na-ekoghị eko, akwụkwọ nri na-elu ilu, na ihe ọ bụla ọzọ dị mkpa. Ọrụ a abụghị ọrụ dị ala, n’ihi na ime Ememme Ngabiga n’ụzọ kwesịrị ekwesị bụ ihe Iwu Mozis kwuru ka e mee. Jizọs debekwara Iwu ahụ. Mgbe e mesịrị n’anyasị ahụ, Jizọs jikwa mmanya ahụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko mee ihe nnọchianya mgbe ọ na-ehiwe Ncheta ọnwụ ya.—Matiu 26:17-19; Luk 22:8, 13.

17 Jizọs hụrụ na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị inyefe ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ndị dị oké mkpa karị. Dị ka anyị kwuru na mbụ, o bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ụwa, bụ́ ndị e tere mmanụ, ka o nyefere ọrụ dị mkpa nke bụ́ ịkwadebe nri ime mmụọ, na ikesa ya. (Luk 12:42-44) Chetakwa na o nyefere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ dị mkpa nke bụ́ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ime ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 28:18-20) Ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ Jizọs anya, ọ bụkwa ezie na ọ nọ n’eluigwe na-achị, o nyefere ọgbakọ ya dị n’ụwa n’aka ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ.”—Ndị Efesọs 4:8, 11, 12.

18-20. (a) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị tụkwasịrị ndị kwere ekwe ibe anyị obi, nweekwa obi ike n’ebe ha nọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Jizọs n’ịdị njikere inye ndị ọzọ ọrụ? (ch) Gịnị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Asaa?

18 Olee otú anyị pụrụ isi soro ihe nlereanya Jizọs mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe? Ọ bụrụ na anyị tụkwasịrị ndị kwere ekwe ibe anyị obi, nweekwa obi ike n’ebe ha nọ, nke a na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya. Ka anyị cheta na ịhụnanya na-ele ndị mmadụ anya ọma, ọ naghị ele ha anya ọjọọ. Mgbe ndị ọzọ mere ihe wutere anyị, bụ́ nke na-aghaghị ime mgbe ụfọdụ, ịhụnanya ga-eme ka anyị ghara iche ngwa ngwa na ha bu ihe ọjọọ n’obi. (Matiu 7:1, 2) Ọ bụrụ na anyị na-ele ndị kwere ekwe ibe anyị anya ọma, anyị ga na-emeso ha ihe n’ụzọ ga-ewuli ha elu, ọ bụghị n’ụzọ ga-eme ka ha daa mbà n’obi.—1 Tesalonaịka 5:11.

19 Ànyị pụrụ iṅomi Jizọs n’ịdị njikere inye ndị ọzọ ọrụ? Ọ bara uru ka ndị nwere ọrụ n’ọgbakọ na-enyefe ndị ọzọ ọrụ kwesịrị ha na ọrụ ga-aba uru, ma nwee obi ike na ha ga-arụta ya. Ndị okenye ndị nwere ahụmahụ ga-esi otú a na-enye ụmụ okorobịa ruru eru ọzụzụ kwesịrị ekwesị, nke bakwara uru, ya bụ, ụmụ okorobịa ndị ‘na-agbalị ka ha ruo eru’ inye aka n’ọgbakọ. (1 Timoti 3:1; 2 Timoti 2:2) Ọzụzụ a dị mkpa. Ka Jehova na-eme ka a na-enwe mmụba n’ike n’ike n’ọrụ Alaeze a, ọ dị mkpa ka a na-azụ ndị ikom ruru eru bụ́ ndị ga-elekọta ndị a na-abata abata.—Aịzaya 60:22.

20 Jizọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya magburu onwe ya n’igosi ndị ọzọ ịhụnanya. N’ime ụzọ niile anyị pụrụ isi soro ya, iṅomi ịhụnanya ya bụ nke kasị mkpa. N’Isi nke Iri na Asaa, anyị ga-atụle ụzọ kasị mkpa o si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, ya bụ, nkweta o kwetara iji ndụ ya chụọ àjà.

a Ọ bụghị naanị ike ọgwụgwụ nkịtị mere ndịozi ahụ ji na-ehi ụra. Ebe e kwuru ihe yiri nke ahụ bụ na Luk 22:45. Amaokwu ahụ sịrị na Jizọs ‘hụrụ ka ha na-ero ụra n’ihi iru uju.’

b O yiri ka di Meri anwụọla mgbe ahụ. O dokwara anya na ụmụ ya ndị ọzọ abụbeghị ndị na-eso ụzọ Jizọs mgbe ahụ.—Jọn 7:5.

c Ma, nke a apụtaghị na a na-aghọgbu ịhụnanya ngwa ngwa. Kama nke ahụ, ihe ọ pụtara bụ na ịhụnanya adịghị akatọ mmadụ ma ọ bụ enyo mmadụ enyo karịa otú o kwesịrị. Ịhụnanya na-eme ka mmadụ ghara ịdị ngwa ikpebi ihe dị ndị ọzọ n’obi ma ọ bụ kwubie na ha bu ihe ọjọọ n’obi.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị gee ntị na ndụmọdụ Jizọs nyere banyere ịgbaghara mmehie?—Matiu 6:14, 15.

  • Olee otú anyị pụrụ isi na-eme isi ihe Jizọs kwuru n’ihe atụ o mere banyere mkpa ọ dị ka anyị na-agbaghara mmehie?—Matiu 18:23-35.

  • Olee otú Jizọs si chebara ndị na-eso ụzọ ya echiche, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya?—Matiu 20:17-19; Jọn 16:12.

  • Olee otú Jizọs si mee ka Pita mara na O nwere obi ike n’ebe ọ nọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere obi ike n’ebe ndị ọzọ nọ?—Luk 22:31, 32.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya