Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lv p. 218-p. 219 para. 1
  • Kwụsị Igbo Onwe Gị Agụụ Mmekọahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwụsị Igbo Onwe Gị Agụụ Mmekọahụ
  • “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú M Ga-esi Kwụsị Igbo Onwe M Agụụ Mmekọahụ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Àgwà A?
    Teta!—2007
  • Olee Otú M Ga-esi Eme Ka Mmekọahụ Pụọ M n’Obi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Olee Otú Anyị Ga-esi Dịrị Ọcha Otú Chineke Chọrọ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
lv p. 218-p. 219 para. 1

ISIOKWU NDỊ ỌZỌ

Kwụsị Igbo Onwe Gị Agụụ Mmekọahụ

Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ bụ àgwà na-adịghị Chineke mma. Ọ na-eme ka onye ahụ na-eche banyere naanị onwe ya nakwa ihe rụrụ arụ.a Onye ahụ nwere ike na-ele ndị ọzọ anya dị ka ihe e ji enwe mmekọahụ, ya bụ, ihe e ji egbo agụụ mmekọahụ. Ọ naghị ele mmekọahụ anya dị ka ihe di na nwunye ji egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya, kama ọ na-ele ya anya dị ka ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ nwa oge ma gboo agụụ mmekọahụ na-agụ ya mgbe ahụ. Ma agụụ ahụ ga-emecha gụwa ya. N’eziokwu, mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ anaghị eme ka akụkụ ahụ́ ya “nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ” na-ezighị ezi, kama ọ na-akpali ya akpali.—Ndị Kọlọsi 3:5.

Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ọ bụrụ na o siiri gị ike ime ihe ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru, ike agwụla gị. Jehova ‘dị njikere mgbe niile ịgbaghara’ gị ma nyere gị aka. (Abụ Ọma 86:5; Luk 11:9-13) N’ezie, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ị na-eme ya mgbe ụfọdụ, obi nke na-ama gị ikpe na mgbalị ị na-eme ịkwụsị omume ahụ na-egosi na ị chọrọ ime ihe ọma. Chetakwa na “Chineke karịrị obi anyị, marakwa ihe niile.” (1 Jọn 3:20) Ọ bụghị naanị mmehie anyị ka Chineke na-ahụ; ọ na-ahụ ihe niile banyere anyị. Ebe ọ ma ihe niile banyere anyị, ọ na-eji ọmịiko anụ arịrịọ anyị na-arịọsi ya ike ka o meere anyị ebere. N’ihi ya, adala mbà n’iji obi umeala na-ekpeku Chineke ekpere, dị ka nwatakịrị na-agakwuru nna ya mgbe o nwere nsogbu. Jehova ga-eme ka i nwee akọnuche dị ọcha. (Abụ Ọma 51:1-12, 17; Aịzaya 1:18) N’ezie, i kwesịrị ime ihe ahụ ị na-ekpe n’ekpere eme. Dị ka ihe atụ, ị ga-agbalịsi ike izere ihe ọ bụla na-akpali agụụ mmekọahụ nakwa ndị enyi ọjọọ.b

Ọ bụrụ na ọ dịrịghị gị mfe ịkwụsị igbo onwe gị agụụ mmekọahụ, biko kọọrọ nne gị ma ọ bụ nna gị bụ́ Onye Kraịst ma ọ bụkwanụ enyi gị hụrụ gị n’anya, nke ji ofufe Chineke kpọrọ ihe.c—Ilu 1:8, 9; 1 Ndị Tesalonaịka 5:14; Taịtọs 2:3-5.

a Mmadụ igbo onwe ya agụụ mmekọahụ bụ ịpịgharị ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị aka, nke na-emekarị ka ọ dị onye ahụ ka ọ̀ na-enwe mmekọahụ.

b Otu ihe dị mkpa ọtụtụ ezinụlọ na-eme iji hazie otú ha ga-esi na-achọ ihe na kọmputa dị n’ụlọ ha bụ idebe ya ebe mmadụ niile nọ n’ezinụlọ ga na-ahụ ya. Ihe ọzọ ezinụlọ ụfọdụ na-eme bụ ịzụ ihe omume kọmputa nke na-anaghị ekwe ka mmadụ mepee ebe na-adịghị mma. Ma, e nweghị nke a ga-atụkwasị obi kpamkpam.

c Ị chọọ ịmụtakwu otú ị ga-esi akwụsị igbo onwe gị agụụ mmekọahụ, gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, sị . . . Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Àgwà A?” dị na Teta! (Bekee) nke November 2006, nakwa peeji nke 178-182 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke 1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya