Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bt isi 15 p. 117-123
  • Ha Nọ “Na-eme Ka Ọgbakọ Ndị Dị Ebe Ahụ Sie Ike n’Okwukwe”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Nọ “Na-eme Ka Ọgbakọ Ndị Dị Ebe Ahụ Sie Ike n’Okwukwe”
  • ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Bịa Ka Anyị Gaa Leta Ụmụnna” (Ọrụ 15:36)
  • ‘Ha Sere Ezigbo Okwu’ (Ọrụ 15:37-41)
  • ‘Ụmụnna Nọ Na-ekwu Okwu Ọma Banyere Ya’ (Ọrụ 16:1-3)
  • “Ihe A Mere Ka Okwukwe Ndị Nọ n’Ọgbakọ Dị Iche Iche Sie Ike” (Ọrụ 16:4, 5)
  • “Nwa M M Hụrụ n’Anya nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Timoti—Dị Njikere, Nweekwa Mmasị Ije Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mak Onye ‘Bara Uru Maka Ije Ozi’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Timoti—“Ezi Nwa M n’Okwukwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
bt isi 15 p. 117-123

ISI NKE 15

Ha Nọ “Na-eme Ka Ọgbakọ Ndị Dị Ebe Ahụ Sie Ike n’Okwukwe”

Ndị ozi na-ejegharị ejegharị na-enyere ọgbakọ dị iche iche aka ka ha sie ike n’okwukwe

O Si n’Ọrụ Ndịozi 15:36–16:5

1-3. (a) Ònye ka ya na Pọl ga-esozi na-eleta ọgbakọ, oleekwa ụdị onye ọ bụ? (b) Gịnị ka anyị ga-amụta n’isiokwu a?

KA PỌL onyeozi na otu nwa okorobịa so na-aga n’okporo ụzọ ndị na-adịghị mma e nwere n’obodo ndị ha na-agafe, Pọl nọ na-ele nwa okorobịa ahụ anya. Aha ya bụ Timoti. Timoti bụ nwa okorobịa ume ka juru n’ahụ́, ọ ga-abụkwa na ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ. Ka ha ji nwayọọ nwayọọ na-aga, Listra na Aịkoniọm nọ na-adịkwu ezigbo anya n’ebe ha nọ. Olee ihe ga-eme na njem a? Pọl matụ, n’ihi na ihe a bụ nke ugboro abụọ ọ na-aga mba ọzọ ikwusa ozi ọma. Ọ ma na ha ga-enwe ọtụtụ nsogbu. Ma, olee ihe nwa okorobịa ahụ ya na ya so ga-eme ma nsogbu ndị ahụ bịa?

2 Pọl tụkwasịrị Timoti obi. O nwedịrị ike ịbụ na ọ tụkwasịrị nwa okorobịa a obi karịadị otú nwa okorobịa a dị umeala n’obi tụkwasịrị onwe ya. Ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya mere ka o dokwuo Pọl anya na ya kwesịrị inwe onye ihe na-adabara ya na ya ga-eso ya na-eleta ọgbakọ. Pọl ma na ọrụ ha na-aga ịrụ, ya bụ, ileta ọgbakọ na ime ka okwukwe ụmụnna sie ike, chọrọ ndị obi kara na ndị obi ha bụ otu. Ọ̀ ga-abụ gịnị mere Pọl ji chee otú ahụ? Otu ihe nwere ike ịkpata ya bụ nghọtahie ya na Banabas nwere nke mere ka ha kewaa.

3 N’isiokwu a, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere ụzọ kacha mma e si edozi esemokwu. Anyị ga-amatakwa ihe mere Pọl ji họrọ Timoti ka ya na ya na-aga eleta ọgbakọ, matakwa ọrụ dị mkpa ndị nlekọta sekit na-arụ n’oge a.

“Bịa Ka Anyị Gaa Leta Ụmụnna” (Ọrụ 15:36)

4. Gịnị ka Pọl bu n’obi ime na nke ugboro abụọ ọ na-aga mba ọzọ ikwusa ozi ọma?

4 N’Isi nke 14, anyị hụrụ otú ụmụnna anọ e dunyere ozi, ya bụ, Pọl, Banabas, Judas, na Saịlas, si jiri ihe òtù na-achị isi kpebiri banyere ibi úgwù gbaa ọgbakọ dị n’Antiọk ume. Gịnịzi ka Pọl mere? Ọ gwara Banabas ebe ọzọ ha ga-aga. Ọ sịrị: “Bịa ka anyị gaa leta ụmụnna nọ n’obodo ndị anyị kwusara okwu Jehova, ka anyị mara otú ha mere.” (Ọrụ 15:36) Ihe Pọl na-ekwu abụghị ịga leta ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ nleta nkịtị. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru ihe mere Pọl ji gaa njem nke abụọ ahụ. Nke mbụ bụ iji gwa ụmụnna ndị ahụ iwu dị iche iche òtù na-achị isi nyere. (Ọrụ 16:4) Nke abụọ bụ na ebe Pọl bụ onye ozi na-ejegharị ejegharị, o kpebisiri ike inyere ọgbakọ dị iche iche aka ka okwukwe ha sie ike. (Rom 1:11, 12) Olee otú ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke oge a si eme ihe ndịozi Jizọs mere?

5. Olee otú Òtù Na-achị Isi nke oge a si eduzi ọgbakọ niile ma na-agba ha ume?

5 Taa, Kraịst si n’aka Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eduzi ọgbakọ ya. Ụmụnna ndị a kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ na-eji akwụkwọ ozi, akwụkwọ ndị e biri ebi na ndị nke dị n’Ịntanet, ọmụmụ ihe, na ụzọ ndị ọzọ e si ezirịta ozi na-eduzi ọgbakọ niile e nwere n’ụwa ma na-agba ha ume. Òtù Na-achị Isi na-agbalịkwa ịma ihe na-eme n’ọgbakọ ọ bụla. Ọ bụ ya mere ha ji eziga ndị nlekọta sekit ka ha gaa leta ọgbakọ dị iche iche. Òtù Na-achị Isi ahọpụtala ọtụtụ puku ndị okenye ruru eru n’ụwa niile ka ha bụrụ ndị nlekọta sekit.

6, 7. Olee ụfọdụ ọrụ ndị nlekọta sekit na-arụ?

6 Ndị nlekọta sekit gaa ileta ọgbakọ, ha na-elekwasị anya n’inyere ụmụnna niile nọ n’ọgbakọ aka na ịgba ha ume. Olee otú ha si eme ya? Ọ bụ ịna-eme ihe Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ mere n’oge ndịozi. Pọl gbara onye nlekọta ibe ya ume, sị: “Kwusaa okwu Chineke. Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya ma n’oge dị mma ma n’oge nsogbu. Dọọ onye mejọrọ ihe aka ná ntị. Baara ya mba, gbaakwa ya ume. Na-enwe ndidi ka ị na-eme ihe ndị a, na-emekwa ha ka onye bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe. . . . Na-ezisa ozi ọma.”​—2 Tim. 4:2, 5.

7 Onye nlekọta sekit na nwunye ya, ma ọ bụrụ na ọ lụrụ nwaanyị, na-eme ihe a Pọl kwuru. Ọ na-eso ndị nkwusa ọgbakọ ọ gara ileta esi n’ụzọ dị iche iche ekwusa ozi ọma. Ndị nlekọta sekit na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma, na-ezikwa ihe nke ọma. N’ihi ya, ụmụnna na-amụta ihe n’aka ha. (Rom 12:11; 2 Tim. 2:15) Àgwà e ji mara ndị nlekọta sekit bụ na ha ji obi ha niile hụ ụmụnna ha n’anya. Ha na-eji oge ha na ume ha ejere ndị ọzọ ozi, na-aga eleta ọgbakọ ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ̀ na-acha, ma n’ebe ndị e nwere nsogbu. (Fil. 2:3, 4) Ndị nlekọta sekit na-ejikwa Baịbụl ekwu okwu na-agba ọgbakọ ume, na-ezi ha ihe ma na-adụ ha ọdụ. Ndị niile nọ n’ọgbakọ na-erite uru ka ha na-ahụ otú ndị nlekọta sekit si akpa àgwà, na-eṅomikwa okwukwe ha.​—Hib. 13:7.

‘Ha Sere Ezigbo Okwu’ (Ọrụ 15:37-41)

8. Gịnị ka Banabas mere mgbe Pọl gwara ya ka ha gaa leta ụmụnna ha?

8 Banabas kwetara iso Pọl gaa “leta ụmụnna” ha. (Ọrụ 15:36) Ha abụọ esorola gaa leta ọgbakọ dị iche iche, ha makwa ụmụnna nọ n’ọgbakọ ndị ahụ. (Ọrụ 13:2–14:28) N’ihi ya, o yiri ka ọ̀ dabara adaba ha abụọ iso gaa. Ma e nweziri ihe merenụ. Ọrụ Ndịozi 15:37 kwuru, sị: “Banabas chọrọ ka ha kpọrọ Jọn, onye a na-akpọkwa Mak, gawa.” Ọ bụghị aro ka Banabas na-atụ. Kama, ọ na-ekwu na ya “chọrọ” ka nwa nwanne ya bụ́ Mak soro ha.

9. Gịnị mere Pọl na Banabas ji nwee nghọtahie?

9 Ma, Pọl ekweghị ka Mak soro ha. N’ihi gịnị? Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Ma Pọl chere na [Mak ekwesịghị] isoro ha, ebe ọ bụ na ọ hapụrụ ha na Pamfilia, o soghịkwa ha gaa kwusaa ozi ọma.” (Ọrụ 15:38) Mak so Pọl na Banabas n’oge mbụ ha gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma. Ma, ọ hapụrụ ha n’ụzọ laa. (Ọrụ 12:25; 13:13) Mak hapụrụ ha na Pamfilia laghachi Jeruselem mgbe ha ka malitere ozi ha amalite. Baịbụl ekwughị ihe mere Mak ji laa, ma ọ ga-abụ na ihe a mere ka Pọl onyeozi were Mak ka onye na-anaghị eji ihe akpọrọ ihe. O nwere ike ịbụ na Pọl atụkwasịghịzi Mak obi.

10. Gịnị mere n’etiti Pọl na Banabas, gịnịkwa ka ọ kpatara?

10 Ma, Banabas siri ọnwụ na Mak ga-eso ha, Pọl ajụwapụkwanụ isi na ọ gaghị eso ha. Ọrụ Ndịozi 15:39 kwuru, sị: “Ha abụọ wee see ezigbo okwu, nke mere na ha kewara.” Banabas kpọọrọ Mak banye n’ụgbọ mmiri gawa obodo ya bụ́ agwaetiti Saịprọs, Pọl agawa ebe yanwa bu n’obi ịga. Ọrụ Ndịozi kwuru, sị: “Pọl kpọọrọ Saịlas. Mgbe ụmụnna kpechara ekpere ka Jehova meere Pọl amara, ọ gawara ebe ọzọ.” (Ọrụ 15:40) Ha abụọ “gawara Siria na Silishia, na-eme ka ọgbakọ ndị dị ebe ahụ sie ike n’okwukwe.”​—Ọrụ 15:41.

11. Ọ bụrụ na anyị na mmadụ esee okwu, olee àgwà ndị ga-eme ka anyị na ya kpezie?

11 Akụkọ a na-echetara anyị na anyịnwa ezughịkwa okè. A họpụtara Pọl na Banabas ịga nọchite anya òtù na-achị isi. Ọ dịkwa ka Pọl ò mechara soro n’òtù na-achị isi. N’agbanyeghị ya, ezughị okè mere ka Pọl na Banabas mee ihe ha na-ekwesịghị ime. Ma, hà kwere ka esemokwu a mee ka ha gharazie ịdị ná mma? N’agbanyeghị na Pọl na Banabas ezughị okè, ha dị umeala n’obi, na-agbalịkwa ime ka Jizọs. O doro anya na ha mechara kpaa àgwà ka Ndị Kraịst ma gbaghara ibe ha. (Efe. 4:1-3) Pọl na Mak mechara rụkọọ ọrụ ọnụ n’oge ndị ọzọ.a​—Kọl. 4:10.

12. Olee àgwà ndị e kwesịrị iji mara ndị okenye n’oge a bụ́ ndị e ji mara Pọl na Banabas?

12 Okwu ahụ Pọl na Banabas sere otu ugboro apụtaghị na ha bụ ndị okwu na ụka. A ma Banabas ama ka nwoke dị obiọma nke na-emesapụ aka. Ọ bụ ya mere ndịozi ji hapụ ịkpọ ya aha ya bụ́ Josef kpọwazie ya Banabas, nke pụtara “Nwa Nkasi Obi.” (Ọrụ 4:36) A makwa Pọl ka nwoke dị nwayọọ nke hụrụ ndị ọzọ n’anya. (1 Tesa. 2:7, 8) Ndị okenye niile, ma ndị nlekọta sekit, kwesịrị ịna-eme ka Pọl na Banabas. Ha kwesịrị ịgbalị na-adị umeala n’obi mgbe niile ma jiri obiọma na-emeso ndị okenye ibe ha na ìgwè atụrụ Chineke ihe.​—1 Pita 5:2, 3.

‘Ụmụnna Nọ Na-ekwu Okwu Ọma Banyere Ya’ (Ọrụ 16:1-3)

13, 14. (a) Ònye bụ Timoti, oleekwa otú ọ ga-abụ na Pọl si mata ya? (b) Gịnị mere Pọl ji nwee ezigbo mmasị n’ebe Timoti nọ? (ch) Olee ọrụ e nyere Timoti?

13 Na nke ugboro abụọ Pọl gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, o letara ọgbakọ ndị dị na Galeshia bụ́ ógbè ndị Rom na-achị. O “mechara ruo Dabe nakwa Listra.” Baịbụl kwuru, sị: “E nwekwara otu onye na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ, aha ya bụ Timoti. Nne ya bụ onye Juu, bụrụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs, ma nna ya bụ onye Grik.”​—Ọrụ 16:1.b

14 O nwere ike ịbụ na Pọl matara ezinụlọ Timoti mgbe mbụ ọ gara ebe ahụ n’ihe dị ka afọ 47 O.N.K. Mgbe afọ abụọ ma ọ bụ atọ gachara, Pọl gaghachiziri ebe ahụ. Ihe ọ hụrụ mere ka o nwee ezigbo mmasị n’ebe nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti nọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ‘ụmụnna nọ na-ekwu okwu ọma banyere’ Timoti. Ọ bụghị naanị na ụmụnna nọ n’obodo a mụrụ Timoti hụrụ ya n’anya, kama, o nwekwara aha ọma n’ọgbakọ ndị dị nso. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na ma ụmụnna nọ na Listra ma ndị nke nọ n’Aịkoniọm nọ na-ekwu okwu ọma banyere ya. Isi Listra gaa Aịkoniọm dị ihe dị ka kilomita iri atọ. (Ọrụ 16:2) Mmụọ nsọ mere ka ndị okenye nye Timoti nnukwu ọrụ ọ ga-arụ, ya bụ, iso Pọl na Saịlas na-aga eleta ọgbakọ.​—Ọrụ 16:3.

15, 16. Gịnị mere ụmụnna ji na-ekwu okwu ọma banyere Timoti?

15 Gịnị mere e ji na-ekwu okwu ọma banyere Timoti mgbe ọ ka bụ nwa okorobịa? Ọ̀ bụ maka na ụbụrụ na-aghọ ya nkọ, na ọ mara mma nwoke, ma ọ bụ nwee nkà dị iche iche? Ụdị ihe a na-amasịkarị ndị mmadụ. E nwedịrị mgbe otú mmadụ dị n’anya megharịrị Samuel onye amụma anya. Ma, Jehova gwara ya, sị: “Ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ. Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Sam. 16:7) Ihe mere ụmụnna Timoti ji na-ekwu okwu ọma banyere ya abụghị maka nkà ndị o nwere, kama ọ bụ n’ihi àgwà ọma ya.

16 Mgbe afọ ole na ole gachara, Pọl onyeozi kwuru gbasara ụfọdụ àgwà ọma ndị Timoti nwere. Pọl kọwara ụdị obi Timoti nwere, otú o si jiri obi ya niile hụ ndị ọzọ n’anya, nakwa otú o si arụsi ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ ike. (Fil. 2:20-22) Ihe ọzọ e ji mara Timoti bụ na o nwere “ezigbo okwukwe.”​—2 Tim. 1:5.

17. Olee otú ndị na-eto eto n’oge a si eme ka Timoti?

17 Taa, ọtụtụ ndị na-eto eto na-eme ka Timoti. Ha na-agbalị ka ha na-akpa ezigbo àgwà. Ha si otú a na-emere onwe ha ezigbo aha n’ebe Jehova na ndị na-efe ya nọ n’oge ha ka na-eto eto. (Ilu 22:1; 1 Tim. 4:15) Ha nwere ezigbo okwukwe. Ha anaghịkwa eme ihe ọjọọ ná nzuzo. (Ọma 26:4) Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị na-eto eto ji na-arụ ọrụ ndị dị mkpa n’ọgbakọ, otú Timoti rụrụ. N’eziokwu, ndị niile hụrụ Jehova n’anya na-enwe obi ụtọ ma ndị a na-eto eto ruo eruo ịbụ ndị nkwusa, nyefee Jehova onwe ha, meekwa baptizim.

“Ihe A Mere Ka Okwukwe Ndị Nọ n’Ọgbakọ Dị Iche Iche Sie Ike” (Ọrụ 16:4, 5)

18. (a) Olee ọrụ pụrụ iche Pọl na Timoti rụrụ mgbe ha gara leta ọgbakọ dị iche iche? (b) Olee uru ọgbakọ ndị ahụ ritere?

18 Pọl na Timoti rụkọrọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ. Ebe ha bụ ndị ozi na-ejegharị ejegharị, ha rụrụ ọrụ dị iche iche òtù na-achị isi gwara ha rụọ. Baịbụl kwuru, sị: “N’obodo ọ bụla ha gara, ha na-agwa ndị nọ ebe ahụ ihe ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem kpebiri ka ha na-eme.” (Ọrụ 16:4) O doro anya na ọgbakọ ndị ahụ mere ihe ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ha. Otú a ha si rube isi “mere ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche sie ike, ha ana-ehikwu nne kwa ụbọchị.”​—Ọrụ 16:5.

19, 20. Gịnị mere Ndị Kraịst kwesịrị iji na-erubere ‘ndị na-eduzi ha’ isi?

19 Taakwa, Ndịàmà Jehova na-erite uru maka na ha na-erubere ‘ndị na-eduzi ha’ isi ma na-edo onwe ha n’okpuru ha. (Hib. 13:17) Ebe ọ bụ na ihe ndị na-eme n’ụwa na-agbanwe agbanwe, Ndị Kraịst kwesịrị ịna-ege “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ntị ma na-eme ihe ha kwuru. (Mat. 24:45; 1 Kọr. 7:29-31) Ime otú ahụ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, meekwa ka ụwa a ghara imebi anyị.​—Jems 1:27.

20 N’eziokwu, ndị okenye e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst taa, ma ndị so n’Òtù Na-achị Isi, ezughị okè otú Pọl, Banabas, Mak, na ndị okenye ndị ọzọ e tere mmanụ n’oge ndịozi na-ezughị okè. (Rom 5:12; Jems 3:2) Ma, ndị so n’Òtù Na-achị Isi egosila na ha bụ ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ihi na ha na-esosi ihe Baịbụl kwuru ike, na-eṅomikwa ndịozi Jizọs. (2 Tim. 1:13, 14) Ihe a emeela ka okwukwe ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị iche iche na-esi ike, a na-agbakwa ha ume.

TIMOTI GBASIRI MBỌ IKE “N’IKWUSAKWURU NDỊ ỌZỌ OZI ỌMA”

Timoti nyeere Pọl onyeozi ezigbo aka. Pọl ejighịkwanụ ya egwu egwu. Mgbe ha abụọ jekọrọla ozi ruo ihe dị ka afọ iri na otu, Pọl dere banyere Timoti, sị: “Enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya. . . . Unu ma na o gosiri ụdị onye ọ bụ, na dị ka nwata ya na nna ya nọ, o so m gbasie mbọ ike n’ikwusakwuru ndị ọzọ ozi ọma.” (Fil. 2:20, 22) Timoti gbasiri mbọ ike n’ikwusa ozi ọma, nke mere ka Pọl hụ ya n’anya. Anyịnwa kwesịkwara ime ka ya.

Timoti.

Nna Timoti bụ onye Grik, nne ya abụrụ onye Juu. Ọ ga-abụ na Timoti toro na Listra. Nne ya bụ́ Yunis na nne nne ya bụ́ Lọịs kụziiri ya Akwụkwọ Nsọ malite mgbe ọ bụ nwata. (Ọrụ 16:1, 3; 2 Tim. 1:5; 3:14, 15) O nwere ike ịbụ na ha atọ ghọrọ Ndị Kraịst mgbe mbụ Pọl gara Listra.

Mgbe Pọl gaghachiri ebe ahụ mgbe afọ ole na ole gachara, ‘ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm kwuru okwu ọma banyere’ Timoti. O nwere ike ịbụ na Timoti dị ihe dị ka afọ iri abụọ mgbe ahụ. (Ọrụ 16:2) Mmụọ Chineke mere ka e buo “amụma” banyere nwa okorobịa ahụ. N’ihi ya, Pọl na ndị okenye ọgbakọ ahụ kpebiri inye Timoti ọrụ pụrụ iche. (1 Tim. 1:18; 4:14; 2 Tim. 1:6) Ya na Pọl ga-eso na-eje ozi ná mba ọzọ. Ọ pụtara na ọ ga-ahapụ ndị ezinụlọ ya, kwetakwa ka e bie ya úgwù ka ndị Juu ọ ga na-eleta ghara ịtamu ntamu.​—Ọrụ 16:3.

Timoti gara ọtụtụ ebe. Ya na Pọl na Saịlas so kwusaa ozi ọma na Filipaị, ya na Saịlas ekwusaa na Beria, naanị ya emechaa kwusaa na Tesalonaịka. Mgbe Timoti na Pọl hụrụ ọzọ na Kọrịnt, ọ kọọrọ Pọl akụkọ ọma banyere otú ndị Tesalonaịka si hụ ndị ọzọ n’anya na otú ha si tụkwasị Chineke obi n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu ha. (Ọrụ 16:6–17:14; 1 Tesa. 3:2-6) Mgbe Pọl nọ n’Efesọs nata ozi na-agbawa obi banyere ndị Kọrịnt, o chewere echiche izighachi Timoti Kọrịnt. (1 Kọr. 4:17) Pọl mechara si n’Efesọs ziga Timoti na Erastọs Masedonia. Ma mgbe Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ, Timoti alaghachikwurula ya na Kọrịnt. (Ọrụ 19:22; Rom 16:21) Ebe ndị a bụ naanị ebe ole na ole n’ime ọtụtụ ebe Timoti gara kwusaa ozi ọma.

Pọl gbara Timoti ume, sị: “Emela ihe ga-eme ka onye ọ bụla lelịa gị anya maka na ị bụ nwata.” (1 Tim. 4:12) Ihe a Pọl kwuru gosiri na ọ ga-abụ na obi akachaghị Timoti ịrụ ọrụ e nyere ya. Ma obi siri Pọl ike, ya eziga Timoti n’ọgbakọ nwere nsogbu. Ọ gwara ya, sị: “Gwasie ụfọdụ ndị ike ka ha ghara izi ozizi dị iche.” (1 Tim. 1:3) Pọl nyekwara Timoti ikike ịhọpụta ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.​—1 Tim. 5:22.

Àgwà ọma Timoti mere ka Pọl hụ ya n’anya. Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ bụ ezigbo enyi Pọl, onye ọ tụkwasịrị obi, na onye ọ hụrụ n’anya. Pọl weere ya ka nwa ya. Pọl dere na ya na-echeta anya mmiri Timoti, na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ ya, nakwa na ya na-echeta ya n’ekpere. Dị ka nna hụrụ nwa ya n’anya, Pọl gwakwara Timoti ihe ọ ga na-eme maka ‘ọrịa ọ na-arịakarị.’ O nwere ike ịbụ ọrịa afọ.​—1 Tim. 5:23; 2 Tim. 1:3, 4.

Timoti na Pọl nọ mgbe mbụ a tụrụ Pọl mkpọrọ na Rom. E nwekwara oge a tụrụ Timoti mkpọrọ. (Faị. 1; Hib. 13:23) Ihe na-egosi otú mmadụ abụọ a si hụ ibe ha n’anya bụ ihe Pọl mere mgbe ọ matara na ya agala ịnwụ. O degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị ya: “Gbalịsie ike ka ị bịa hụ m ngwa ngwa.” (2 Tim. 4:6-9) Ma Akwụkwọ Nsọ ekwughị ma Timoti ọ̀ gara hụ ezigbo enyi ya a na-akụziri ya ihe tupu ya anwụọ.

MAK RỤRỤ ỌTỤTỤ ỌRỤ PỤRỤ ICHE

Ozi Ọma Mak kwuru na ndị jidere Jizọs gbalịkwara ijide “otu nwa okorobịa.” Ma, ọ hapụrụ uwe ya, “gbara ahụ́ ọtọ gbalaga.” (Mak 14:51, 52) Ebe ọ bụ naanị Mak, onye a na-akpọkwa Jọn Mak, dere akụkọ a, ọ ga-abụ ya bụ nwa okorobịa ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ ya, ọ pụtara na e nwere mgbe ya na Jizọs nọrọ.

Ebe Mak na-ege ntị ma na-edetu ihe ka nwanna merela okenye na-ekwu okwu.

Ka ihe dị ka afọ iri na otu gachara, mgbe Herọd Agrịpa na-akpagbu Ndị Kraịst, “ọtụtụ” ndị nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem zukọtara n’ụlọ Meri, nne Mak, ikpe ekpere. Ọ bụ n’ụlọ ha ka Pita onyeozi gawara mgbe mmụọ ozi kpọpụtara ya n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 12:12) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ụlọ a nọ zụọ Mak mechara bụrụ ebe Ndị Kraịst na-anọ amụ ihe. O yikwara ka ọ̀ ma ndị mbụ soro ụzọ Jizọs nke ọma, ha enyekwara ya ezigbo aka.

Mak na ọtụtụ ndị okenye e nwere n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi rụkọrọ ọrụ. Ọrụ mbụ anyị ma na ọ rụrụ bụ na o so Banabas bụ́ nwa nwanne mama ya nakwa Pọl onyeozi jee ozi n’Antiọk dị na Siria. (Ọrụ 12:25) Mak so Banabas na Pọl n’oge mbụ ha gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma. Ebe mbụ ha gara bụ Saịprọs, ha emechaa gaa Eshia Maịnọ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Mak hapụrụ ha laghachi Jeruselem, ma anyị amaghị ihe mere o ji hapụ ha. (Ọrụ 13:4, 13) Ọrụ Ndịozi isi 15 kwuru na mgbe Banabas na Pọl sechara okwu n’ihi Mak, Mak na Banabas gawara Saịprọs ikwusa ozi ọma.​—Ọrụ 15:36-39.

Mgbe ọ na-erula afọ 60 O.N.K. ma ọ bụ afọ 61 O.N.K., Mak na Pọl ebidokwala ijekọ ozi. Ọ ga-abụ na ha echefuchaala okwu ahụ ha sere. Ọ bụzi na Rom ka ha nọ na-eje ozi. Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ n’obodo ahụ, o degaara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ, sị: “Arịstakọs, onye mkpọrọ ibe m, na-ekele unu. Mak, nwa nwanne Banabas, na-ekelekwa unu. (Mak a bụ onye m gwara unu ka unu nabata ma ọ bịa ịhụ unu).” (Kọl. 4:10) N’ihi ya, Pọl chọrọ isi Rom ziga Jọn Mak Kọlọsi ka ọ gaa nọchite anya ya.

Mak na Pita onyeozi so jee ozi na Babịlọn n’agbata afọ 62 O.N.K. na 64 O.N.K. Ihe e kwuru n’Isi nke 10 n’akwụkwọ a gosiri na ha abụọ dị n’ezigbo mma. Pita kpọdịrị nwa okorobịa a “Mak nwa m.”​—1 Pita 5:13.

N’ikpeazụ, n’ihe dị ka afọ 65 O.N.K., mgbe a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ nke ugboro abụọ na Rom, o degaara Timoti, bụ́ onye ọrụ ibe ya nọ n’Efesọs, akwụkwọ, sị: “Gị na Mak soro bịa, n’ihi na ọ ga-enyere m aka n’ozi m na-ejere Chineke.” (2 Tim. 4:11) Ọ ga-abụ na ozugbo Mak nụrụ ozi a, o mere ngwa ngwa si Efesọs laghachi Rom. Ọ bụ ihe a mere Banabas, Pọl, na Pita ejighị Mak egwu egwu.

Ọrụ kacha pụọ iche Mak rụrụ bụ isi n’ike mmụọ nsọ Jehova dee Ozi Ọma Mak. Akụkọ mgbe ochie gosiri na ọ bụ Pita onyeozi kọọrọ Mak ọtụtụ n’ime ihe ndị o dere. O yiri ka ọ̀ bụ eziokwu n’ihi na ọtụtụ ihe Mak kọrọ bụ ihe naanị onye ji anya ya hụ ihe ndị merenụ, otú ahụ Pita hụrụ, ga-akọli. Ma, ọ dị ka Mak ò dere Ozi Ọma ya na Rom, ọ bụghị mgbe ya na Pita nọ na Babịlọn. Mak dere ọtụtụ okwu Latịn n’Ozi Ọma ya ma sụgharịa ụfọdụ okwu Hibru nwere ike isiri ndị na-abụghị ndị Juu ike nghọta. N’ihi ya, o yiri ka ọ̀ bụ ndị Jentaịl ka o bu n’obi dee Ozi Ọma ya.

a Gụọ igbe bụ́ “Mak Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Pụrụ Iche.”

b Gụọ igbe bụ́ “Timoti Gbasiri Mbọ Ike ‘n’Ikwusakwuru Ndị Ọzọ Ozi Ọma.’”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya