Abụ nke 69
Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
Nke E Biri Ebi
1. Anyị ezukọọla, Jehova, Chineke,
Ịza òkù nke ị kpọr’anyị.
Okwu gị bụ ìhè dị n’okpor’ụzọ anyị.
Ọ bụ eb’i si ezi any’ihe.
(KORỌS)
Zi m ụzọ gị, meekwa ka m ghọta ya;
Ka m gee ntị n’iwu amamihe gị.
Mee ka m je’ije n’ụzọ eziokwu gị,
Meekwa ka iwu gị n’atọ m ụtọ.
2. Amamihe gị dị ok’elu, Chineke;
Ikpe gị n’enye ezi ob’ike.
Ruo ebigh’ebi, Okwu gị dị ebube;
Eziokwu gị n’adịgidekwa.
(KORỌS)
Zi m ụzọ gị, meekwa ka m ghọta ya;
Ka m gee ntị n’iwu amamihe gị.
Mee ka m je’ije n’ụzọ eziokwu gị,
Meekwa ka iwu gị n’atọ m ụtọ.