Nkebi nke 3
Ụmụ Mmadụ Lanahụrụ Iju Mmiri
Chineke bibiri ụwa ọjọọ ma chebe Noa na ezinụlọ ya
KA ỤMỤ mmadụ na-amụba, mmehie na ihe ọjọọ mụbara ngwa ngwa n’ụwa. Inọk bụ naanị onye amụma e nwere n’oge ahụ. Ọ dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na otu ụbọchị, Chineke ga-egbu ndị ajọ omume. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ọjọọ mụbara, kadị njọ. Ndị mmụọ ozi ụfọdụ nupụụrụ Jehova isi, hapụ eluigwe bụ́ ebe ha kwesịrị ibi, dịrị ka ụmụ mmadụ n’ụwa ma lụrụ ụmụ nwaanyị n’ihi anyaukwu. Ndị mmụọ ozi ahụ na ndị nwunye ha mụtara ụmụ gbara ajọ dimkpa, bụ́ ndị a kpọrọ ndị Nefilim, ndị mere ka ime ihe ike na mwụfu ọbara jupụta n’ụwa. O wutere Chineke ịhụ ka a na-emebi ihe ndị o kere n’ụwa.
Mgbe Inọk nwụchara, e nwere otu nwoke na-esoghị mee ihe ọjọọ n’oge ahụ ndị ajọ omume juru n’ụwa. Aha ya bụ Noa. Ya na ezinụlọ ya mere ihe dị Chineke mma. Mgbe Chineke kpebiri igbu ndị na-eme ihe ọjọọ n’oge ahụ, ọ chọrọ ichebe Noa na ụmụ anụmanụ nọ n’ụwa. N’ihi ya, ọ gwara Noa ka ọ rụọ ụgbọ nke yiri nnukwu igbe. Ọ bụ ya ka a ga-eji chebe Noa na ezinụlọ ya na ụdị anụmanụ dị iche iche, mgbe a ga-enwe iju mmiri zuru ụwa ọnụ. Noa rubeere Chineke isi. Ọ nọkwa “na-ekwusa ezi omume” n’ime afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise o ji rụọ ụgbọ ahụ. (2 Pita 2:5) Ọ dọrọ ndị mmadụ aka ná ntị na Iju Mmiri na-abịa, ma ha aṅaghị ya ntị. Mgbe oge ruru, Noa na ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ banyere n’ụgbọ ahụ, Chineke emechie ya. Mmiri malitere izo.
Mmiri ahụ zosiri ike ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, ruo mgbe o kp̣uchiri ụwa niile. Ndị ọjọọ anọghịzi. Mgbe ọnwa ụfọdụ gachara, mmiri ahụ talatara, ụgbọ ahụ akwụsị n’otu ugwu. Noa na ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ nọrọ otu afọ n’ime ụgbọ ahụ tupu ha apụta. Mgbe ha pụtara, Noa chụụrụ Jehova àjà iji kelee ya. Chineke nabatara àjà ahụ ma gwa Noa na ezinụlọ ya na ya agaghị eji iju mmiri gbuo ihe niile dị ndụ n’ụwa ọzọ. Jehova wepụtara eke na egwurugwu iji gosi na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. Ọ bụ ya ka a ga-eji na-echeta nkwa ọma ahụ o kwere.
Mgbe iju mmiri ahụ gachara, Chineke nyekwara ụmụ mmadụ iwu ọhụrụ ụfọdụ. O kwere ka ha na-eri anụ ụmụ anụmanụ. Ma, ọ sịrị ha erila ọbara. O nyekwara ụmụ Noa iwu ka ha gbasaa n’ụwa, ma ụfọdụ n’ime ha nupụrụ isi. Nimrọd kpọkọtara ndị mmadụ, ghọọrọ ha onyeisi. Ha malitere ịrụ otu nnukwu ụlọ elu n’obodo Bebel, nke e mechara kpọwa Babịlọn. Ihe mere ha ji na-arụ ya bụ ka ha ghara ịgbasa n’ụwa niile dị ka Chineke nyere ha iwu ka ha gbasaa. Ma Chineke ekweghị ha mezuo ihe ha bu n’obi. Ọ ghagburu asụsụ ha ma mee ka ha na-asụ asụsụ dị iche iche. Ebe ọ bụ na ha enweghịzi ike ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, ha hapụrụ ụlọ ahụ ha na-arụ ma gbasaa.
—O si na Jenesis isi nke 6 ruo na nke 11; Jud 14, 15.
◼ Olee otú ihe ọjọọ si gbasaa n’ụwa?
◼ Olee otú Noa si gosi na ya bụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi?
◼ Olee ihe Chineke gwara ụmụ mmadụ erila mgbe iju mmiri ahụ gachara?
Igbe dị na peeji nke 6]
ISO CHINEKE NA-EJE IJE
Ọtụtụ n’ime ụmụ Adam na Iv ekweghị ka Jehova chịa ha. Ma, ụfọdụ n’ime ha kwere. Onye mbụ mere otú ahụ bụ nwa Adam na Iv bụ́ Ebel. O kwesịrị ntụkwasị obi. E mechara kwuo na ma Inọk ma Noa so Chineke jee ije, ya bụ, ha mere ihe Jehova chọrọ. (Jenesis 5:22; 6:9) Ndị a kacha kọọ akụkọ ha na Baịbụl bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị kwekwara ka Chineke chịa ha.
[Chaatị dị na peeji nke 6]
● Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti