Nkebi nke 4
Chineke na Ebreham Gbara Ndụ
Ebreham ji okwukwe rubere Chineke isi, Jehova kwekwara nkwa ịgọzi ya na ime ka ụmụ ya mụbaa
MGBE ihe dị ka narị afọ atọ na iri ise gafere kemgbe e nwechara Iju Mmiri ahụ n’ụbọchị Noa, nna ochie ahụ bụ́ Ebreham bi n’obodo Ọọ nke bara ọgaranya, n’ebe a na-akpọ Ịrak ugbu a. Ebreham nwere okwukwe na-enweghị atụ. Ma e lere okwukwe ya ule.
Jehova gwara Ebreham ka ọ hapụ obodo ya ma gaa obodo ọzọ, nke bụ́ Kenan. Ebreham kwetara ozugbo. Ọ kpọọrọ mmadụ niile nọ n’ụlọ ya, ma nwunye ya bụ́ Sera ma nwa nwanne ya bụ́ Lọt, mee ogologo njem ma na-ebi n’ụlọikwuu n’ala Kenan. Mgbe Jehova na Ebreham gbara ndụ, o kwere Ebreham nkwa na ya ga-eme ka ọ ghọọ mba ukwu, na a ga-esi n’aka Ebreham gọzie ezinụlọ niile nke ụwa nakwa na ya ga-enye ụmụ ya ala Kenan.
Ebreham na Lọt bara ọgaranya, nwee ìgwè ehi na atụrụ. Ebreham achọghị naanị ọdịmma onwe ya. Ọ gwara Lọt ka ọ họrọ ala ọ bụla dị ya mma. Lọt họọrọ ala na-eme nri nke dị gburugburu Osimiri Jọdan, ma biri nso n’obodo Sọdọm. Ma ndị Sọdọm na-eme omume rụrụ arụ, ha na-eme mmehie dị oké njọ n’anya Jehova.
Jehova Chineke mechara mee ka obi sie Ebreham ike na ụmụ ya ga-adị ọtụtụ ka kpakpando dị n’eluigwe. Ebreham nwere okwukwe ná nkwa ahụ Chineke kwere ya. Ma, nwunye Ebreham ọ hụrụ n’anya bụ́ Sera amụtabeghị nwa. Ya mere, mgbe Ebreham dị iri afọ itoolu na itoolu, ya afọkwa obere ka Sera ruo iri afọ itoolu, Chineke gwara Ebreham na ya na Sera ga-amụ nwa nwoke. Sera mụrụ Aịzik otú ahụ Chineke kwuru. Ebreham mụrụ ụmụ ndị ọzọ, ma ọ bụ n’Aịzik ka a ga-esi nweta Onye Nnapụta ahụ e kwere nkwa ya n’Iden.
N’oge ahụ, Lọt na ezinụlọ ya bi na Sọdọm. Ma Lọt bụ onye ezi omume, ọ kpaghị àgwà ka ndị bi na Sọdọm, bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ. Mgbe Jehova kpebiri ibibi Sọdọm, o bu ụzọ dunye ndị mmụọ ozi ka ha gaa gwa Lọt ihe ọ chọrọ ime. Ndị mmụọ ozi ahụ gwara Lọt na ezinụlọ ya ka ha si na Sọdọm gbapụ nakwa ka ha ghara ile anya n’azụ. Chineke mere ka ọkụ na sọlfọ zokwasị Sọdọm na obodo ọjọọ dị ya nso bụ́ Gọmọra, gbuo ndị niile bi na ha. Lọt na ụmụ ya nwaanyị abụọ lanahụrụ. Ma nwunye Lọt lere anya n’azụ, ikekwe ihe ndị ọ hapụrụ dọrọ ya akpịrị. Ọ nwụrụ n’ihi isi ahụ o nupụrụ.
—O si na Jenesis 11:10–19:38.
◼ Gịnị mere Ebreham ji kwaga Kenan?
◼ Olee ndụ Jehova na Ebreham gbara?
◼ Gịnị mere Jehova ji bibie Sọdọm na Gọmọra?
Igbe dị na peeji nke 7]
CHINEKE NKE ỌGBỤGBA NDỤ
N’oge Baịbụl, ọgbụgba ndụ bụ nkwekọrịta. Nwayọọ nwayọọ, Jehova ji ọgbụgba ndụ dị iche iche mee ka a mata otú ọ ga-esi emezu nkwa ahụ o kwere n’Iden banyere Onye Nnapụta. Ndụ ya na Ebreham gbara gosiri na Onye ahụ e kwere ná nkwa ga-esi n’agbụrụ Ebreham. Ọgbụgba ndụ ndị ọzọ ga-eme ka a matakwuo Onye ọ ga-abụ.
[Chaatị dị na peeji nke 7]
Jenesis ●
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe