Nkebi nke 5
Chineke Gọziri Ebreham na Ezinụlọ Ya
Ihe gaziiri ụmụ Ebreham. Chineke chebere Josef n’Ijipt
JEHOVA ma na otu ụbọchị, Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya ga-ata ahụhụ ma nwụọ. Amụma ahụ e dere na Jenesis 3:15 kwutetụrụ banyere ya. Chineke ò nwere ike ime ka ụmụ mmadụ mata otú ọnwụ Ọkpara ya ga-esi ewute ya? Baịbụl ji ihe mere otu nwoke na nwa ya mee ihe atụ. Chineke gwara Ebreham ka o were Aịzik bụ́ nwa ya ọ hụrụ n’anya chụọrọ ya àjà.
Ebreham nwere okwukwe dị ukwuu. Cheta na Chineke ekwela ya nkwa na a ga-esi n’agbụrụ Aịzik nweta Onye Nnapụta ma ọ bụ Mkpụrụ ahụ e buru n’amụma. Ebreham tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-akpọlite Aịzik n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. N’ihi ya, o rubere isi, chọọ iji nwa ya chụọ àjà. Ma tupu Ebreham emee otú ahụ, mmụọ ozi Chineke gbochiri ya. Chineke jara Ebreham mma maka ịchọ iji onye ọ kacha hụ n’anya chụọrọ ya àjà, ma kwughachi nkwa ndị ahụ O kwere nna ochie ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.
Aịzik mechara mụta ụmụ nwoke abụọ, bụ́ Isọ na Jekọb. Jekọb adịghị ka Isọ. O ji ihe dị nsọ kpọrọ ihe, Chineke gọzikwara ya. Ọ gbanwere aha ya ka ọ bụrụ Izrel. Ụmụ nwoke iri na abụọ Izrel mụtara ghọrọ ndị isi nke ebo niile dị n’Izrel. Ma olee otú ezinụlọ ahụ si ghọọ mba ukwu?
Ọtụtụ ihe malitere ime mgbe ọtụtụ n’ime ụmụ Jekọb nweweere nwanne ha nke nta bụ́ Josef anyaụfụ. Ha rere ya ka ọ gaa gbawa ohu, a kpọga ya Ijipt. Ma Chineke gọziri nwa okorobịa ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke na-anaghị atụ ụjọ. N’agbanyeghị anya niile Josef hụsiri, Fero, bụ́ onye na-achị Ijipt, họọrọ ya ma mee ya onyeisi. Ihe ahụ mere n’oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụnwụ mere ka Jekọb ziga ụmụ ya ụfọdụ Ijipt ịga zụta nri. N’oge ahụ, ọ bụ Josef na-elekọta nri n’obodo ahụ! Mgbe Josef na ụmụnne ya chegharịrịlanụ makụchara, kwaakwa ákwá, ọ gbaghaara ha ma gwa ha ka ha gaa kpọta ezinụlọ Jekọb niile ka ha bịa biri n’Ijipt. E nyere ha ezigbo ala, bụ́ ebe ha ga-anọ na-amụba ma na-enwe ọganihu. Josef ghọtara na Chineke kwere ka ọ dị otú ahụ iji mezuo nkwa ndị O kwere.
Jekọb karala nká na ezinụlọ ya na-amụba amụba bịara biri n’Ijipt. Ọ bụzi ebe ahụ ka o bi ruo mgbe ọ nwụrụ. N’oge ọ na-achọ ịnwụ, o buru amụma na Mkpụrụ ma ọ bụ Onye Nnapụta ahụ e kwere ná nkwa ga-abụ Onye Ọchịchị dị ike nke ga-esi n’agbụrụ nwa ya nwoke bụ́ Juda. Tupu Josef anwụọ mgbe ọtụtụ afọ gachara, o buru amụma na otu ụbọchị, Chineke ga-akpọpụta ezinụlọ Jekọb n’Ijipt.
—O si na Jenesis isi nke 20 ruo na nke 50; Ndị Hibru 11:17-22.
◼ Gịnị ka Chineke gwara Ebreham ka o mee, oleekwa ihe o ji ya mee ka ndị mmadụ mata?
◼ Olee otú Josef si gaa Ijipt, oleekwa ihe si na ya pụta?
◼ Olee ihe Jekọb buru n’amụma tupu ya anwụọ?
Igbe dị na peeji nke 8]
● Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe