Nkebi nke 6
Job Nọgidere Na-eme Ihe Ziri Ezi
Setan kwuru na Job ejighị obi ya dum eme ihe ziri ezi n’anya Chineke, ma Job nọgidere na-efe Jehova
Ọ̀ DỊ mmadụ ọ bụla ga-anọgide na-efe Chineke ma ọ bụrụ na ọnwụnwa siri ike abịara ya nakwa ma ọ bụrụ na o yie ka e nweghị uru ọ na-erite n’irubere Chineke isi? A jụrụ ajụjụ ahụ, zaakwa ya n’akụkọ banyere otu nwoke aha ya bụ Job.
Mgbe ụmụ Izrel ka nọ n’Ijipt, Job, bụ́ onye ikwu Ebreham, bi n’ebe a na-akpọ Arebia ugbu a. N’oge ahụ, ndị mmụọ ozi zukọtara n’ihu Chineke, Setan bụ́ onye nnupụisi sokwa ha zukọọ. Jehova nọ n’ihu ndị mmụọ ozi ya kwuo na ya tụkwasịrị ezigbo ohu ya bụ́ Job obi. N’eziokwu, Jehova kwuru na e nweghị mmadụ ọ bụla ọzọ na-eme ihe ziri ezi ka Job. Ma Setan kwuru na naanị ihe mere Job ji na-efe Chineke bụ na Chineke gọziri ya ma na-echebe ya. Ihe Setan na-ekwu bụ na ọ bụrụ na Chineke anapụ Job ihe niile o nwere, Job ga-akọcha Chineke.
Chineke kwere ka Setan buru ụzọ bibie akụnụba Job, gbuo ụmụ ya, ma mechaa mee ka ọ daa ọrịa. Ebe ọ bụ na Job aghọtaghị na aka Setan dị n’ihe niile na-eme ya, ọ maghị ihe mere Chineke ji kwe ka ọnwụnwa ahụ niile bịara ya. Ma, ọ dịghị mgbe Job gbakụtara Chineke azụ.
E nwere ndị enyi adịgboroja atọ bịakwutere Job. Ha kwuru ogologo okwu ndị e dere n’akwụkwọ Job. Ha gbalịrị ime ka Job kweta na ọ bụ n’ihi mmehie ndị o mere na nzuzo ka Chineke ji ata ya ahụhụ. Ha kwudịrị na Chineke enweghị mmasị ná ndị ohu ya nakwa na ọ tụkwasịghị ha obi. Job ekwetaghị ihe ndị ahụ na-ezighị ezi ha kwuru. O ji obi ike kwuo na ya ga na-eme ihe ziri ezi ruo mgbe ya nwụrụ!
Ma e nwere ihe Job mejọrọ. Ihe bụ́ mkpa ya bụ igosi na ya bụ onye ezi omume. Mgbe Elaịhu, bụ́ onye kacha bụrụ nwata, nụchara ihe Job na ndị enyi adịgboroja ya kwuru, o kwuru okwu. Elaịhu baara Job mba maka na Job aghọtaghị na ibuli ọkaakaa Jehova Chineke elu dị mkpa karịa ibuli mmadụ ọ bụla elu. Ọ basikwaara ndị ahụ sịrị na ha bụ ndị enyi Job mba ike.
Jehova Chineke gwaziri Job okwu iji gbazie echiche ya. Jehova gwara ya banyere ihe ndị dị ebube o kere, si otú ahụ mee ka Job ghọta na o nweghị ihe mmadụ bụ ma e jiri ya tụnyere ịdị ukwuu Chineke. Job ji obi umeala nabata ihe ahụ Chineke gwara ya. Ebe ọ bụ na Jehova “nwere obi ọmịiko dị ukwuu,” ọ gwọrọ Job ọrịa ya, nyeghachi ya akụnụba ya okpukpu abụọ, ma jiri ụmụ iri gọzie ya. (Jems 5:11) Mgbe a na-anwa Job, ọ nọgidere na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova, si otú ahụ mee ka a mata na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha, nke bụ́ na ụmụ mmadụ agaghị erubere Chineke isi ma ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara ha.
—O si n’akwụkwọ Job.
◼ Olee ebubo Setan boro ụmụ mmadụ n’ihe banyere Job?
◼ Gịnị ka isi Job rubeere Jehova mere ka a mata?
Igbe dị na peeji nke 9]
IHE ISEOKWU DỊ MKPA
Mgbe Setan kwuru na Job, bụ́ nwoke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta na onye kacha na-atụ egwu Chineke n’ụwa n’oge ahụ, na-ejere Jehova Chineke ozi n’ihi ọdịmma onwe ya naanị, ihe ọ na-ekwu bụ na ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi n’ihi ọdịmma onwe ha naanị. Setan si otú ahụ kwuo na mmadụ enweghị ike iji obi ya dum na-erubere Jehova isi. Nke a so n’ihe iseokwu ahụ Setan welitere n’Iden, nke bụ́ ma ọ̀ bụ Jehova kwesịrị ịchị nakwa ma ọ̀ na-achị n’ụzọ ziri ezi. Akwụkwọ Job gosiri na ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi nwere ike iso gosi na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, ma ọ bụrụ na ha anọgide na-erubere ya isi.
[Chaatị dị na peeji nke 9]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job ●
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe