Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 9 p. 103-113
  • ‘Achọrọla Onwe Gị Ihe Ukwu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Achọrọla Onwe Gị Ihe Ukwu’
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE “IHE UKWU” NDỊ BARỌK NA-ACHỌ?
  • “M GA-ENYE GỊ MKPỤRỤ OBI GỊ KA Ọ BỤỤRỤ GỊ IHE NKWATA”
  • Ị̀ GA-ACHỌ “IHE UKWU”?
  • “IHE DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA” NWERE IKE ỊGHỌ ỌNYÀ
  • Ị̀ GA-ENWETA “MKPỤRỤ OBI GỊ KA Ọ BỤỤRỤ GỊ IHE NKWATA”?
  • Beruk Odeakwụkwọ Jeremaịa nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Jehova Na-enyocha Anyị Maka Ọdịmma Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mee Ka Gị na Ụmụnna Gị Dịkwuo ná Mma Tupu Ọgwụgwụ Eruo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Jehova Na-agọzi Ma Na-echebe Ndị Na-erube isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 9 p. 103-113

ISI NKE ITOOLU

‘Achọrọla Onwe Gị Ihe Ukwu’

1, 2. (a) Olee nsogbu Barọk nwere n’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim? (b) Olee otú Jehova si nyere Barọk aka?

IKE gwụrụ Barọk bụ́ odeakwụkwọ kwesịrị ntụkwasị obi nke Jeremaya. N’afọ nke anọ nke ọchịchị ajọ Eze Jehoyakim, ma ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 625 T.O.A., Jeremaya gwara odeakwụkwọ ya ka o were akwụkwọ mpịakọta dee ihe niile Jehova si n’ọnụ ya kwuo banyere Jeruselem na Juda, ya bụ, ihe niile Chineke gwara Jeremaya kemgbe iri afọ abụọ na atọ o burula amụma. (Jere. 25:1-3; 36:1, 2) Ọ bụghị n’afọ ahụ ka Barọk gụụrụ ndị Juu ihe ahụ o dere n’akwụkwọ mpịakọta, kama ọ bụ n’afọ na-eso ya. (Jere. 36:9, 10) Ma è nwere ihe na-enye Barọk nsogbu n’obi?

2 Barọk kwara arịrị, sị: “Efuola m, n’ihi na Jehova atụkwasịwo iru uju n’ihe mgbu m! Ike agwụwo m n’ihi ude m na-asụ.” Ma eleghị anya, o nweela mgbe i kwuru na ike agwụla gị, ma ì kwupụtara ya ekwupụta ma ì kwuru ya n’obi gị. N’agbanyeghị otú Barọk si kwuo ya, Jehova bụ́ Onye na-enyocha obi mmadụ nọ na-ege ya ntị. Ọ ma ihe na-enye Barọk nsogbu n’obi. O jikwa obiọma si n’aka Jeremaya gbazie ya. (Gụọ Jeremaya 45:1-5.) Ma i nwere ike ịna-eche ihe mere ike ji gwụ Barọk. Ọ̀ bụ n’ihi ọrụ e nyere ya ka ọ̀ bụ ikekwe n’ihi ihe na-eme mgbe ọ na-arụ ya? Mba. Nsogbu ya bụ ihe o bu n’obi. Barọk nọ ‘na-achọ ihe ukwu.’ Olee ihe ukwu ndị ọ na-achọ? Gịnị ka Jehova kwuru na ya ga-emere ya ma ọ bụrụ na o mee ihe Chineke gwara ya? Gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Barọk mere?

OLEE “IHE UKWU” NDỊ BARỌK NA-ACHỌ?

3. Olee ihe kpatara nsogbu Barọk nwere n’ozi ọ na-ejere Chineke?

3 Ọ ga-abụrịrị na Barọk ma ihe “ihe ukwu” ndị ahụ ọ na-achọ bụ. Odeakwụkwọ ahụ ma na ‘anya Chineke na-ahụ ụzọ mmadụ, na-ahụkwa nzọụkwụ ya niile.’ (Job 34:21) Ọ bụghị ọrụ e nyere Barọk mere ka o chee na ya ‘enweghị ebe izu ike’ mgbe ọ na-ede amụma Jeremaya buru. Ọ bụ ihe o chere na ọ bụ ihe ukwu, nke bụ́ ihe dị ya n’obi. Ebe ọ bụ na ịchọrọ onwe ya “ihe ukwu” riri ya isi, o leghaara ihe ndị ka mkpa anya, ya bụ, ihe ndị gbasara ime uche Chineke. (Fil. 1:10) N’okwu ahụ e dere na Jeremaya 45:5, nke bụ́ ‘ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu,’ otú Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ si sụgharịa ngwaa Hibru ahụ mere ka ihe ọ pụtara doo anya. N’ihi ya, ọ bụghị na ọ batara ya n’obi, pụọkwa ozugbo. Barọk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya, nọ na-achọ “ihe ukwu” mgbe Jehova dọrọ ya aka ná ntị ka ọ kwụsị. N’agbanyeghị na ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nke nọ na-eme uche Chineke, ọ nọkwa na-achọrọ onwe ya “ihe ukwu.”

4, 5. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ịbụ onye a ma ama na onye a na-akwanyere ùgwù so ‘n’ihe ukwu’ ndị Barọk na-achọ, gịnịkwa mere o ji dị mma na Jehova dọrọ ya aka ná ntị?

4 Otu ihe nwere ike ịna-echu Barọk ụra bụ otú ọ ga-esi abụ onye a ma ama na onye a na-akwanyere ùgwù. N’agbanyeghị na Barọk dekọọrọ Jeremaya amụma ndị o buru, o nwere ike ọ bụghị naanị Jeremaya ka ọ bụ odeakwụkwọ ya. Na Jeremaya 36:32, a kpọrọ Barọk “odeakwụkwọ,” nke na-egosi na o nwere ike ịbụ na ọ na-arụrụ eze ọrụ. Ihe ndị mgbe ochie e gwutere n’ala gosiri na ọ nọ n’ọkwá dị elu n’obí eze. N’eziokwu, a kpọkwara Elishama, bụ́ onye so ná ndị isi Juda, “odeakwụkwọ.” Nke ahụ gosiri na o nwere ike ịbụ na Barọk na Elishama rụkọrọ ọrụ, na-esokwa eri ihe “n’ụlọ iri ihe nke odeakwụkwọ,” nke dị “n’ụlọ eze.” (Jere. 36:11, 12, 14) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Barọk gụrụ ezigbo akwụkwọ, na-arụkwa ọrụ n’ụlọ eze. Ọ bụ nwanne ya nwoke bụ́ Seraya na-elekọta ụlọ Eze Zedekaya. O sokwa eze mgbe ọ gara Babịlọn ime otu ihe dị mkpa. (Gụọ Jeremaya 51:59.) Ebe ọ bụ Seraya na-elekọta ụlọ eze, o yiri ka ọ̀ bụ ya na-akwadebere eze nri na ihe ndị ọzọ nakwa ebe ọ ga-arahụ mgbe ọ na-eme njem. N’eziokwu, ọ nọ n’ọkwá dị elu.

5 Ị manụ na idekọ ikpe dị iche iche a mara Juda nwere ike ịgwụ onye nọ n’ọkwá dị elu ike. N’eziokwu, e nwere ike ịna-ele Barọk anya ọjọọ ma napụ ya ọrụ ya n’ihi ịkwado onye amụma Chineke. Chegodị ihe ga-eme ma ọ bụrụ na Jehova etida ihe o wuru, dị ka e kwuru na Jeremaya 45:4. Ma “ihe ukwu” ndị ahụ Barọk na-achọ inweta ọ̀ bụ ịbụkwu onye a ma ama n’obí eze ma ọ̀ bụ inwetakwu akụnụba, mgbalị ya niile nwere ike ifu ọhịa. Ọ bụrụ na ọ bụ ịbụ onye a ma ama n’ọchịchị ndị Juu a ga-ebibi ebibi ka Barọk na-achọ, ọ dị mma na Chineke mere ka ọ kwụsị ịchọ ụdị ihe ahụ.

6, 7. Ọ bụrụ na ọ bụ akụnụba bụ “ihe ukwu” Barọk na-achọ, olee ndị ọ na-eṅomi n’oge ahụ?

6 Ma, o nwere ike ịbụ na akụnụba so ‘n’ihe ukwu’ Barọk na-achọ. Mba ndị ha na Juda gbara agbata obi tụkwasịrị ihe onwunwe na akụnụba obi. Moab tụkwasịrị ‘ọrụ ya na akụ̀ ya’ obi. Amọn mekwara otú ahụ. Jehova gwakwara Jeremaya ka o kwuo na Babịlọn nwere “akụ̀ dị ukwuu.” (Jere. 48:1, 7; 49:1, 4; 51:1, 13) Ma nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke mara mba ndị ahụ ikpe.

7 N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ bụ ihe onwunwe na akụnụba ka Barọk na-achọ, ị̀ hụlanụ ihe mere Jehova ji gwa ya kwụsị? Mgbe Chineke ‘ga-amatị aka mee ndị Juu ihe,’ ọ ga-enyefe ndị iro ha ụlọ ha na ubi ha. (Jere. 6:12; 20:5) Ka e weregodị ya na gị na Barọk bi na Jeruselem n’oge ahụ. Ọtụtụ n’ime ndị obodo unu, ma ndị isi ma ndị nchụàjà ma eze n’onwe ya, chere na ha kwesịrị ịlụso ndị Babịlọn bịara ibuso ha agha ọgụ. Ma, ị nụrụ na Jeremaya na-agwa ndị mmadụ, sị: “Jeerenụ eze Babịlọn ozi ka unu wee dịrị ndụ.” (Jere. 27:12, 17) Ì chere na inwe ọtụtụ ihe n’obodo ahụ gaara eme ka ọ dịrị gị mfe ime ihe ahụ Chineke kwuru? Otú i si ele ihe ndị ahụ i nwe anya ọ̀ gaara eme ka i mee ihe Jeremaya kwuru, ka ọ̀ gaara eme ka i mee ihe ọtụtụ ndị mere? N’eziokwu, e bukọọrọ akụ̀ niile dị na Juda na Jeruselem, ma ndị dị n’ụlọ nsọ, laa Babịlọn. N’ihi ya, ịchụ akụnụba agaraghị aba uru ọ bụla. (Jere. 27:21, 22) È nwere ihe nke ahụ na-akụziri anyị?

Olee otú Jehova si jiri obiọma gbazie Barọk ka ọ kwụsị ịchọ “ihe ukwu”? Gịnị mere i ji chee na anyị kwesịrị ịnara ndụmọdụ Chineke nyere anyị?

“M GA-ENYE GỊ MKPỤRỤ OBI GỊ KA Ọ BỤỤRỤ GỊ IHE NKWATA”

8, 9. Gịnị mere ị ga-eji kwuo na ime ka Barọk nweta mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe nkwata abụghị obere ihe?

8 Ihe ọzọ anyị kwesịrị ichebara echiche bụ: Olee ihe Barọk ga-enweta n’ihi irubere Chineke isi? Ọ bụ mkpụrụ obi ya! Ọ bụ ya bụ “ihe nkwata” Chineke kwere ya ná nkwa. (Gụọ Jeremaya 45:5.) Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka a na-egbughị. Olee ndị ha bụ? Ọ bụ ndị gere Chineke ntị ma gbakwuru ndị Kaldia, ya bụ, chịliere ha aka elu. (Jere. 21:9; 38:2) Ụfọdụ nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ̀ bụ naanị ihe ahụ ka e ji kwụọ ha ụgwọ maka irube isi?’

Foto dị na peeji nke 107

9 Chegodị otú Jeruselem dị mgbe ndị agha Babịlọn nọchibidoro ya. Ihe ji nwayọọ nwayọọ sie ezigbo ike na Jeruselem n’oge ahụ. Ọ dị iche n’otú e si bibie Sọdọm, bụ́ nke e nwere ike ikwu na e bibiri n’otu ntabi anya. E nwere ike ikwu na ahụhụ ndị bi na Jeruselem tara karịrị ahụhụ ndị Sọdọm tara mgbe e bibiri obodo ha. (Ákwá 4:6) Ọ bụ Barọk dekọrọ amụma Jeremaya buru na mma agha, ụnwụ, ma ọ bụ ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị bi na Jeruselem. Ọ ga-abụrịrị na ọ hụrụ mgbe o mezuru. Nri gwụrụ kpamkpam na Jeruselem. Ndị nne na-enwekarị “ọmịiko.” Ma chetụdị otú o si awụ akpata oyi ịnọ n’obodo hụ ka ndị nne na-esi ụmụ ha rie! (Ákwá 2:20; 4:10; Jere. 19:9) Ma, ọkọ akọghị Barọk. N’ezie, n’oge ọgba aghara ahụ, ndụ bụ ihe nkwata, dị ka ihe a na-enye ndị meriri n’agha. O doro anya na Barọk naara ndụmọdụ Chineke nyere ya, nke bụ́ ka ọ ghara ịna-achọrọ onwe ya “ihe ukwu.” Jehova gọzikwara ya. Ọ bụ ya mere o ji lanahụ mbibi Jeruselem.—Jere. 43:5-7.

Ị̀ GA-ACHỌ “IHE UKWU”?

10, 11. Olee otú ihe Baịbụl kọrọ banyere Barọk si gbasa oge anyị a nakwa onye ọ bụla n’ime anyị?

10 N’agbanyeghị na Barọk nọ na-eme uche Chineke, e nwere mgbe ọ chọsiri ike inweta “ihe ukwu.” Jehova gwara ya nsogbu ọ ga-akpatara ya, nke mere ka ya na Chineke nọgide na-adị ná mma, meekwa ka a ghara igbu ya. Dị ka Barọk, ihe anyị bu n’obi inweta ò nwere ike ịghọrọ anyị ọnwụnwa, ikekwe, rie anyị isi, n’agbanyeghị na anyị na-anụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova?

11 O nwere ike ịbụ na ịchọ ịbụ onye a ma ama bụụrụ Barọk ezigbo ọnwụnwa. Weregodị anya nke uche gị hụ ebe ọ nọ na-eche, sị: ‘Gịnị ka m ga-eme ka a ghara ịchụ m n’ọrụ “odeakwụkwọ” a m na-arụ? M̀ nwere ike ime ka e bulie m n’ọkwá?’ Oleekwanụ banyere anyị? Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere “oké ọchịchọ,” nke o nwere ike ịbụ na ndị ọzọ amaghị, ya bụ, ịbụ onye a ma ama ugbu a ma ọ bụ n’ọdịnihu?’ Ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto nwere ike ịjụ onwe ha, sị, ‘Ịgụkwu akwụkwọ iji ghọọ onye a na-akwanyere ùgwù nakwa aka ji akụ̀ ò nwere ike ime ka m malite ịchọrọ onwe m “ihe ukwu”?’

12. Olee otú otu nwanna si chọọ ihe ukwu maka otuto Jehova, oleekwa ihe i chere banyere ihe ahụ o mere?

12 E nwere otu nwanna nwoke na-eje ozi ugbu a n’isi ụlọ ọrụ anyị. Ọ dị afọ iri na ise mgbe e nyere ya ohere ịgụ akwụkwọ n’efu n’otu mahadum. O wutere ndị nkụzi ya mgbe ọ jụrụ ịga mahadum ahụ ma họrọ ịbụ ọsụ ụzọ. Ma, ọ ka nwere mmasị n’ịmụ ihe. Ọ ghọrọ onye ozi ala ọzọ, e ziga ya n’otu agwaetiti dịbara n’ime. Ọ nọ ebe ahụ mụwa otu asụsụ nke ihe dị ka puku mmadụ iri na-asụ. E nweghị akwụkwọ ọkọwa okwu n’asụsụ ahụ. N’ihi ya, o ji aka ya depụta okwu ụfọdụ na ihe ha pụtara. O mechara mụta asụsụ ahụ, a gwa ya sụgharịa ụfọdụ akwụkwọ anyị n’asụsụ ahụ. E mechara jiri okwu ndị ahụ o depụtara bipụta akwụkwọ ọkọwa okwu mbụ e nwere n’asụsụ ahụ. E nwere otu oge ọ gwara ìgwè mmadụ ná mgbakọ distrikti, sị: “A sị na m kwetara gaa mahadum, akwụkwọ ọ bụla m dere gaara abụ iji too onwe m. Ka ọ dị ugbu a, e nweghị m akara ugo mmụta ọ bụla. N’ihi ya, ọ bụghị m ka e kwesịrị ito n’ihi ihe m mere. Ọ bụ Jehova ka otuto niile na-agara.” (Ilu 25:27) Olee ihe i chere banyere mkpebi ahụ o mere mgbe ọ dị afọ iri na ise? Kemgbe ọtụtụ afọ, o nweela ọtụtụ ihe ùgwù n’etiti ndị Chineke. Olee ihe ị chọrọ iji onyinye Chineke nyere gị mee? Kama ịchọ iji ya wetara onwe gị otuto, ì kpebisiela ike iji ya na-eto Jehova?

13. Gịnị mere ụfọdụ ndị nne na nna ji kwesị ichebara nsogbu Barọk nwere echiche?

13 Nsogbu ọzọ yiri ya bụ ịchọrọ ndị anyị hụrụ n’anya ma ọ bụ ndị anyị na-azụ “ihe ukwu,” ma ọ bụ isi n’aka ha na-achọrọ onwe anyị “ihe ukwu.” Ma eleghị anya, ị hụla ebe nne na nna bụ́ ndị ụwa mere ihe ụfọdụ iji hụ na nwa ha kpatara akụ̀ karịa ha ma ọ bụ ghọọ onye ha ji eme ọnụ. Ikekwe, ị nụla okwu ndị dị ka: “Achọghị m ka nwa m rụgbuo onwe ya n’ọrụ ka m” ma ọ bụ “Achọrọ m ka nwa m gaa mahadum ka ọ ghara ịta ahụhụ.” Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwekwara ike iche ụdị ihe ahụ. N’eziokwu, mmadụ nwere ike ikwu, sị, ‘Anaghị m achọrọ onwe m ihe ukwu.’ Ma ò nwere ike ịbụ na o si n’aka nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị na-achọ ya? Otú ahụ o nwere ike ịbụ na Barọk chọrọ iji ọkwà ya ma ọ bụ ọrụ ya na-achọrọ onwe ya ihe ukwu, nne ma ọ bụ nna nwere ike ibu n’obi na ya ga-eji ihe nwa ya ga-enweta na-achọrọ onwe ya ihe ukwu. Ma, onye “na-enyocha obi” ọ́ gaghị achọpụta otú ahụ ọ chọpụtara nke Barọk? (Ilu 17:3) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịrịọ Chineke ka o nyochaa obi anyị, dị ka Devid rịọrọ ya ka o mee? (Gụọ Abụ Ọma 26:2; Jeremaya 17:9, 10.) E nwere ụzọ dị iche iche Jehova nwere ike isi mee ka anyị mata nsogbu dị n’ịchọ “ihe ukwu.” Otu ụzọ bụ ihe a anyị na-amụ banyere Barọk.

Olee otu ụzọ o nwere ike ịbụ na Barọk si na-achọrọ onwe ya “ihe ukwu”? Gịnịkwa ka ihe ahụ na-akụziri gị?

“IHE DỊ OKÉ ỌNỤ AHỊA” NWERE IKE ỊGHỌ ỌNYÀ

14, 15. Olee otú akụnụba nwere ike isi ghọọrọ anyị “ihe ukwu”?

14 Chegodị echiche banyere ihe anyị bu ụzọ kwuo, nke bụ́ na o nwere ike ịbụ na “ihe ukwu” Barọk na-achọ bụ akụnụba. A sị na obi Barọk niile dị n’akụ̀ ya ndị dị na Juda, o nwere ike isiri ya ike irube isi n’iwu Chineke nyere ha, nke bụ́ ka ha chịliere ndị Kaldia aka elu. Ma eleghị anya, ị chọpụtala na obi ndị ọgaranya na-adịkarị ‘n’ihe dị oké ọnụ ahịa’ ha nwere. Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na ‘n’echiche ọgaranya,’ akụ̀ ya yiri mgbidi na-echebe ya. (Ilu 18:11) Ndị ohu Jehova niile ga-erite uru ma ọ bụrụ na ha ana-echeta otú Okwu Chineke gwara anyị na anyị kwesịrị isi na-ele akụnụba anya. (Gụọ Ilu 11:4.) Ma ụfọdụ nwere ike iche, sị, ‘Ò nwere ihe dị njọ ma mmadụ nwetatụ ihe ụwa?’

15 Ọ bụrụ na obi Onye Kraịst niile adịrị n’akụnụba, o nwere ike ime ka ọ chọsie ike inweta ihe ndị ga-eso usoro ihe dị ugbu a gabiga. Ma Jeremaya ma Barọk emeghị otú ahụ. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jizọs dọrọ ndị ga-ebi mgbe “a gaje ikpughe Nwa nke mmadụ” aka ná ntị. Ọ gwara ha, sị: “Chetanụ nwunye Lọt.” O kwesịkwara ekwesị ka a gbaa Ndị Kraịst ume, sị: ‘Chetanụ Jeremaya na Barọk.’ (Luk 17:30-33) Ọ bụrụ na obi anyị niile adịrị n’akụnụba, ọ ga-esiri anyị ike ime ihe ahụ Jizọs kwuru. Ma echefula na Barọk nabatara aka ná ntị Chineke dọrọ ya, nke mere ka ọ dịrị ndụ.

16. Kọọ otu ihe merenụ, bụ́ ebe ndị ohu Chineke gosiri na ha ahụghị akụnụba n’anya.

16 Chee echiche banyere ụmụnna anyị bi na Romenia n’oge ọchịchị Kọmunist. Ndị uwe ojii na-awaba n’ụlọ ha ma bukọrọ ngwongwo ha, nke ka nke, ihe ndị ha nwere ike ire ere. (Ákwá 5:2) Ọtụtụ ụmụnna anyị bi n’obodo ahụ n’oge ahụ hapụụrụ ha ngwongwo ha. A manyere ụfọdụ ndị ịhapụ ihe ha nwere mgbe a na-akpọga ha ebe ọzọ; ma ha nọgidere na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova. Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa ahụ abịara gị, obi gị niile ọ̀ ga-adị n’akụnụba, nke ga-eme ka ị kwụsị irubere Chineke isi?—2 Tim. 3:11.

Foto dị na peeji nke 111

17. Ma eleghị anya, olee otú ụfọdụ ndị ha na Jeremaya na Barọk dịkọrọ ndụ si nyere ha aka?

17 Anyị ekwesịghị ichefu na ụfọdụ ndị ha na Jeremaya na Barọk dịkọrọ ndụ nyeere ha aka. Zefanaya buru amụma n’oge Josaya na-achị. Ọ bụkwa n’oge ahụ ka Jeremaya bụ onye amụma. Olee otú i chere obi dị Jeremaya mgbe ọ nụrụ ihe e kwuru na Zefanaya 1:18? (Gụọ ya.) Ì nwere ike iji anya nke uche gị hụ ka Jeremaya na-agwa Barọk ihe ahụ mmụọ nsọ mere ka Zefanaya kwuo? Ezikiel bụ onye ọzọ ya na Jeremaya bukọrọ amụma. A dọọrọ ya n’agha laa Babịlọn n’afọ 617 T.O.A. Ụfọdụ ihe o mere na ozi o zisara bụ maka ndị Juu ahụ ka nọ n’ala nna ha. N’ihi ya, ọ ga-abụ na Jeremaya ma ihe ndị ahụ Ezikiel kwuru ma ọ bụ ihe ndị o mere, Ezikiel amarakwa ndị nke Jeremaya. Otu n’ime ha bụ ihe e dere n’Ezikiel 7:19. (Gụọ ya.) Okwu ndị ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ baara Jeremaya na Barọk uru. Ha nwekwara ike ịbara anyị uru taa. N’ụbọchị Jehova, ndị mmadụ ga-akpọku chi ha ka o chebe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ma chi ha ma akụnụba ha enweghị ike ichebe ha.—Jere. 2:28.

Ị̀ GA-ENWETA “MKPỤRỤ OBI GỊ KA Ọ BỤỤRỤ GỊ IHE NKWATA”?

18. “Mkpụrụ obi” onye ka anyị kwesịrị ịchọ inweta ka ọ bụụrụ anyị ihe nkwata, oleekwa otú anyị ga-esi enweta ya?

18 Anyị kwesịrị icheta na nkwa Jehova kwere anyị bụ na ya ga-enye anyị “mkpụrụ obi” anyị ka ọ bụụrụ anyị ihe nkwata. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ n’ime ndị ohu ya anwụọ ná mkpagbu ha nwere ike inweta n’oge “oké mkpagbu” na-abịanụ, bụ́ mgbe mpi anụ ọhịa ahụ nke na-anọchite anya ọchịchị ga-emegide okpukpe, ikwesị ntụkwasị obi ha agaghị efu ọhịa. Chineke kwere ha nkwa na “mkpụrụ obi” ha ga-adị ndụ ọzọ ma nweta “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” n’ụwa ọhụrụ. (Mkpu. 7:14, 15; 1 Tim. 6:19) Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ahụ, ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta. Ka obi sie gị ike na mgbe Chineke ga-eme ka ọdachi dakwasị mba niile, o nweghị onye ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi ga-eso ná ndị “Jehova gburu.”—Jere. 25:32, 33.

Foto ndị dị na peeji nke 113

Mee ihe bara uru n’ezie (Jiri ya tụnyere foto dị na peeji nke 46.)

19. Olee otú ịmụ banyere Jeremaya na Barọk si mee ka i kpebisikwuo ike na ị gaghị achọrọ onwe gị “ihe ukwu”?

19 O nwere ike iwute ụfọdụ ndị na ọ bụ naanị “mkpụrụ obi” ha ga-abụrụ ha ihe nkwata. Ma, o kwesịghị iwute ha. Cheta na ka ụnwụ nri nọ na-egbu ndị bi na Jeruselem, Jehova mere ka agụụ ghara igbu Jeremaya. Olee otú o si mee ya? Eze Zedekaya tụbara Jeremaya n’ụlọ mkpọrọ dị n’Ogige Ndị Nche, meekwa ka ‘e si n’okporo ámá nke ndị na-eme achịcha na-ewetara ya otu ogbe achịcha kwa ụbọchị, ruo mgbe achịcha gwụrụ n’obodo’ ahụ. (Jere. 37:21) Jeremaya anwụghị! Jehova nwere ike isi n’ụzọ ọ bụla dị ya mma nye ndị ya ihe dị ha mkpa. O nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ime otú ahụ, n’ihi na ọ ga-emezurịrị nkwa ndụ ebighị ebi o kwere ha. Barọk lanahụrụ mbibi Jeruselem n’ihi na ọ kwụsịrị ‘ịchọrọ onwe ya ihe ukwu.’ Anyị na-atụkwa anya ịlanahụ Amagedọn ma na-eto Jehova, “mkpụrụ obi” anyị ga-abụkwara anyị ihe nkwata nke anyị ga-enwe ruo mgbe ebighị ebi.

Gịnị mere anyị ekwesịghị ịchọrọ onwe anyị “ihe ukwu” taa, kama na-atụ anya inweta “mkpụrụ obi” anyị ka ọ bụụrụ anyị ihe nkwata?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya