Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 13 p. 28-29
  • Timoti Chọrọ Inyere Ndị Mmadụ Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Timoti Chọrọ Inyere Ndị Mmadụ Aka
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Timoti—Dị Njikere, Nweekwa Mmasị Ije Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Pọl na Timoti
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Timoti—“Ezi Nwa M n’Okwukwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Nwa M M Hụrụ n’Anya nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi n’Ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 13 p. 28-29
Ebe nne Timoti bụ́ Yunis na mama nnukwu ya bụ́ Lọịs na-akụziri ya ihe

ISI NKE 13

Timoti Chọrọ Inyere Ndị Mmadụ Aka

Timoti bụ nwa okorobịa obi na-adị ụtọ inyere ndị ọzọ aka. Ọ na-aga ọtụtụ ebe. Ihe mere o ji aga ebe ndị ahụ bụ ka o nyere ndị mmadụ aka. Otú a o si enyere ndị ọzọ aka mere ka ọ na-enwe obi ụtọ. Ị̀ ga-achọ ịmara otú o si nyere ndị mmadụ aka?—

Mama nnukwu Timoti na mama Timoti kụziiri ya gbasara Jehova

Timoti toro n’obodo a na-akpọ Listra. Aha mama nnukwu ya bụ Lọịs. Aha mama ya abụrụ Yunis. Ha abụọ malitere mgbe Timoti ka bụ nwatakịrị kụziwere ya gbasara Jehova. Mgbe Timoti tolitere, ọ chọrọ inyere ndị mmadụ aka ka ha mara onye Jehova bụ.

Mgbe ọ ghọrọ nwa okorobịa, Pọl gwara ya ka o soro ya gaa ziwe ndị mmadụ ozi ọma n’ebe dị iche iche. Timoti kwetara iso ya gaa ebe ndị ahụ.

Otu n’ime ebe ndị ha gara bụ obodo dị na Masedonia. Aha obodo ahụ bụ Tesalonaịka. Ebe ahụ dị anya. Ha gara ije ọtụtụ ụbọchị tupu ha abanye ụgbọ mmiri ga-ebu ha ruo ebe ahụ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha nyeere ọtụtụ ndị aka ịghọ Ndị Kraịst. Ma, ndị ụfọdụ nọ n’obodo ahụ were iwe, chọọkwa imerụ Pọl na Timoti ahụ́. Ihe a mere ka ha si n’obodo ahụ pụọ gawa izi ozi ọma n’obodo ndị ọzọ.

Ebe Timoti na Pọl onyeozi nọ n’ụgbọ mmiri

Obi na-adị Timoti ụtọ mgbe niile

Mgbe ọnwa ole na ole gara, Pọl gwara Timoti ka ọ gaghachi Tesalonaịka ka ọ mara otú ndị ahụ ghọrọ Ndị Kraịst na-eme. Chetakwa na ndị obodo ahụ chọburu imerụ ha ahụ́. Ma, obi kara Timoti, ụjọ atụghịkwa ya. Ọ gaghachiri Tesalonaịka maka na ọ chọrọ ịma otú ụmụnna ya na-eme. Mgbe o ruru, ọ hụrụ na ụmụnna ndị nọ n’obodo ahụ na-eme nke ọma. Ihe a mere ya na Pọl obi ụtọ.

Timoti na Pọl jere ozi ọma ọtụtụ afọ. E nwedịrị mgbe Pọl dere na e nweghị onye ọzọ ya ga-eziga ka o nyere ụmụnna ya aka ma e wezụga Timoti. Timoti hụrụ ma Jehova ma ụmụ mmadụ n’anya.

Ị̀ hụrụ ndị ọzọ n’anya, chọọkwa inyere ha aka ịmara onye Jehova bụ?— Ọ bụrụ na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya, na-enyekwara ha aka, ị ga na-enwe obi ụtọ ka Timoti.

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • 2 Timoti 1:5; 3:15

  • Ọrụ Ndịozi 16:1-5; 17:1-10

  • 1 Ndị Tesalonaịka 3:2-7

  • Ndị Filipaị 2:19-22

AJỤJỤ:

  • Ebee ka Timoti nọ too?

  • Timoti ọ̀ chọrọ isoro Pọl na-aga ebe dị iche iche izi ndị mmadụ ozi ọma? Gịnị mere o ji chọọ iso ya?

  • Gịnị mere Timoti ji gaghachi Tesalonaịka?

  • Olee ihe ga-eme ka ị na-enwe obi ụtọ ka Timoti?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya