Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 14 p. 30-31
  • Alaeze nke Ga-achị Ụwa Niile

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Alaeze nke Ga-achị Ụwa Niile
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Enyi Chineke Ga-Ebi Na Paradaịs
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Olee Ndị A Ga-akpọlite n’Ọnwụ? Ebee Ka Ha Ga-ebi?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Alaeze nke Ga-agbanwe Ụwa Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 14 p. 30-31
Ebe Jizọs Kraịst na-achị ụwa mgbe ọ ghọrọ paradaịs

ISI NKE 14

Alaeze nke Ga-achị Ụwa Niile

Ị̀ ma Alaeze ma ọ bụ Ọchịchị nke anyị na-ekwu maka ya?— Ee. Ọ bụ Alaeze Chineke. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu banyere Alaeze ahụ?—

Alaeze ọ bụla nwere eze. Eze ahụ ga na-achị ndị bi n’obodo ya. Ị̀ ma onye bụ Eze Alaeze Chineke?— Ọ bụ Jizọs Kraịst. O bi n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-amalite ịchị ndị niile bi n’ụwa. Ị̀ chere na obi ga-adị anyị ụtọ ma Jizọs chịwa ụwa niile?—

Gịnị ka ị ga-achọ ịhụ na Paradaịs?

Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ. Na Paradaịs, ndị mmadụ agaghị na-alụ ọgụ ma ọ bụ na-alụ agha. Mmadụ niile ga-ahụ ibe ha n’anya. Ndị mmadụ agaghịzi na-arịa ọrịa. E nweghịkwa onye ga-anwụ anwụ. Ndị kpuru ìsì ga-ahụ ụzọ. Ndị ntị chiri ga-amalite ịnụ ihe. Ndị ngwọrọ ga-eje ije, ha ga na-awụgharịkwa. Nri ga-eju ebe niile. Ụmụ anụmanụ agaghịzi na-atagbu ibe ha, ha agaghịkwa na-emerụ anyị ahụ́. Ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ. Ọtụtụ n’ime ndị anyị mụrụ banyere ha n’akwụkwọ a ga-ebilitekwa n’ọnwụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ribeka, Rehab, Devid, na Ịlaịja. Ị̀ ga-achọ ịhụ ha ma ha bilite n’ọnwụ?—

Jehova hụrụ gị n’anya, chọọkwa ka obi dị gị ụtọ. Ọ bụrụ na ị na-amụ banyere Jehova ma na-erubere ya isi, ị ga-ebi na paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ibi na paradaịs ahụ mara mma?—

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • Aịzaya 2:4; 11:6-9; 25:8; 33:24; 35:5, 6

  • Jọn 5:28, 29; 17:3

AJỤJỤ:

  • Ònye bụ Eze Alaeze Chineke?

  • Olee ndị Jizọs ga na-achị?

  • Olee otú ụwa ga-adị mgbe Jizọs ga na-achị ya?

  • Ọ bụrụ na ị chọrọ ibi na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi, gịnị ka i kwesịrị ime?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya