Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 3 p. 9-11
  • Otú Unu Ga-esi Na-edozi Esemokwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Unu Ga-esi Na-edozi Esemokwu
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 KWURỊTANỤ IHE NA-ESERE UNU
  • 2 GEE NTỊ, GHỌTAKWA IHE Ọ NA-EKWU
  • 3 NA-EME IHE UNU KPARỊTARA
  • Idozi Nsogbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Na-akwanyere Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Agbala n’Èzí
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Chineke Ga-enyere Unu Aka Ịna-ebi n’Udo
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 3 p. 9-11
Ebe otu nwoke na-ege nwunye ya ntị ka ọ na-agwa ya otú obi dị ya

ISIOKWU NKE 3

Otú Unu Ga-esi Na-edozi Esemokwu

“Nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ, n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8

Di na nwunye malite ibi, ọtụtụ ihe nwere ike ịna-akpatara ha esemokwu. Ụfọdụ n’ime ihe ndị nwere ike ịna-akpata esemokwu ndị ahụ bụ na otú ha si eche echiche abụghị otu, otú ha si ele ihe anya abụghịkwa otu. Ihe onye ọzọ mere ma ọ bụ ihe ha na-atụghị anya ya nwekwara ike ịkpatara ha esemokwu.

Mgbe ụfọdụ, di na nwunye nwere ike iche na e nweghị ihe esemokwu ndị ahụ bụ, ma Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-edozi esemokwu. (Matiu 5:23, 24) Ime ihe Baịbụl kwuru ga-enyere di na nwunye aka idozi esemokwu ọ bụla ha nwere.

1 KWURỊTANỤ IHE NA-ESERE UNU

IHE BAỊBỤL KWURU: “E nwere oge . . . ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:1, 7) Unu kwesịrị ịna-ewepụta oge nọdụ ala kwuo banyere ihe na-esere unu. Kwuo otú ihe ahụ dị gị n’obi. Ezola ihe ọ bụla ezo. Na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị eziokwu mgbe niile. (Ndị Efesọs 4:25) Ọ bụrụgodị na ihe merenụ na-ewute gị, gbalịa jide onwe gị. Okwu ọma ị gwara di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbe unu na-ekwurịta ihe seere unu ga-eme ka unu dozie esemokwu ahụ kama isere okwu na-aga.—Ilu 15:4; 26:20.

Ọ bụrụgodị na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu adịghị gị mma, agwala ya okwu ọjọọ. Na-agwa ya okwu otú ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. (Ndị Kọlọsi 4:6) Gbalịanụ kpezie ihe ọ bụla na-esere unu ozugbo. Unu agbachikwala ibe unu nkịtị.—Ndị Efesọs 4:26.

Ebe otu di na nwunye na-ekwurịta gbasara nsogbu ha nwere

IHE I NWERE IKE IME:

  • Wepụtanụ oge dị mma unu ga-eji kwurịta ihe na-esere unu

  • Di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuwe ihe na-ese, gewe ya ntị, anapụla ya okwu n’ọnụ. Ya kwuchaa, gị ekwuo nke gị

2 GEE NTỊ, GHỌTAKWA IHE Ọ NA-EKWU

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Na-ege di gị ma ọ bụ nwunye gị ntị nke ọma ka i wee ghọta ihe ọ na-ekwu. Ime otú ahụ ga-egosi na ihe ọ na-ekwu na-emetụ gị n’obi nakwa na ị dị umeala n’obi. (1 Pita 3:8; Jems 1:19) Emela ka à ga-asị na ị na-ege ntị ma ọ bụrụ na ị naghị ege ntị. Ọ bụrụ na o kwe mee, kwụsị ihe ị na-eme, gewe ya ntị ma ọ bụkwanụ gị agwa ya ka unu kwuo banyere ya mgbe i mechara. Ọ bụrụ na ị ghọtara na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-agba mbọ ka unu ghara ịna-esekarị okwu, ihe ọ bụla o mere agaghị na-ewe gị iwe ọsọ ọsọ.—Ekliziastis 7:9.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Ọ bụrụgodị na ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu na-ewe gị iwe, gee ya ntị

  • Gbaa mbọ ghọta ihe ọ na-ekwu. Olu o ji agwa gị okwu na otú ihu ya dị ga-eme ka ị mara otú obi dị ya

3 NA-EME IHE UNU KPARỊTARA

IHE BAỊBỤL KWURU: “Uru dị n’ụdị ndọgbu n’ọrụ niile, ma okwu egbugbere ọnụ efu na-eme ka a nọrọ n’ụkọ.” (Ilu 14:23) Ọ bụghị unu kpebie otú unu ga-esi dozie ihe na-esere unu, gị afanyezie aka n’ụkwụ. I kwesịrị ịna-eme ihe unu kparịtara. O nwere ike ọ gaghị adịchara gị mfe, ma mbọ ọ bụla ị gbara agaghị ala n’iyi. (Ilu 10:4) Ọ bụrụ na unu jikọọ aka dozie ihe na-esere unu, unu ga-enwe “ezi ụgwọ ọrụ.”—Ekliziastis 4:9.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Kpebienụ ihe onye ọ bụla n’ime unu ga-eme ka unu ghara ịna-esekarị okwu

  • Unu nọtụ, unu amara ma ùnu na-emekwa ihe unu kpara

NA-AGBAKỌNỤ MBỌ ỌNỤ

Ọ bụrụ na ọ na-abụ gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị see okwu, unu ejikọọ aka dozie ya, unu ga na-ebi n’udo. Ezinụlọ unu ga-abụkwa a kwaa a kwụrụ. (Ilu 24:3) Anọla na-ekwu banyere okwu unu sere n’oge gara aga, kama nwee nchekwube na echi ga-aka mma. (Ilu 17:9) Ọ bụrụ na unu na-agbakọ mbọ ọnụ ma na-eme ihe Baịbụl kwuru, unu ga na-edozi ihe ọ bụla seere unu okwu.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Olee nghọtahie mụ na di m ma ọ bụ nwunye m nwere nke m ga-achọ ka anyị buru ụzọ kparịta?

  • Olee ihe m ga-eme ka m nwee ike ịghọta otú obi dị di m ma ọ bụ nwunye m banyere nsogbu ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya