Abụ 140
Ndụ Onye Ọsụ Ụzọ
Mgbe chi ka n’abọ, tupu anyanwụ apụta,
Ụra dị anyị n’anya,
m’anyị n’ebilite kpee ’kpere.
A’yị n’eji ihu ọchị ekele ndị mmadụ.
Ụfọdụ n’akwụsị,
ndị ọzọ n’agafe, m’anyị nọ.
(KORỌS)
A’yị kpebir’ime ya;
A’yị bụ nke Jehova.
Ih’ọ bụl’ọ chọrọ, a’yị g’eme.
A’yị ga n’arụ ọrụ ya
Ná mmiri na n’anwụ.
A’yị si otú a ’gwa Jaa
n’anyị hụrụ ya n’anya.
Mgbe anwụ chọr’ịda, mgbe chi chọr’iji,
Ike n’agwụch’anyị,
m’anyị ejir’ọṅụ kpee ekpere.
Ụdị ndụ a dị anyị mma; a’yị n’em’ike anyị dum.
Anyị n’ekele Jaa,
ọ n’agọzikw’anyị kw’ụbọchị.
(KORỌS)
A’yị kpebir’ime ya;
A’yị bụ nke Jehova.
Ih’ọ bụl’ọ chọrọ, a’yị g’eme.
A’yị ga n’arụ ọrụ ya
Ná mmiri na n’anwụ.
A’yị si otú a ’gwa Jaa n’anyị hụrụ
ya n’anya.
(Gụọkwa Jọsh. 24:15; Ọma 92:2; Rom 14:8.)