Abụ 142
Ikwusara Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma
Anyị chọr’ịna-eṅomi Chineke.
Anyị agagh’ele ’madụ anya n’ihu.
Ọ chọrọ k’a zọpụta ’madụ dum;
Ọ n’anabat’ụdị ’madụ niile.
(KORỌS)
Eb’ọ bụla ony’ahụ si,
Ihe ka mkpa bụ obi ya.
A’yị n’ezi ony’ọ bụl’ozi Chineke.
A’yị n’ezi ya n’ebe dum.
Anyị hụrụ ha n’anya.
Ụdị ’madụ dum g’abụli enyi Jaa.
Eb’ony’ahụ si enwegh’ih’o mere.
Ọdịdị y’enweghịkw’ih’o mere.
Ihe ka mkpa bụ otú obi ony’ahụ dị.
Ọ bụkwa ya ka Jehova n’ele.
(KORỌS)
Eb’ọ bụla ony’ahụ si,
Ihe ka mkpa bụ obi ya.
A’yị n’ezi ony’ọ bụl’ozi Chineke.
A’yị n’ezi ya n’ebe dum.
Anyị hụrụ ha n’anya.
Ụdị ’madụ dum g’abụli enyi Jaa.
Jehova n’anabat’ony’ọ bụla
Nke hapụr’omum’ọjọọ nk’ụwa a.
A’yị maara nk’a, chọọkw’ịgwa ya ndị ọzọ.
Ọ bụ ya mer’anyị ji ezi ozi ọma.
(KORỌS)
Eb’ọ bụla ony’ahụ si,
Ihe ka mkpa bụ obi ya.
A’yị n’ezi ony’ọ bụl’ozi Chineke.
A’yị n’ezi ya n’ebe dum.
Anyị hụrụ ha n’anya.
Ụdị ’madụ dum g’abụli enyi Jaa.
(Gụọkwa Jọn 12:32; Ọrụ 10:34; 1 Tim. 4:10; Taị. 2:11.)