Abụ 143
Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị
Nke E Biri Ebi
N’ụw’ọjọọ a gbar’ọchịchịrị,
Anyị n’ahụ ìhè.
Ọ dị ka mgbe chi n’abọ,
Ìhè n’emecha dị.
(KORỌS)
Ọchịchịrị gbara.
M’ozi ọm’anyị n’eny’ìhè.
Ọ n’eny’olileanya.
Ọ n’enwu k’anyanwụ,
N’eme k’ọchịchịrị laa,
Anyị ah’ụzọ.
K’a kpọtee ndị n’ehi ụra
N’ihi n’oge agwụla.
A’yị n’ezi h’ozi n’agb’ume,
N’arịọ ka ha dị ndụ.
(KORỌS)
Ọchịchịrị gbara.
M’ozi ọm’anyị n’eny’ìhè.
Ọ n’eny’olileanya.
Ọ n’enwu k’anyanwụ,
N’eme k’ọchịchịrị laa,
Anyị ah’ụzọ.
(Gụọkwa Jọn 3:19; 8:12; Rom 13:11, 12; 1 Pita 2:9.)