Abụ 144
Ọ Ga-eme Ka Ha Dị́ Ndụ
Ugbu a oge ka dị,
tupu’bọchị Jaa abịa,
K’anyị gwa ’madụ dum
n’ụbọch’iwe ya dị nso.
(KORỌS)
Ọ g’eme ka hanwa dị ndụ,
meekwa ka anyị dị ndụ.
Ha g’adị ndụ ma ha gee ntị,
K’anyị mee ka mba niile nụ;
Ka ha nụ.
A’yị nwer’ozi dị mkpa.
A’yị n’ekwusa y’ebe dum.
A’yị n’akpọ ’madụ niile
ka ha bịakwute Jaa.
(KORỌS)
Ọ g’eme ka hanwa dị ndụ,
meekwa ka anyị dị ndụ.
Ha g’adị ndụ ma ha gee ntị,
K’anyị mee ka mba niile nụ;
Ka ha nụ.
(KORỌS)
Ka ha nụ, ozi a dị mkpa,
n’ihi na oge agwụl’agwụ.
Ozi ọma a’yị n’ezi ha
G’emekwa ka ha nweta ndụ.
(KORỌS)
Ọ g’eme ka hanwa dị ndụ,
meekwa ka anyị dị ndụ.
Ha g’adị ndụ ma ha gee ntị,
K’anyị mee ka mba niile nụ;
Ka ha nụ.
(Gụọkwa 2 Ihe 36:15; Aịza. 61:2; Ezik. 33:6; 2 Tesa. 1:8.)