Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 1 p. 6-11
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ OHU JEHOVA NDỊ NỌ N’ELUIGWE SO NÁ NZUKỌ JEHOVA
  • NZUKỌ JEHOVA NA-AGA N’IHU N’IHU
  • “Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nọrọ ná Nchebe Dị Ka Akụkụ nke Nzukọ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe nke Jehova Na-aga n’Ihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Soro Ụgbọ Ịnyịnya Eluigwe nke Jehova Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 1 p. 6-11

ISI NKE 1

Ndị A Haziri Ime Uche Jehova

N’ỤWA niile, e nwere òtù dị iche iche, ma nke okpukpe, ma nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma nke azụmahịa, ma nke ndị na-ahụ maka ọdịmma ọhaneze. Òtù niile a nwere ihe ndị e ji mara ha na ihe ndị mere e ji nwee ha. Otú ha si eme ihe dịkwa iche iche. Ma, e nwere ndị dị nnọọ iche n’òtù niile a. Baịbụl kwuru na ha bụ Ndịàmà Jehova.

2 Ọ dị mma na ị nọ ná nzukọ Jehova. Ugbu a, ị mụtala uche Chineke, na-emekwa ya eme. (Ọma 143:10; Rom 12:2) I so ụmụnna gị nọ n’ụwa niile na-ejere Jehova ozi. Ụmụnna ndị a hụkwara ibe ha n’anya. (2 Kọr. 6:4; 1 Pita 2:17; 5:9) Ihe ndị a na-abara gị uru, na-emekwa gị obi ụtọ otú Baịbụl kwuru. (Ilu 10:22; Mak 10:30) Ọ bụrụ na ị na-eme uche Jehova ugbu a, ọ ga-eme ka ị dị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.​—1 Tim. 6:​18, 19; 1 Jọn 2:17.

3 Onye Okike Ukwu anyị nwere otu nzukọ zuru ụwa ọnụ. Ọ bụkwa ya na-ekwu ihe a na-eme na ya n’ihi na ọ bụ ya bụ Onyeisi kachanụ. Anyị tụkwasịrị ya obi anyị niile. Ọ bụ Onyeikpe anyị, Eze anyị, na Onye na-enye anyị iwu. (Aịza. 33:22) Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye na-ahazi ihe nke ọma, ọ haziela otú anyị na ya ga-esi “na-arụkọ ọrụ” iji mezuo nzube ya.​—2 Kọr. 6:​1, 2.

4 Ka oge Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a na-erukwu nso, anyị ga na-eme ihe Kraịst Jizọs kwuru, bụ́ Eze Chineke họpụtara ka ọ na-edu anyị. (Aịza. 55:4; Mkpu. 6:2; 11:15) Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-arụ ihe karịrị ihe yanwa rụrụ mgbe o jere ozi n’ụwa. (Jọn 14:12) Ihe a Jizọs kwuru ga-eme n’ihi na ndị na-eso ụzọ ya ga-emecha hie nne, kwusaakwa ozi ọma n’ọtụtụ ebe ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụ ozi ọma Alaeze Chineke ka ha ga-ekwusa n’ụwa niile.​—Mat. 24:14; 28:​19, 20; Ọrụ 1:8.

5 Ihe ahụ Jizọs kwuru emezuola. Ma, Jizọs kwuru hoo haa na a ga-akwụsị ikwusa ozi ọma a mgbe Jehova chọrọ ka a kwụsị ya. Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na oké ụbọchị Jehova nke dị egwu, dị nso.​—Joel 2:31; Zef. 1:​14-18; 2:​2, 3; 1 Pita 4:7.

Anyị kwesịrị ịgbalịsikwu ike na-eme ihe Chineke chọrọ. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịmata otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ

6 Ka anyị na-amụta ihe bụ́ uche Jehova n’oge ikpeazụ a, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-erubere Chineke isi. Ihe ga-enyere anyị aka ime nke a bụ ịmata otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ nakwa ime ihe ndị nzukọ a chọrọ ka anyị na-eme. Ihe ndị a na-eme ná nzukọ Jehova gbakwasịrị ụkwụ n’iwu ndị Chineke nyere anyị, ụkpụrụ ya, ihe ndị ọ na-echetara anyị nakwa ihe ndị ọ na-akụziri anyị na Baịbụl.​—Ọma 19:​7-9.

7 Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a Jehova na-akụziri anyị, ọ ga-eme ka anyị dịrị n’otu ma na-arụkọ ọrụ ọnụ. (Ọma 133:1; Aịza. 60:17; Rom 14:19) Gịnị na-eme ka anyị na ụmụnna anyị niile dịrị n’otu? Ọ bụ ịhụnanya. Anyị hụrụ ibe anyị n’anya, yirikwa ịhụnanya dị ka uwe. (Jọn 13:​34, 35; Kọl. 3:14) Ọ bụ maka na anyị dị n’otu mere anyị na ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe ji na-emekọ ihe ọnụ.

NDỊ OHU JEHOVA NDỊ NỌ N’ELUIGWE SO NÁ NZUKỌ JEHOVA

8 Jehova gosiri ndị amụma ya bụ́ Aịzaya, Ezikiel, na Daniel ọhụụ banyere otú ndị ohu ya nọ n’eluigwe si arụ ọrụ. (Aịza., isi 6; Ezik., isi 1; Dan. 7:​9, 10) Jehova gosikwara Jọn onyeozi ọhụụ gbasara ndị ohu ya a nọ n’eluigwe, Jọn akọwaara anyị ihe ụfọdụ gbasara ha n’akwụkwọ Mkpughe. Jọn hụrụ Jehova ka ọ nọ ọdụ n’ocheeze ya dị ebube, hụkwa ndị mmụọ ozi ka ha gbara ya gburugburu. Ndị mmụọ ozi ahụ na-ekwu, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile dị, bụ́ onye dịbu adị na onye dị adị na onye na-abịa.” (Mkpu. 4:8) Jọn hụkwara “nwa atụrụ nke guzo n’etiti ocheeze ahụ,” ya bụ, Nwa Atụrụ Chineke bụ́ Jizọs Kraịst.​—Mkpu. 5:​6, 13, 14; Jọn 1:29.

9 N’ọhụụ a Jọn hụrụ, Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya. Nke a gosiri na ọ bụ ya bụ Onyeisi ndị ohu ya niile nọ n’eluigwe. 1 Ihe E Mere 29:​11, 12 kwuru gbasara Jehova na ọkwá ukwu ọ nọ na ya, sị: “Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu na ike na ịma mma na ebube na nsọpụrụ; n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị. Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile, ọ bụ gị nwe alaeze. Akụnụba na ebube si n’aka gị, ọ bụkwa gị na-achị ihe niile; ike na ịdị ukwuu dị n’aka gị, ikike ime ka a dị ukwuu na inye mmadụ niile ume dịkwa n’aka gị.”

10 Ebe ọ bụ na Jehova na Jizọs na-arụkọ ọrụ, Jizọs nọkwa n’ọkwá dị elu n’eluigwe. Chineke nyekwara ya ikike dị ukwuu. Baịbụl kwuru na Chineke ‘doro ihe niile n’okpuru ụkwụ ya, meekwa ya onyeisi nke ihe niile n’ihi ọgbakọ ya.’ (Efe. 1:22) Pọl onyeozi kwuru banyere Jizọs, sị: “Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ, ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala, ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.” (Fil. 2:​9-11) N’ihi ya, obi siri anyị ike na Jizọs Kraịst bụ ezigbo onye ndú.

11 Daniel onye amụma hụrụ Onye Ochie ahụ n’ọhụụ ka Ọ nọ ọdụ n’ocheeze ya n’eluigwe, hụkwa ndị mmụọ ozi dị “puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi, nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.” (Dan. 7:10) Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi a “ndị mmụọ na-ejere ọha mmadụ ozi, ndị e zipụrụ ijere ndị ga-eketa nzọpụta ozi.” (Hib. 1:14) A haziri ndị mmụọ ozi ndị a ahazi ma a bịa n’ihe banyere ‘ocheeze, ịbụisi, ọchịchị, na ikike.’​—Kọl. 1:16.

12 Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge tụgharịa uche n’otú e si hazie ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe, anyị ga-aghọta ihe mere Aịzaya ji kwuo ihe o kwuru mgbe ọ hụrụ Jehova n’ọhụụ “ka ọ nọ n’ocheeze dị elu, nke e bulikwara elu,” nakwa “ndị seraf guzo n’elu ya.” Aịzaya sịrị: “Efuola m! N’ihi na ọ fọrọ nke nta ka m nwụọ, n’ihi na abụ m onye egbugbere ọnụ ya na-adịghị ọcha, ọ bụkwa n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha na-adịghị ọcha ka m bi; n’ihi na anya m ahụwo Eze bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha!” O doro anya na ezigbo ụjọ tụrụ Aịzaya mgbe ọ hụchara otú Jehova si hazie ndị ohu ya nọ n’eluigwe. O mekwara ka ọ ghọta na o nweghị ihe ya bụ. Ọhụụ a metụrụ ya n’ahụ́ nke na mgbe e si n’eluigwe jụọ gbasara onye ga-aga kpọsaa ihe Jehova kpebiri ime ndị ajọ omume, Aịzaya kwuru, sị: “Lee m! Ziga m!”​—Aịza. 6:​1-5, 8.

13 Ọ bụrụ na anyị aghọta otú nzukọ Jehova si arụ ọrụ, jirikwa ya kpọrọ ihe, anyị ga-enwe ụdị obi ahụ Aịzaya nwere. Ebe ọ bụ na nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ihu, anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị soro ya na-aga ụkwụ na ụkwụ. Anyị ga na-agbalịsi ike eme ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị.

NZUKỌ JEHOVA NA-AGA N’IHU N’IHU

14 N’ọhụụ Jehova gosiri Ezikiel n’Ezikiel isi mbụ, ọ hụrụ Jehova ka ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya na-agba n’eluigwe. Ụgbọ ịnyịnya a nọchiri anya ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe. Otú Jehova si agba ụgbọ ịnyịnya a bụ na ọ na-eduzi ndị ohu ya a nke ọma ma na-eji ha emezu nzube ya.​—Ọma 103:20.

15 Ụgbọ ịnyịnya a nwere wiil ndị dị na ya. Wiil nke ọ bụla nwekwara wiil n’ime ya. Wiil niile a hà nhata. Ọ bụ ya mere e nwere ike iji sị na wiil ndị ahụ “nwere ike ịga n’akụkụ anọ ha.” (Ezik. 1:17) Wiil ndị ahụ nwere ike iche ihu ebe ọzọ n’otu ntabi anya. Ma, nke a apụtaghị na o nweghị onye nwere ọgụgụ isi na-eduzi ụgbọ ịnyịnya a. Jehova anaghị ahapụ nzukọ ya ka ọ na-aga otú masịrị ya. Ezikiel 1:20 kwuru, sị: “Ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa, ha agaa.” N’ihi ya, ọ bụ Jehova na-eji mmụọ ya edu nzukọ ya ebe ọ bụla ọ chọrọ ka ọ gaa. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ so nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ?’

16 Mmadụ iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ apụtaghị naanị ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ihe kacha mkpa ọ pụtara bụ mmadụ ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ, nakwa ya na Chineke ịdị ná mma. Anyị kwesịrị ‘ịchọpụta ihe ndị ka mkpa’ ma na-ahụ na anyị ma ihe niile nzukọ Jehova na-akụziri anyị ugbu a. (Fil. 1:10; 4:​8, 9; Jọn 17:3) Anyị kwesịkwara icheta na ihe na-eme ka ihe na-aga were were ná nzukọ ọ bụla bụ ịhazi ihe nke ọma na mmadụ niile nọ ná nzukọ ahụ ịna-emekọ ihe ọnụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ihe Jehova na-akụziri anyị, oge anyị, ike anyị, na ihe ndị anyị nwere, na-ejere ya ozi nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-eso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ, anyị ga na-eme ihe ndị anyị na-akụziri ndị mmadụ.

17 Jehova ji nzukọ ya na-enyere anyị aka ịna-eme uche ya. Anyị kwesịrị icheta na Onye na-agba ụgbọ ịnyịnya ahụ dị n’eluigwe bụ Jehova. N’ihi ya, anyị soro ụgbọ ịnyịnya a ma ọ bụ nzukọ Jehova ụkwụ na ụkwụ, ọ na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova, bụ́ Oké Nkume anyị ùgwù, nakwa na anyị tụkwasịrị ya obi. (Ọma 18:31) Baịbụl kwuru, sị: “Jehova ga-enye ndị ya ume. Jehova ga-eji udo gọzie ndị ya.” (Ọma 29:11) Ebe ọ bụ na anyị nọ ná nzukọ Jehova, Jehova na-enye anyị ike, na-emekwa ka anyị na-adị n’udo. O doro anya na Jehova ga na-agọzi anyị ka anyị na-eme uche ya ugbu a nakwa ruo mgbe ebighị ebi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya