Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 3 p. 17-23
  • “Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊMATA ONYE BỤ́ “OHU AHỤ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI, ONYE NWEKWARA UCHE”
  • GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI ‘NA-ECHETA NDỊ NA-EDU NDÚ’?
  • OTÚ ANYỊ SI EGOSI NA ANYỊ NA-AKWADO JEHOVA NA NZUKỌ YA
  • “Ònye n’Ezie Bụ Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Onye Nwekwara Uche?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ha “Na-eso Nwa Atụrụ Ahụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Ohu” nke Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ma Nwee Uche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Onye ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, na Òtù Na-achị Isi Na-anọchite Anya Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 3 p. 17-23

ISI NKE 3

“Na-echetanụ Ndị Na-edu Ndú n’Etiti Unu”

Ọ BỤ Pọl kwuru ihe a e ji mere isiokwu. Ihe a o kwuru dị ná Ndị Hibru 13:7. Malite na Pentikọst afọ 33, ndịozi Jizọs Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-edu ndú n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụ ha bụ òtù na-achị isi n’oge ahụ. Ọ bụkwa ha na-ahazi ihe a na-akụziri ọgbakọ Ndị Kraịst a malitere ọhụrụ. (Ọrụ 6:​2-4) Ma n’ihe dị ka afọ 49, ọ bụghịzi naanị ndịozi Jizọs bụ òtù na-achị isi. Mgbe e kpebiri ihe a ga-eme n’okwu gbasara ibi úgwù, ọ bụzi “ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem” bụ òtù na-achị isi. (Ọrụ 15:​1, 2) Ọ bụ ha na-agwa Ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ niile ihe ha ga na-eme. Otú ha si eme ya bụ na ha na-edegara ọgbakọ niile akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi ndị a gbara ọgbakọ ndị ahụ ume, meekwa ka ha na-ekwu otu ihe ma na-eme otu ihe. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ mere ihe òtù na-achị isi gwara ha. Jehova gọzikwara ha ma mee ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ.​—Ọrụ 8:​1, 14, 15; 15:​22-31; 16:​4, 5; Hib. 13:17.

2 Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ụfọdụ ndị malitere ịkụzi ihe ndị na-abụghị eziokwu n’ọgbakọ, mechaakwa pụọ n’ọgbakọ. (2 Tesa. 2:​3-12) Jizọs ji ọka wit na ata mee ihe atụ banyere ya. N’ihe atụ a, ọka wit nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ, ata anọchie anya Ndị Kraịst adịgboroja. A hapụrụ ọka wit na ata ahụ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi, ya bụ, “n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.” Ha tokọrọ ruo ọtụtụ narị afọ. (Mat. 13:​24-30, 36-43) N’oge ahụ, Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ iche iche ma na-erubere Jizọs isi. Ma e nweghị òtù na-achị isi, e nweghịkwa ndị Jizọs họpụtara n’ụwa ka ha na-eduzi ndị na-eso ụzọ ya n’oge ahụ. (Mat. 28:20) Ma, Jizọs kwuru na ihe ga-agbanwe n’oge owuwe ihe ubi.

3 O nwere otu ajụjụ dị mkpa Jizọs jụrụ. Ọ jụrụ, sị: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche?” O ji ajụjụ a bido ihe atụ o mere banyere otu n’ime ihe ndị a ga-eji mara “ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 24:​3, 42-47) Jizọs kwuru na ohu a kwesịrị ntụkwasị obi ga na-enye ndị Chineke nri, ya bụ, ha ga na-akụziri ha Okwu Chineke “n’oge kwesịrị ekwesị.” N’oge ndịozi, ọ bụ ụmụ nwoke ole na ole ka Jizọs si n’aka ha kụziere ndị niile na-eso ụzọ ya ihe. O sighị n’aka otu onye. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’oge ọgwụgwụ a. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi Jizọs si n’aka ya na-akụziri Ndị Kraịst ihe bụ ụmụ nwoke ole na ole, ọ bụghị otu onye.

ỊMATA ONYE BỤ́ “OHU AHỤ KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI, ONYE NWEKWARA UCHE”

4 Ònye ka Jizọs họpụtara inye ndị na-eso ụzọ ya nri? O doro anya na ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ụwa. Baịbụl kpọrọ ha “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze.” A gwara ha ka ha ‘kwusaa n’ebe niile ịdị mma nke onye ahụ kpọpụtara ha n’ọchịchịrị wee kpọba ha n’ìhè ya dị ebube.’ (1 Pita 2:9; Mal. 2:7; Mkpu. 12:17) Ọ̀ bụ ndị niile e tere mmanụ nọ n’ụwa bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi? Mba. Mgbe Jizọs rụrụ ọrụ ebube mee ka obere nri e nwere mụbaa, o nyere ya ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya ekesaziere ya ìgwè mmadụ ruru ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise, n’agụnyeghị ụmụ nwaanyị na ụmụaka. (Mat. 14:19) O si n’aka mmadụ ole na ole nye ọtụtụ ndị nri. O sikwa otú ahụ enye ndị Chineke nri taa, ya bụ, na-akụziri ha Okwu Chineke.

5 N’ihi ya, “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche,” bụ mmadụ ole na ole n’ime ụmụnna nwoke e tere mmanụ. Ọ bụ ha na-akwadebe ihe a na-akụziri ọgbakọ dị iche iche n’oge ọnụnọ Kraịst. (Luk 12:42) Kemgbe oge ikpeazụ a, ụmụnna ndị ahụ e tere mmanụ, ndị bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị. Taa, ọ bụ ha bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

6 Kraịst si n’aka ha na-akụziri anyị otú amụma ndị dị na Baịbụl si na-emezu, na-akụzikwara anyị otú anyị nwere ike isi na-eme ihe Baịbụl kwuru n’oge ọ bụla. Ha na-esi n’aka ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-akụzi ihe ndị a. (Aịza. 43:10; Gal. 6:16) N’oge a na-ede Baịbụl, ọ bụ ohu a tụkwasịrị obi na-elekọta ụlọ nna ya ukwu. Otú ahụ ka ọ dịkwa ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. Ọ bụ ha ka e nyere ọrụ ilekọta ihe niile Jizọs nwere n’ụwa. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ bụ ego na ihe ndị ọzọ nzukọ a nwere, ozi ọma anyị na-ekwusa, ihe ndị a na-akụzi ná mgbakọ, ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na ịhọpụta ndị okenye ka ha na-arụ ọrụ dị iche iche ná nzukọ a. Ihe ndị a niile na-abara ‘ezinụlọ Jizọs’ uru.​—Mat. 24:45.

7 Ole ndị bụ ‘ezinụlọ a’? Ha bụ ndị a na-enye nri. N’oge mbụ, ọ bụ naanị Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ ezinụlọ a. Ma ka oge na-aga, “oké ìgwè mmadụ” ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ bịara soro n’ezinụlọ a. (Jọn 10:16) Ma ndị e tere mmanụ ma ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ na-eri nri ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ewepụta.

8 Mgbe Jizọs ga-abịa ikpe ndị ajọ omume ikpe na ibibi ha n’oge oké mkpagbu, ọ ga-eme ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi “onye na-elekọta ihe niile o nwere.” (Mat. 24:​46, 47) Ndị bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-aga eluigwe. Ha na ndị ọzọ so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. Ha gachaa eluigwe, a gaghịzi enwe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche n’ụwa. Ma, Jehova na Jizọs ga-ahọpụta ndị ga-abụ “ndị isi,” si n’aka ha na-agwa ndị Alaeze Mesaya ga-achị n’ụwa ihe ha ga na-eme.​—Ọma 45:16.

GỊNỊ MERE ANYỊ GA-EJI ‘NA-ECHETA NDỊ NA-EDU NDÚ’?

9 E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ‘na-echeta ndị na-edu ndú’ ma na-erubere ha isi. Ma, olee uru ọ ga-abara anyị? Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.” (Hib. 13:17) Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi n’ihi na ha na-enyere anyị aka ka anyị na Chineke dịrị ná mma nakwa ka ihe gaziere anyị.

10 Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 16:​14, sị: “Ka ihe niile unu na-eme bụrụ n’ịhụnanya.” Ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere ha ji eme mkpebi na-abara anyị uru. Baịbụl kwuru gbasara ịhụnanya ná 1 Ndị Kọrịnt 13:​4-8, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya adịghị ada ada.” Ebe ọ bụ na ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova na-eme mkpebi ndị na-abara anyị uru n’ihi na ha hụrụ anyị n’anya, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-eme ihe ha gwara anyị. Anyị kwesịkwara ịghọta na ọ bụ Jehova na-eji ha agwa anyị ihe ndị ahụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.

Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova isi ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma

11 Jehova ji ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-eduzi nzukọ ya taa otú o mere n’oge ndịozi. Tupu oge ndịozi, Jehova jikwa ndị na-ezughị okè mezuo nzube ya. Noa rụrụ ụgbọ, kọọkwara ndị mmadụ banyere mbibi Chineke chọrọ ibibi ndị ajọ omume n’oge ahụ. (Jen. 6:​13, 14, 22; 2 Pita 2:5) Jehova họpụtara Mozis ka o duru ụmụ Izrel pụta n’ala Ijipt. (Ọpụ. 3:10) O ji mmụọ nsọ ya duzie ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ha edee Baịbụl. (2 Tim. 3:16; 2 Pita 1:21) N’agbanyeghị na ọ bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè ka Jehova ji na-eduzi ozi ọma anyị na-ekwusa, anyị ekwesịghị inyo ihe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị enyo. Kama, obi kwesịrị isi anyị ike n’ihi na anyị ma na ihe niile nzukọ a merela agaraghị enwe isi ma a sị na Jehova anaghị akwado ya. Kemgbe ọtụtụ afọ, ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi merela egosila na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke na-edu ha n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ bịaara ha. Jehova agọziela nzukọ ya nke ukwuu. N’ihi ya, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-akwado nzukọ Jehova ma na-eme ihe a na-agwa anyị.

OTÚ ANYỊ SI EGOSI NA ANYỊ NA-AKWADO JEHOVA NA NZUKỌ YA

12 Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-egosi na ha na-akwado Jehova na nzukọ ya ma ha na-arụ ọrụ ha nke ọma n’ọgbakọ. (Ọrụ 20:28) Ebe anyị niile bụ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị ji obi anyị niile ekwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, na-aga nletaghachi ma na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. (Mat. 24:14; 28:​19, 20) Ka anyị nwee ike ịmụta ihe n’ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-akụziri anyị, anyị kwesịrị ịna-akwadebe ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe tupu anyị agawa. Anyị kwesịkwara ịna-aga mgbakọ anyị dị iche iche. Ọmụmụ ihe na mgbakọ anyị na-aga na-eme ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume.​—Hib. 10:​24, 25.

13 Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị anyị nwere na-akwado nzukọ Jehova, ọ na-egosi na anyị na-eme ihe nzukọ a na-agwa anyị. (Ilu 3:​9, 10) Ọ bụrụkwa na anyị ahụ ụmụnna anyị ndị ihe na-esiri ike, anyị na-agbatara ha ọsọ enyemaka ozugbo. (Gal. 6:10; 1 Tim. 6:18) Ihe mere anyị ji eme ya bụ na anyị hụrụ ha n’anya. Anyị na-adị njikere mgbe niile inyere ụmụnna anyị aka n’ihi na ọ bụ ụzọ anyị si egosi Jehova na nzukọ ya na obi dị anyị ụtọ maka ihe ha na-emere anyị.​—Jọn 13:35.

14 Otú ọzọ anyị si egosi na anyị na-akwado nzukọ Jehova bụ ịna-eme ihe a na-agwa anyị. Otú anyị nwere ike isi mee ya bụ ime ihe ndị okenye na ndị nlekọta sekit na-agwa anyị. Ụmụnna ndị a so ná “ndị na-edu ndú” Baịbụl kwuru ka anyị na-erubere isi. (Hib. 13:​7, 17) Ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ihe mere ha ji sị anyị mee ihe ụfọdụ, anyị ma na ihe ndị ahụ ga-abara anyị uru ma anyị mee ha. Jehova na-agọzikwa anyị n’ihi na anyị na-eme ihe nzukọ ya na Okwu ya na-akụziri anyị. Ihe ndị a anyị na-eme na-egosikwa na anyị na-erubere Nna anyị ukwu bụ́ Jizọs Kraịst isi.

15 Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-eme ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-agwa anyị. Setan, bụ́ onye na-achị ụwa a, na-eme ike ya niile iji hụ na e mebiri aha Jehova na nzukọ ya. (2 Kọr. 4:4) Ekwela ka Setan kpara gị aka. (2 Kọr. 2:11) Ọ ma na o nwere naanị “oge dị mkpirikpi” tupu a tụba ya n’abis. N’ihi ya, ọ na-agbalịsi ike ime ka ọtụtụ ndị na-efe Jehova kwụsị ife ya. (Mkpu. 12:12) Ka anyị niile gbaa mbọ bịarukwuo Jehova nso n’agbanyeghị ihe niile Setan na-eme ka anyị kwụsị ife Jehova. Ka anyị niile tụkwasị Jehova obi, tụkwasịkwa ndị o ji na-eduzi nzukọ ya taa obi. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-adị n’otu n’ụwa niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya