ISI NKE 14
Ịhụ na Ọgbakọ Na-adị n’Udo ma Na-adị Ọcha
ỌTỤTỤ puku mmadụ na-abata n’ọgbakọ Jehova kwa afọ. Ihe a na-emezu otu amụma dị na Baịbụl. (Maị. 4:1, 2) Obi dị anyị ụtọ ịnabata ha ‘n’ọgbakọ Chineke.’ (Ọrụ 20:28) Obi dị ha ụtọ na ha so anyị na-ejere Jehova ozi ná nzukọ ya dị ọcha ma dịrị n’otu. Mmụọ nsọ Chineke na ezigbo ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịna-adị n’udo na ime ka ọgbakọ na-adị ọcha.—Ọma 119:105; Zek. 4:6.
2 Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ‘ga-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ.’ (Kọl. 3:10) Anyị na-eleghara ụmụ irighiri esemokwu na nghọtahie anyị na ndị ọzọ na-enwe anya. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú Jehova si ele ya, anyị ga-agbara ihe ọ bụla ga-ekewa anyị ọsọ. Anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị dịrị n’otu n’ụwa niile.—Ọrụ 10:34, 35.
3 Ma mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ndị nwere ike ịkpa udo ọgbakọ aka ọjọọ. Gịnị na-akpata ya? Ọ na-abụkarị emeghị ihe Baịbụl kwuru. Ihe ọzọkwa bụ na anyị ezughị okè. O nweghịkwa onye n’ime anyị na-anaghị eme mmehie. (1 Jọn 1:10) Nwanna nwere ike ịzọhie ụkwụ, ụkwụ ahụ ọ zọhiere emee ka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ kpawa àgwà ọjọọ ma ọ bụ kwụsị ife Chineke nke ọma. Anyị nwere ike ịgwa ibe anyị okwu ọjọọ ma ọ bụ mee ihe wutere ha. Anyị nwekwara ike ịsụ ngọngọ n’ihi ihe nwanna gwara anyị ma ọ bụ ihe o mere anyị. (Rom 3:23) Ọ bụrụ na ụdị ihe ndị a emee, gịnị ka anyị ga-eme ka ihe dị mma?
4 Jehova ma ihe niile a anyị na ha na-alụ, ọ hụkwara anyị n’anya. Na Baịbụl, ọ gwara anyị ihe ndị anyị ga-eme ma e nwee ụdị nsogbu ndị ahụ. O nyekwara anyị ndị okenye hụrụ anyị n’anya ka ha na-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ha si n’Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, anyị na ụmụnna anyị ga-adịghachi ná mma, anyị ga na-efekwa Jehova otú ọ chọrọ. Ọ bụrụ na a dọọ anyị aka ná ntị n’ihi àgwà ọjọọ ụfọdụ anyị kpara, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ bụ otú Nna anyị nke eluigwe si egosi na ya hụrụ anyị n’anya.—Ilu 3:11, 12; Hib. 12:6.
IDOZI OBERE ESEMOKWU
5 Mgbe ụfọdụ, nwanna na nwanna nwere ike ise obere okwu. Ụdị ihe a mee, e kwesịrị iji obiọma dozie ya ngwa ngwa. (Efe. 4:26; Fil. 2:2-4; Kọl. 3:12-14) O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na e nwere ike idozi okwu gị na nwanna ọzọ sere ma ọ bụrụ na unu emee otu ihe Pita onyeozi kwuru. Ọ sịrị ka anyị ‘nwee ịhụnanya siri ike n’ebe ibe anyị nọ.’ (1 Pita 4:8) Baịbụl kwuru, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị ọzọ ihe anyị chọrọ ka ha meere anyị, anyị ga na-agbaghara ha obere ihe ndị ha mere anyị ma chefuo ha.—Mat. 6:14, 15; 7:12.
6 Ọ bụrụ na ị chọpụta na ihe ị gwara nwanna ma ọ bụ ihe i mere ya wutere ya, i kwesịrị ịga ozugbo ka gị na ya dozie. Cheta na o metụtara adịm ná mma gị na Jehova. Jizọs dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.” (Mat. 5:23, 24) O nwere ike ịbụ na unu ghọtahiere ibe unu. Ọ bụrụ otú ahụ, gbalịa ka gị na ya kwurịta okwu. Ọ bụrụ na ụmụnna na ibe ha ana-ekwurịta okwu nke ọma, ọ ga-eme ka ha ghara ịna-aghọtahie ibe ha, meekwa ka ha dozie nsogbu ndị ha nwere n’ihi ezughị okè.
IJI AKWỤKWỌ NSỌ DỤỌ NDỊ ZỌHIERE ỤKWỤ ỌDỤ
7 Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na nwanna azọhiela ụkwụ, ha na-eji Baịbụl dụọ ya ọdụ. Ma, ọ naghị adịcha mfe mgbe niile. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst nọ na Galeshia, sị: “Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ tupu ya amara na ọ zọhiere ụkwụ, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ, gbalịanụ iji mmụọ dị nwayọọ gbazie onye ahụ.”—Gal. 6:1.
8 Ndị okenye na-agba mbọ enyere ụmụnna ha aka ka ha kwụsie ike mgbe nsogbu ndị nwere ike imebi okwukwe ha bịaara ha. Ha na-enyekwa aka eme ka a ghara inwe ezigbo nsogbu n’ọgbakọ. Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwuo gbasara ndị okenye, sị: “Onye nke ọ bụla ga-adị ka ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.” (Aịza. 32:2) Ndị okenye na-agba mbọ elekọta ọgbakọ otú a Jehova kwuru.
ỊRỊBA NDỊ NA-ADỊGHỊ AGAZI AGAZI AMA
9 Pọl onyeozi gwara ụmụnna ya ka ha kpachara anya maka ụfọdụ ụmụnna nwere ike imebi okwukwe ha. Ọ gwara ha, sị: “Anyị na-enye unu iwu . . . ka unu zere nwanna ọ bụla nke na-adịghị agazi agazi, nke na-adịghịkwa eso omenala unu natara n’aka anyị.” Ọ gwakwara ha ihe mere ka ihe a o kwuru dokwuo ha anya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị erube isi n’okwu anyị kwuru site n’akwụkwọ ozi a, rịbanụ onye ahụ ama, unu na ya kwụsị ịkpakọrịta, ka ihere wee mee ya. Ma unu ewerela ya dị ka onye iro, kama na-adụnụ ya ọdụ dị ka nwanna.”—2 Tesa. 3:6, 14, 15.
10 Mgbe ụfọdụ, nwanna nwere ike ịjụ ime ihe otú Chineke chọrọ ka Ndị Kraịst na-eme, ma ihe ahụ ọ na-eme nwere ike ọ bụghị ihe dị oké njọ a ga-ekwo chụọ ya n’ọgbakọ. O nwere ike ịbụ na ọ na-eru unyi, ma ọ bụ na-akatọkarị ndị ọzọ, ma ọ bụkwanụ dịrị ezigbo umengwụ. O nwekwara ike ịbụ na ọ “na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị [ya].” (2 Tesa. 3:11) Ihe ọzọ nwere ike ịbụ na ọ na-akpakarị nkata igwu ndị ọzọ wayo ma ọ bụ na-eji ihe ndị na-adịghị mma atụrụ ndụ. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ọ na-eme dị njọ nke na o nwere ike ime ka a na-akpọ ọgbakọ aha ọjọọ, ma ọ bụ mee ka ụmụnna ndị ọzọ mewe ka ya.
11 Ihe mbụ ndị okenye ga-eme iji nyere ya aka bụ iji Baịbụl dụọ ya ọdụ. Ma, a dụọ ya ọdụ ugboro ugboro, ọ gbanweghị, ndị okenye nwere ike kpebie ịgwa ọgbakọ okwu ma kwuo banyere ihe ahụ onye ahụ na-eme. Tupu ndị okenye ekwuo okwu a n’ọgbakọ, ha ga-asa anya ná mmiri chọpụta ma àgwà ahụ ọ̀ dị oké njọ ma na-akpa ọgbakọ aka ọjọọ. Onye ga-ekwu ya ga-eme ka ọgbakọ ghọta otú ha kwesịrị isi na-ele àgwà ahụ anya, ma ọ gaghị akpọ aha nwanna ahụ ọ gbasara. O kwuchaa ya, ndị niile ma nwanna ahụ agaghịzi eso ya akpachi anya. Ma, ha na ya ka ga na-ekwurịta ihe ndị gbasara ofufe Chineke, ha ga ‘na-adụkwa ya ọdụ dị ka nwanna.’
12 Ọ bụrụ na ụmụnna akwụsị iso nwanna ahụ a rịbara ama akpachi anya, o nwere ike ime ka ihere onwe ya na-eme ya, ya akwụsị ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme. Ọ bụrụkwa na o doo ụmụnna anya na ọ kwụsịla ihe ahụ e kwo rịba ya ama, ha kwesịrị ịmaliteghachi iso ya na-akpachi anya.
IHE NWANNA GA-EME MA NWANNA MEE YA IHE ỌJỌỌ
13 Anyị kwesịrị ịna-eleghara ihe ọjọọ ụmụnna anyị mere anyị anya ma na-agbaghara ha. Ma, ọ pụtaghị na ihe ọjọọ ahụ ewuteghị anyị ma ọ bụ na ọ masịrị anyị. Ọ bụghị ihe ọjọọ ọ bụla mmadụ mere ka e kwesịrị ibo ezughị okè. Ọ dịghịkwa mma ileghara mmehie dị oké njọ anya. (Lev. 19:17; Ọma 141:5) Iwu Chineke nyere ndị Izrel gosiri na mmehie dị n’ụdị n’ụdị. Ndị Kraịst ghọtakwara ya otú ahụ.—1 Jọn 5:16, 17.
14 Jizọs kwuru otú a ga-esi edozi ihe ọjọọ nwanna mere nwanna. Ọ sịrị: “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, [nke mbụ] gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru. Ma ọ bụrụ na o geghị ntị, [nke abụọ] kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ, ka e wee site n’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu. Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, [nke atọ] gwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na o geghị ọbụna ọgbakọ ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọnaụtụ.”—Mat. 18:15-17.
15 N’ihi ihe atụ ọzọ Jizọs mere na Matiu 18:23-35, ọ ga-abụ na otu n’ime mmehie o kwuru okwu ha na Matiu 18:15-17 gbasara ego ma ọ bụ ihe ndị mmadụ nwere. O nwere ike ịbụ na nwanna jụrụ ịkwụghachi ego nwanna gbazinyere ya ma ọ bụkwanụ na o gwuru nwanna wayo. Mmehie ahụ nwekwara ike ịbụ na nwanna kwutọrọ nwanna ibe ya.
16 Ọ bụrụ na e nwee ihe gosiri na nwanna gị mere gị otu n’ime ihe ndị ahụ, agala ozugbo kọọrọ ya ndị okenye ka ha leba ya anya. Mee ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị gị buru ụzọ gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ gị. Gbalịa ka naanị gị na ya dozie okwu ahụ. Cheta na Jizọs asịghị gị ‘gaa naanị otu ugboro mee ka ọ mara ebe o mejọrọ gị.’ N’ihi ya, ọ bụrụ na onye ahụ ekwetaghị na ya mejọrọ gị ma ọ bụ jụ ịrịọ mgbaghara, ọ ga-adị mma ka ị gaghachi oge ọzọ. Ọ bụrụ naanị gị na ya doziri okwu ahụ, obi ga-atọ ya ụtọ na ị gwaghị ndị ọzọ ihe ahụ ma ọ bụ mebie aha ya n’ọgbakọ. I sila otú ahụ ‘rite nwanna gị n’uru.’
17 Ọ bụrụ na onye ahụ mehiere gị ekweta na ya mehiere, rịọ gị mgbaghara ma mezie ihe o mebiri, ọ baghị uru ịgbatịwa okwu ahụ. Ọ bụ eziokwu na ụdị ihe a o mere gị dị njọ, gị na ya naanị nwere ike idozi ya.
18 Ọ bụrụ na ị gaa mee ka nwanna mehiere gị mara ebe o mejọrọ “n’ebe naanị gị na ya nọ,” ma i ritelighị ya n’uru, ị ga-eme ihe nke abụọ Jizọs kwuru. “Kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ,” gaa ka gị na nwanna ahụ kpezie. Ụmụnna ga-eduga gị kwesịkwara iburu n’obi na ihe unu kwo aga bụ iji rite nwanna gị n’uru. Ọ kacha mma ka ha bụrụ ndị nọ mgbe ihe ahụ mere. Ma ọ bụrụ na e nweghị ndị nọ mgbe o mere, i nwere ike ịkpọrọ otu nwanna ma ọ bụ abụọ ka ha nọrọ mgbe gị na nwanna ahụ na-ekwurịta ya. Ha nwere ike ịbụ ndị ụdị okwu ahụ doro anya nakwa ndị nwere ike ịchọpụta ma è mejọrọ gị n’eziokwu. Ndị okenye so gaa ụdị okwu a anọchiteghị anya ọgbakọ, ebe ọ bụ na ọ bụghị ndị okenye ọgbakọ ha dunyere ha.
19 Ọ bụrụ na ị gaala ugboro ugboro ka naanị gị na ya dozie okwu ahụ, mechaakwa kpọrọ ndị ọzọ gaa ka unu dozie ya, ma unu edozilighị ya, ya abụrụkwa na ị chọghị ịhapụ okwu ahụ, i kwesịrị ịga kọọrọ ya ndị okenye ọgbakọ unu. Cheta na ebumnobi ndị okenye bụ ka ụmụnna na ibe ha dịrị n’udo nakwa ka ọgbakọ dịrị ọcha. Ị kọhaalara ya ndị okenye, hapụrụ ha ya ma tụkwasị Jehova obi. Ekwekwala ka àgwà onye ọzọ mee ka ị sụọ ngọngọ ma ọ bụ mee ka ozi ị na-ejere Jehova ghara ịna-atọ gị ụtọ.—Ọma 119:165.
20 Ndị okenye ga-ebu ụzọ chọpụta ma ihe ahụ ò mere eme n’eziokwu. Ọ bụrụ na ha achọpụta na ihe nwanna ahụ mere gị dị oké njọ ma ọ chọghị ichegharị ma mezie ihe o mebiri, ha nwere ike ịchụ ya n’ọgbakọ. Ha ga-esi otú ahụ chebe atụrụ Chineke ha na-elekọta ma mee ka ọgbakọ dị ọcha.—Mat. 18:17.
ILEBA ANYA N’OKWU GBASARA MMEHIE DỊ OKÉ NJỌ
21 E nwere mmehie ndị dị oké njọ ndị okenye kwesịrị ilebara anya. Ụdị mmehie ndị a abụghị ihe a ga-asị nwanna na nwanna gaa kpezie. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịkwa iko, di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị, nkwulu, izi ozizi ụgha, na mmehie ndị ọzọ yiri ha. (1 Kọr. 6:9, 10; Gal. 5:19-21) Ọ bụrụ na e nwee nwanna mere otu n’ime mmehie ndị a, e kwesịrị ịkọrọ ya ndị okenye ka ha leba ya anya. A gba ya nkịtị, ọ ga-eme ka ọgbakọ ghara ịdị ọcha, meekwa ka ụfọdụ ụmụnna kpawa àgwà ahụ. (1 Kọr. 5:6; Jems 5:14, 15) Ụfọdụ ụmụnna nwere ike ịbịakwute ndị okenye kwupụta mmehie ha ma ọ bụ kọọrọ ndị okenye nke ụmụnna ndị ọzọ mere. (Lev. 5:1; Jems 5:16) N’agbanyeghị otú ndị okenye si nụ ihe nwanna e merela baptizim mere, ha ga-edunye ndị okenye abụọ ka ha mee nchọpụta. Ọ bụrụ na ha achọpụta na ihe ahụ mere eme, e nweekwa ihe akaebe ndị gosiri na nwanna ahụ mere mmehie ahụ, ndị okenye ga-ehiwere ya kọmitii ikpe ka ha leba okwu ahụ anya. Kọmitii a ga-adị, ọ dịkarịa ala, ndị okenye atọ.
22 Ndị okenye na-elekọta atụrụ Chineke nke ọma. Ha na-agbalị ka ha chebe atụrụ Chineke ka ihe ọ bụla ghara imebi adịm ná mma ha na Chineke. Ha na-ejikwa Okwu Chineke adọ nwanna ọ bụla mere mmehie aka ná ntị ma mee ka ya na Chineke dịghachi ná mma. (Jud 21-23) Ihe a ha na-eme dabara na ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere Timoti. Ọ gwara ya, sị: “Ana m enyesi gị iwu ike n’ihu Chineke na Kraịst Jizọs, bụ́ onye a kara aka ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, . . . jiri ogologo ntachi obi niile na nkà izi ihe dọọ aka ná ntị, baa mba, gbaakwa ndị mmadụ ume.” (2 Tim. 4:1, 2) Ime otú ahụ nwere ike iwe oge, ma o so n’otu n’ime ọrụ tara akpụ ndị okenye na-arụ. Obi na-atọ ụmụnna ụtọ maka ọrụ ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ, ha na-agụ ha ná ndị “ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ.”—1 Tim. 5:17.
23 Mgbe ọ bụla ndị okenye chọpụtara na nwanna mere mmehie dị oké njọ, e hiwekwa kọmitii ikpe, ihe mbụ kọmitii ahụ ga-agba mbọ mee bụ inyere ya aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma. Ọ bụrụ na o ji obi ya niile chegharịa ma nabata aka ndị okenye nyeere ya, ha ga-adọ ya aka ná ntị na nzuzo ma ọ bụ n’ihu ndị gbara akaebe mgbe a na-ekpe ya ikpe. Aka ná ntị ahụ a dọrọ ya ga-eme ka ọ ghọta onwe ya ma mee ka ndị akaebe ahụ na-atụ egwu ime ihe ọjọọ ahụ o mere. (2 Sam. 12:13; 1 Tim. 5:20) Mgbe ọ bụla kọmitii ikpe dọrọ mmadụ aka ná ntị, ha ga-amachibido ya iwu ime ihe ụfọdụ n’ọgbakọ. Ha nwere ike isi otú ahụ nyere onye ahụ aka ka o ‘meere ụkwụ ya ụzọ kwụ ọtọ’ ka oge na-aga. (Hib. 12:13) Ka oge na-aga, nwanna ahụ malitekwa ime nke ọma n’ọgbakọ, a ga-ewepụ iwu ndị a machibidoro ya.
ỊMA ỌKWA NA A DỌỌLA NWANNA AKA NÁ NTỊ
24 Ọ bụrụ na kọmitii ikpe ahụ ekpebie na nwanna ahụ echegharịala n’eziokwu, ya abụrụkwa na ụmụnna ndị ọzọ ma ọ bụ ndị obodo nwere ike imecha nụ ihe ahụ o mere, ma ọ bụkwanụ na a chọrọ ka ọgbakọ kpachara anya banyere nwanna ahụ, a ga-ama ọkwa gbasara ya n’ọmụmụ ihe anyị a na-akpọ Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ. Otú a ka e kwesịrị isi maa ọkwa ahụ: “A dọọla [aha onye ahụ] aka ná ntị.”
Ọ BỤRỤ NA E KPEBIE ỊCHỤ ONYE AHỤ N’ỌGBAKỌ
25 Mgbe ụfọdụ, onye ahụ a na-ekpe ikpe na-ajụ ịnabata aka kọmitii ikpe chọrọ inyere ya, si otú ahụ gosi na ya achọghị ịhapụ àgwà ahụ. E nwere ike kọmitii ikpe ahụ ahụghị ihe ndị gosiri na onye ahụ rụrụ “ọrụ kwesịrị nchegharị” n’oge ahụ ha na-ekpe ya ikpe. (Ọrụ 26:20) Gịnịzi ka ha ga-eme? Ha kwesịrị ịchụ ya n’ọgbakọ n’ihi na o chegharịghị. A chụọ ya, e nweghịzi ihe jikọrọ anyị na ya. A na-esi otú ahụ mee ka ndị ọzọ ghara ịkpa ụdị àgwà ahụ ọ kpara, mee ka ọgbakọ dịrị ọcha n’ụzọ ọ bụla, meekwa ka a ghara ịna-akpọ ọgbakọ aha ọjọọ. (Diut. 21:20, 21; 22:23, 24) Ozugbo Pọl onyeozi nụrụ banyere àgwà ọjọọ otu nwanna nọ n’ọgbakọ Kọrịnt kpara, ọ gwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ ahụ ihe ha ga-eme. Ọ gwara ha ka ha “nyefee nwoke dị otú ahụ n’aka Setan . . . , ka e wee chebe ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ.” (1 Kọr. 5:5, 11-13) Pọl kwukwara banyere ndị ọzọ a chụrụ n’ọgbakọ n’oge ndịozi. A chụrụ ha n’ihi na ha malitere izi ozizi ụgha.—1 Tim. 1:20.
26 Ọ bụrụ na kọmitii ikpe ekpebie na a ga-achụ onye ha na-ekpe ikpe n’ọgbakọ n’ihi na o chegharịghị, ha kwesịrị ịgwa ya ihe ha kpebiri, gwakwa ya ebe ha gbakwasịrị ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ kpebie ịchụ ya n’ọgbakọ. Ha gwachaa ya ihe a, ha ga-agwa ya na ọ bụrụ na o chere na ha ekpetaghị ikpe ahụ ma chọọ ka e kpegharịa ya, ọ ga-edetara ha akwụkwọ. Ọ ga-ede ihe mere o ji chọọ ka e kpegharịa ya. Kọmitii ahụ ga-agwa ya na malite n’ụbọchị ahụ, ha nyere ya abalị asaa ka o dee akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na o detara ndị okenye akwụkwọ ahụ, ha ga-enye ya onye nlekọta sekit. Onye nlekọta sekit ga-ahọpụta ndị okenye ruru eru ka ha soro na kọmitii mkpegharị ikpe ga-elebagharị okwu ahụ anya. Ha kwesịrị ime ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na ha kpegharịrị ikpe ahụ n’ime otu izu a natachara akwụkwọ mkpegharị ikpe ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ detara akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ, a ga-ahapụgodị ịma ọkwa na a chụọla ya n’ọgbakọ. Ma, si n’oge ha kpebiri ịchụ ya n’ọgbakọ ruo mgbe e kpegharịchara ikpe ahụ, a ga-amachibido ya iwu ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na idu ọgbakọ n’ekpere nakwa ime ihe ndị ọzọ pụrụ iche n’ọgbakọ.
27 Ihe mere a ga-eji ekweta ikpegharị ikpe ya bụ iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya nakwa iji nye ya ohere ka o kwuo ihe ndị ọzọ na-enye ya nsogbu n’obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye ahụ e kpere ikpe akpachara anya jụ ịbịa mgbe a chọrọ ikpegharị ikpe ya, a gbaakwa mbọ ka ọ bịa ma ọ bịaghị, a ga-ama ọkwa na a chụọla ya n’ọgbakọ.
28 Ọ bụrụ na onye ahụ achọghị ka e kpegharịa ikpe ahụ, kọmitii ikpe ahụ ga-agwa ya ka ọ gbaa mbọ chegharịa, gwakwa ya ihe ndị ọ ga-eme ka a nabataghachi ya n’ọgbakọ ka oge na-aga. Ihe ndị a a ga-agwa ya ga-enyere ya aka ma mee ka ọ ghọta na a hụrụ ya n’anya. Ihe e bu n’obi na-agwa ya ihe ahụ bụ ka o nwee ike ịgbanwe ndụ ya ma ruo eruo ịlọghachi ná nzukọ Jehova ka oge na-aga.—2 Kọr. 2:6, 7.
ỊMA ỌKWA NA A CHỤỌLA MMADỤ N’ỌGBAKỌ
29 Ọ bụrụ na a ga-achụ mmadụ n’ọgbakọ n’ihi na o chegharịghị, a ga-amara ọgbakọ ọkwa. Otú a ka e kwesịrị isi maa ọkwa ahụ: “[Aha onye ahụ] abụghịzi Onyeàmà Jehova.” Ọkwa a ga-eme ka ụmụnna kwụsị iso ya na-akpa.—1 Kọr. 5:11.
MMADỤ IKEWAPỤ ONWE YA
30 Ọ bụrụ na nwanna e mere baptizim akpachara anya sị na ya achọzighị ịbụ Onyeàmà Jehova, a na-asị na o kewapụla onwe ya. Ọ bụrụkwa na nwanna emee ihe gosiri na ọ chọkwaghị ịbụ Onyeàmà Jehova, dị ka ihe atụ, sonyere otu n’ime òtù ndị na-eme ihe Baịbụl kpọrọ asị, si otú ahụ bụrụ onye Jehova Chineke mara ikpe, a na-asịkwa na o kewapụla onwe ya.—Aịza. 2:4; Mkpu. 19:17-21.
31 E nwere ihe Jọn onyeozi kwuru banyere ndị kewapụrụ onwe ha n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu; n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ.”—1 Jọn 2:19.
32 Mgbe mmadụ kewapụrụ onwe ya, ya na onye nkwusa na-anaghịzi eje ozi abụghị otu n’anya Jehova. E nwere ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ kwụsị ije ozi ọma. O nwere ike ịbụ na onye ahụ anaghị amụchi Okwu Chineke anya, ma ọ bụ na o nwere nsogbu bịaara ya ma ọ bụ na a na-akpagbu ya, ya emee ka ike gwụ ya ijere Jehova ozi. Ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ ga na-enyere nwanna dị otú ahụ aka ka ọ maliteghachi ije ozi.—Rom 15:1; 1 Tesa. 5:14; Hib. 12:12.
33 Ma ọ bụrụ na nwanna ekewapụ onwe ya, a ga-amara ọgbakọ ọkwa. Otú a ka e kwesịrị isi maa ọkwa ahụ: “[Aha onye ahụ] abụghịzi Onyeàmà Jehova.” Ụmụnna agaghịzi eso ya na-emekọ ihe otú ahụ ha si eme onye a chụrụ n’ọgbakọ.
ỊNABATA ONYE A CHỤRỤ N’ỌGBAKỌ
34 Ọ bụrụ na onye a chụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ onye kewapụrụ onwe ya emee ihe ndị gosiri na o jirila obi ya niile chegharịa, ya abụrụkwa na ezigbo oge agafeela kemgbe ọ kwụsịrị àgwà ọjọọ ahụ ọ kpara, e nwere ike ịnabata ya. O gosila na ọ chọrọ ka ya na Jehova dịghachi ná mma. Ma, ndị okenye na-echere ka ezigbo oge gafee, ikekwe, ọtụtụ ọnwa, otu afọ, ma ọ bụdị karịa, dabere n’otú ihe si dị, ka onye ahụ gosi na o ji obi ya niile chegharịa. Ndị okenye nata akwụkwọ o dere ka a nabata ya, kọmitii ga-anabata onye ahụ n’ọgbakọ ga-eso ya kwurịta ya. Kọmitii ahụ ga-achọpụta ma è nwere ihe onye ahụ merela gosiri n’eziokwu na ọ rụọla “ọrụ kwesịrị nchegharị.” Ha ga-ejizi ya mara ma hà ga-anabata ya ma hà ka ga-echeretụ.—Ọrụ 26:20.
35 Ọ bụrụ na a nọ n’ọgbakọ ọzọ chụpụ onye ahụ na-arịọ ka a nabata ya, ndị okenye ọgbakọ ọ na-agazi ọmụmụ ihe n’ọgbakọ ha ga-ehiwe kọmitii ga-anabata ya n’ọgbakọ. Kọmitii ahụ ga-eso ya kwurịta ya ma leba okwu ya anya. Ọ bụrụ na kọmitii a echee na e kwesịrị ịnabataghachi ya, ha ga-edegara ndị okenye nke ọgbakọ lebaburu okwu ya anya akwụkwọ, gwa ha ihe ha chere. Kọmitii abụọ ahụ ga-agbakọ aka chọpụta ihe niile bụ́ eziokwu n’okwu ahụ tupu ha ekpebie ihe a ga-eme. Ma, ọ bụ kọmitii e hiwere n’ọgbakọ mbụ ahụ kpere ya ikpe, nke ga-ahụ maka ịnabata ya n’ọgbakọ, ga-ekpebi ka a nabata ya.
ỊMA ỌKWA NA A NABATALA ONYE A CHỤRỤ N’ỌGBAKỌ
36 Mgbe o doro kọmitii ahụ ga-ekpebi ka a nabata ya n’ọgbakọ anya na onye ahụ a chụrụ achụ ma ọ bụ onye kewapụrụ onwe ya echegharịala n’eziokwu, na e kwesịkwara ịnabata ya, a na-ama ọkwa n’ọgbakọ mbụ ahụ lebara okwu ya anya. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ n’ọgbakọ ọzọ ugbu a, a ga-amakwa ọkwa ahụ n’ebe ahụ. Otú a ka e kwesịrị isi maa ọkwa ahụ: “A nabatala [aha onye ahụ]. Ọ bụrụghachila Onyeàmà Jehova.”
MGBE ỤMỤAKA E MERE BAPTIZIM MERE MMEHIE DỊ OKÉ NJỌ
37 Ọ bụrụ na ụmụaka e mere baptizim emee mmehie dị oké njọ, e kwesịrị ịkọrọ ya ndị okenye. Mgbe ndị okenye na-ekpe nwatakịrị mere mmehie dị oké njọ ikpe, ọ kacha mma ka nne na nna ya e mere baptizim nọrọ ya. Ha nọrọ ya, ha kwesịrị ịkwado ndị okenye kama ịna-agbachitere nwa ha ka a ghara ime ya ihe e kwesịrị ime ya. Ndị okenye ga-ekpe ya ikpe otú e si ekpe ụmụnna ndị ọzọ. Ha ga-agbalị inyere ya aka ka ya na Chineke dịghachi ná mma. Ma, ọ bụrụ na o chegharịghị, a ga-achụ ya n’ọgbakọ.
MGBE NDỊ NKWUSA A NA-EMEBEGHỊ BAPTIZIM MERE IHE ỌJỌỌ
38 Olee ihe a ga-eme ma ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim mee mmehie dị oké njọ? A gaghị achụ ha n’ọgbakọ ebe ọ bụ na e mebeghị ha baptizim. Ma, o nwere ike ha aghọtachabeghị ihe Baịbụl kwuru ka anyị na-eme. N’ihi ya, e nwere ike iji obiọma dụọ ha ọdụ ma nyere ha aka imere ụkwụ ha “ụzọ kwụ ọtọ.”—Hib. 12:13.
39 Ọ bụrụ na onye nkwusa a na-emebeghị baptizim mere mmehie dị oké njọ, ya na ndị okenye abụọ ga-anọkọ. Ha ga-agbalị inyere ya aka. Ma ọ jụ ichegharị, a ga-amara ọgbakọ ọkwa na ọ bụghịzi onye nkwusa. Otú a ka e kwesịrị isi maa ọkwa ahụ: “[Aha onye ahụ] abụghịzi onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.” Ụmụnna kwesịziri iwere ya ka onye ụwa. Ọ bụ eziokwu na a chụghị ya n’ọgbakọ, ụmụnna kwesịrị ịkpachara anya n’otú ha na ya ga-esi na-emekọrịta ihe. (1 Kọr. 15:33) A gaghịzi na-anata ya akụkọ ozi.
40 Onye ahụ a kwụsịrị ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim nwekwara ike mechaa chọọ ịbụghachi onye nkwusa. Ụdị ihe a mee, ya na ndị okenye abụọ ga-ezukọ ka ha mata ma ò ruru eru. Ọ bụrụ na ha achọpụta na o ruru eru ịbụ onye nkwusa, a ga-amara ọgbakọ ọkwa. Otú a ka e kwesịrị isi maa ọkwa ahụ: “[Aha onye ahụ] aghọọla onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ọzọ.”
JEHOVA NA-EME KA NDỊ YA DỊ ỌCHA MA DỊRỊ N’OTU
41 Obi kwesịrị ịtọ anyị niile nọ n’ọgbakọ ụtọ na Jehova mere ka anyị bata ná nzukọ ya. Jehova akụzierela anyị ọtụtụ ihe na Baịbụl. Ihe ndị a ọ kụziiri anyị na-eme ka obi ruo anyị ala. Jehova jikwa ọgbakọ ya Kraịst bụ́ onyeisi ya na-echebe anyị. (Ọma 23; Aịza. 32:1, 2) N’agbanyeghị na anyị bi n’oge ikpeazụ a na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ, ahụ́ na-eru anyị ala n’ọgbakọ Chineke n’ihi na anyị na ụmụnna anyị dị n’udo.
Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu ma na-eme ka ọgbakọ na-adị ọcha, anyị ga na-eme ka eziokwu gbasara Alaeze Chineke na-enwu ka ìhè
42 Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu ma na-eme ka ọgbakọ na-adị ọcha, anyị ga na-eme ka eziokwu gbasara Alaeze Chineke na-enwu ka ìhè. (Mat. 5:16; Jems 3:18) Jehova ga-agọzi mbọ niile anyị na-agba n’ozi ya. Ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị mara ya ma soro anyị na-eme uche ya. Nke a ga-emekwa ka obi bụrụ anyị sọ aṅụrị.