Akwụkọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezigbo Ndị Nkwusa Ibe Anyị:
Anyị bụ ndị e meere amara n’ihi na anyị dị n’otu na-efe otu ezi Chineke, bụ́ Jehova. Anyị na ya “na-arụkọ ọrụ.” Ọrụ o nyekwaranụ anyị bụ ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma na ịna-akụziri ha banyere Alaeze ya nke na-achị ugbu a n’eluigwe. Ozi a bụ ozi dị nsọ. E jikwa ya azọpụta ndị mmadụ. (1 Kọr. 3:9; Mat. 28:19, 20) Ka anyị nwee ike dịrị n’otu ma kwusaa ozi ọma a n’ụwa niile, a ga-ahazirịrị anyị ahazi.—1 Kọr. 14:40.
Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịma ihe a na-eme n’ọgbakọ taa. Ọ ga-enyekwara gị aka ịma ihe ndị i kwesịrị ịna-eme n’ọgbakọ dị ka Onyeàmà Jehova. Ọ bụrụ na i jiri ihe ndị ị na-arụ n’ọgbakọ kpọrọ ihe, ma na-arụ ha nke ọma, ‘ị ga-adị ike n’okwukwe.’—Ọrụ 16:4, 5; Gal. 6:5.
N’ihi ya, anyị na-agba gị ume ka ị mụọ akwụkwọ a nke ọma. Chọpụta otú ị ga-esi eme ihe ndị ị mụtara na ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o tebeghị aka ị ghọrọ onye a na-emebeghị baptizim, olee ihe ndị ị ga-eme ka e mee gị baptizim, gị abụrụ Onyeàmà Jehova? Ọ bụrụkwa na e meela gị baptizim, olee ihe ị ga-eme ka ị na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ ma jekwuoro Jehova ozi? (1 Tim. 4:15) Olee ihe ị ga-eme ka udo na-adị n’ọgbakọ? (2 Kọr. 13:11) Gụọ akwụkwọ a ka ị hụ azịza ha.
Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke e mere baptizim, gịnị ka ị ga-eme ka i ruo eruo ịbụ ohu na-eje ozi, mechaakwa ruo eru ịbụ okenye? N’ihi otú ọtụtụ puku mmadụ si na-abata ná nzukọ Jehova, a chọsiri ụmụnna nwoke ga na-elekọta ọgbakọ ike. Akwụkwọ a ga-eme ka ị mara otú ị ga-esi ‘gbalịa ruo eru’ ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.—1 Tim. 3:1.
Ekpere anyị bụ ka akwụkwọ a nyere gị aka ka ị hụ uru ị bara ná nzukọ Jehova ma jiri ya kpọrọ ihe. Anyị hụrụ unu niile n’anya nke ukwuu. Anyị na-ekpekwa ekpere ka unu soro ná ndị ga na-efe Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, ma na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 37:10, 11; Aịza. 65:21-25.
Anyị bụ ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova