Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od p. 185-192
  • Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • “Onyenwe Anyị, Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od p. 185-192

AJỤJỤ A GA-AJỤ NDỊ CHỌRỌ IME BAPTIZIM

Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere

Ọmụmụ ihe gị na Ndịàmà Jehova emeela ka ị mara eziokwu dị na Baịbụl. Ihe ndị ị mụtara emeekwala ka gị na Chineke dịrị ná mma. O meela ka i nwee olileanya na Chineke ga-agọzi gị, gị adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs mgbe Alaeze ya ga na-achị ụwa. O meekwala ka obi sikwuo gị ike na Okwu Chineke bụ eziokwu. Ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ị na-aga abaarala gị ezigbo uru. Ị ghọtakwala ụzọ Jehova si emeso ndị ya ihe taa.​—Zek. 8:23.

Ebe ọ bụ na ị chọrọ ime baptizim, ọ ga-abara gị uru ma gị na ndị okenye tụlee ihe ndị na-ataghị akpụ Ndị Kraịst kweere. (Hib. 6:​1-3) Ka Jehova gọzie mbọ ị na-agba ịmata onye ọ bụ. Ka o nyekwa gị ndụ ebighị ebi ahụ o kwere anyị ná nkwa.​—Jọn 17:3.

1. Gịnị mere i ji chọọ ime baptizim?

2. Ònye bụ Jehova?

• “Jehova bụ ezi Chineke n’eluigwe nakwa n’ụwa. E nweghị ọzọ.”​—Diut. 4:39.

• “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”​—Ọma 83:18.

3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị na-akpọ Chineke aha ya?

• “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’”​—Mat. 6:9.

• “Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”​—Rom 10:13.

4. Olee okwu ụfọdụ e ji kọwaa Jehova na Baịbụl?

• “Jehova, bụ́ Onye kere nsọtụ niile nke ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.”​—Aịza. 40:28.

• “Nna anyị nke bi n’eluigwe.”​—Mat. 6:9.

• “Chineke bụ ịhụnanya.”​—1 Jọn 4:8.

5. Olee ihe i nwere ike inye Jehova?

• “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”​—Mak 12:30.

• “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.”​—Luk 4:8.

6. Gịnị mere i kwesịrị iji na-erubere Jehova isi?

• “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.”​—Ilu 27:11.

7. Ònye ka ị na-ekpegara ekpere, ọ̀ bụkwa n’aha onye?

• “N’ezie, n’ezie, ana m [Jizọs] asị unu, ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla, ọ ga-enye ya unu n’aha m.”​—Jọn 16:23.

8. Olee ụfọdụ ihe ndị i nwere ike ikpe ekpere maka ha?

• “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe. Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa; gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ. Ekwela ka anyị daba n’ọnwụnwa, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’”​—Mat. 6:​9-13.

• “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”​—1 Jọn 5:14.

9. Olee ihe nwere ike ime ka Jehova ghara ịza ekpere mmadụ?

• “Ha ga-akpọku Jehova maka enyemaka, ma ọ gaghị aza ha . . . n’ihi ihe ọjọọ ha mere.”​—Maị. 3:4.

• “Anya Jehova na-elekwasị ndị ezi omume, ntị ya dịkwa n’arịrịọ ha na-arịọsi ike; ma ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ.”​—1 Pita 3:12.

10. Ònye bụ Jizọs Kraịst?

• “Saịmọn Pita zara, sị: ‘Ị bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.’”​—Mat. 16:16.

11. Gịnị mere Jizọs ji bịa n’ụwa?

• “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”​—Mat. 20:28.

• “Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke, n’ihi na ọ bụ nke a mere e ji zite m.”​—Luk 4:43.

12. Olee otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ maka àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ?

• “Ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.”​—2 Kọr. 5:15.

13. Olee ikike Jehova nyere Jizọs?

• “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”​—Mat. 28:18.

• “Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu, o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ.”​—Fil. 2:9.

14. Ì kwetara na Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” nke Jizọs họpụtara?

• “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?”​—Mat. 24:45.

15. Gịnị bụ mmụọ nsọ?

• “Mmụọ ozi ahụ zara ya, sị: ‘Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.’”​—Luk 1:35.

• “Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!”​—Luk 11:13.

16. Olee otú Jehova sirila jiri mmụọ nsọ ya rụọ ọrụ?

• “Ọ bụ site n’okwu Jehova ka e kere eluigwe, ọ bụkwa site na mmụọ nke ọnụ ya ka e kere ihe niile dị n’ime ya.”​—Ọma 33:6.

• “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”​—Ọrụ 1:8.

• “Ọ dịghị amụma Akwụkwọ Nsọ nke si ná nkọwa mmadụ pụta. N’ihi na ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”​—2 Pita 1:​20, 21.

17. Gịnị bụ Alaeze Chineke?

• “Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”​—Dan. 2:44.

18. Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere gị?

• “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”​—Mkpu. 21:4.

19. Olee otú i si mara na oge Chineke ga-emezu ihe o kwere anyị ná nkwa n’Alaeze ya eruwela?

• “Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya naanị ha, sị ya: ‘Gwa anyị, Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?’ Jizọs zara ha, sị: ‘. . . Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha, a ga-enwekwa ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche. A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.’”​—Mat. 24:​3, 4, 7, 14.

• “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu, ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà nwere nsọpụrụ Chineke ma na-agọnahụ ike ya; zere ndị dị otú a.”​—2 Tim. 3:​1-5.

20. Olee otú ị ga-esi egosi na Alaeze ahụ dị gị mkpa?

• “Ya mere, burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.”​—Mat. 6:33.

• “Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, na-eso m mgbe niile.’”​—Mat. 16:24.

21. Ònye bụ Setan, oleekwa ndị bụ́ ndị mmụọ ọjọọ?

• “Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu . . . Onye ahụ bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere.”​—Jọn 8:44.

• “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, a chụdara ya na ndị mmụọ ozi ya.”​—Mkpu. 12:9.

22. Olee ebubo Setan boro Jehova na ndị na-efe Jehova?

• “Nwaanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: ‘Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a. Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a, Chineke sịrị: “Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.”’ Agwọ ahụ wee sị nwaanyị ahụ: ‘Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.’”​—Jen. 3:​2-5.

• “Ma Setan zara Jehova, sị: ‘Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọ bụkwa ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.’”​—Job 2:4.

23. Olee otú ị ga-esi egosi na ebubo Setan ndị ahụ bụ ụgha?

• “Jirikwa obi gị dum . . . jeere [Chineke] ozi.”​—1 Ihe 28:9.

• “Ruo mgbe m kubiri ume, m gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe.”​—Job 27:5.

24. Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ?

• “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.”​—Rom 5:12.

25. Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

• “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.”​—Ekli. 9:5.

26. Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

• “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”​—Ọrụ 24:15.

27. Mmadụ ole ga-aga eluigwe iji soro Jizọs chịa?

• “Lee! Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya n’egedege ihu ha.”​—Mkpu. 14:1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya