Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ypq ajụjụ 6 p. 18-20
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?
  • Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Ndị Na-eto Eto—unu Esola Ndị Ọgbọ Unu Eme Ihe Na-adịghị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị
    Teta!—2014
  • Gịnị Mere O Ji Dị Mma Ka Ị Mụọ Baịbụl?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
ypq ajụjụ 6 p. 18-20
Otu nwa okorobịa ụmụ akwụkwọ ibe ya na-enye sịga ka ọ ṅụọ

AJỤJỤ NKE 6

Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na i merie nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị, ọ pụtara na ọ bụ gị na-ekpebi ihe ị chọrọ ime, ọ bụghị ndị ọzọ.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Obi wụbara Brian n’afọ ka ụmụ akwụkwọ ibe ya abụọ bịakwutere ya. N’izu a, ha agbalịala ugboro abụọ ime ka ọ ṅụọ sịga. Nke a bụ nke ugboro atọ.

nye nke mbụ sịrị ya:

“Ị̀ nọrọkwala naanị gị? O nwere ezigbo ihe m chọrọ inye gị.”

Ya elee Brian anya, manye aka n’akpa wepụta ihe, matịa aka ka o nye ya Brian.

Brian hụrụ sịga n’aka ya. Obi awụbakwuo ya n’afọ.

Brian asị ya, “Ewela iwe. M gwala gị na anaghị m aṅụ sịga.”

Onye nke abụọ anapụ ya okwu n’ọnụ, sị: “Ụjọ atụla gị.”

Brian katara obi sị ya, “Abụghị m onye ụjọ.”

Onye nke abụọ konyere Brian aka n’olu, wetuo olu sị ya, “Ṅụtụnụ.”

Onye nke mbụ achọọ itinye ya sịga ahụ n’ọnụ ma wetuo olu sị ya, “Anyị agaghị agwa onye ọ bụla. O nweghị onye ga-ama.”

Ọ bụrụ na ị bụ Brian, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Ụmụaka a na-enye Brian nsogbu hà echebarala ihe a ha na-eme echiche? Hà ji aka ha kpebie ihe ha ga na-eme? Ọ dị ka ha emebeghị otú ahụ. O nwere ike ịbụ na ha na-eme ihe ndị ọzọ gwara ha mee. Ha chọrọ ka ndị ọzọ lewe ha anya ọma. Ọ bụ ya mere ha ji eme ihe ndị ọzọ gwara ha.

E mee gị ụdị ihe a, olee otú ị ga-esi mee ihe dị́ mma ma merie nsogbu ndị ọgbọ gị na-enye gị?

  1. MATA IHE NWERE IKE IME

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—⁠Ilu 22:⁠3.

    Ọtụtụ mgbe, i nwere ike ịmata nsogbu na-abịanụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị hụrụ ebe ụmụ akwụkwọ ibe gị nọ na-aṅụ sịga. Ọ bụrụ na ị mata ihe nwere ike ime, ị ga-adị njikere ime ihe i kwesịrị ime.

  2. CHEE ECHICHE

    Baịbụl kwuru, sị: “Nweenụ ezi akọ na uche.”​—⁠1 Pita 3:⁠16.

    Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ bụrụ na mụ esoro ndị ọzọ mee ihe a, olee otú obi ga-emecha dị m?’ O nwere ike ime ka ụmụaka ibe gị lewe gị anya ọma mgbe ahụ. Ma, olee otú obi ga-adị gị ma e mechaa? Ị̀ dị njikere ịhapụ ime ihe i kweere naanị ka i mee ka obi dị́ ụmụ klas unu mma?​—⁠Ọpụpụ 23:⁠2.

  3. KPEBIE IHE Ị GA-EME

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.”​—⁠Ilu 14:⁠15.

    Mee elu mee ala, ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme ma jiri isi anyị buru ihe sí na ya pụta. Baịbụl kwuru na Josef, Job, na Jizọs mere ihe dị́ mma. O kwukwara na Ken, Isọ, na Judas mere ihe na-adịghị mma. Gịnị ka gịnwa ga-eme?

Baịbụl kwuru, sị: ‘Kwesị ntụkwasị obi.’ (Abụ Ọma 37:⁠3) Ọ bụrụ na i cheela ihe ga-esi na ya pụta, kpebiekwa ihe ị ga-eme, ikwu ihe i kpebiri ime ga-adịrị gị mfe, baakwara gị uru.

Enyela onwe gị nsogbu. Ọ bụghị ihe ị ga-ekwuwe ogologo okwu. Naanị ịsị MBA ma kwụsie ike na ya ezuola. Ma ọ bụ, ị chọọ ikwu ihe i kpebiri hoo haa, i nwere ike sị:

  • “Agaghị m eso.”

  • “Anaghị m eme ụdị ihe ahụ.”

  • “I kwesịrị ịma na agaghị m eme ya.”

Ihe dị́ mkpa bụ ikwu okwu ozugbo n’amaghị ọnụ jijiji. I mee otú ahụ, o nwere ike iju gị anya na ndị ọgbọ gị ga-akwụsị inye gị nsogbu.

IHE Ị GA-EME MA A CHỊWA GỊ ỌCHỊ

Ebe otu nwa okorobịa na-agwa onye nke ọzọ ihe ọ ga-eme otú ahụ a na-agwa robọt ihe ọ ga-eme

Ọ bụrụ na i mee ihe ndị ọgbọ gị gwara gị mee, ị ga-adị ka robọt a na-agwa ihe ọ ga-eme

Ọ bụrụkwanụ na ndị ọgbọ gị achịwa gị ọchị? Ọ bụrụ na ha asị, “Gịnịdị na-eme gị, ị̀ bụ onye ụjọ?” Mata na ihe mere ha ji achị gị ọchị bụ na ha chọrọ ka i mee ihe ha kwuru. Gịnị ka i nwere ike ime? Ọ dịkarịa ala, e nwere ihe abụọ i nwere ike ime.

  • I nwere ike ikweta ihe ha kwuru. (“Ekwela m. Abụ m onye ụjọ.” Kwuzie ihe mere i ji jụ.)

  • I nwere ike ịgwa ha ihe ga-emetụ ha n’ahụ́. Gwa ha ihe mere i ji jụ, ma kwuo ihe ga-eme ka ha chee echiche. (“Echere m na unu ma ihe, unu ana-aṅụ sịga.”)

Ọ bụrụ na ha akwụsịghị ịchị gị ọchị, si ebe ahụ pụọ. Mara na ị nọrọ ebe ahụ, ha ga-enyekwu gị nsogbu. Ọ bụrụ na i si ebe ahụ pụọ, ọ pụtara na i kweghị ka ndị ọgbọ gị mee ka i mee ihe ha chọrọ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ị gaghị emeli ka ndị ọgbọ gị ghara inye gị nsogbu. Ma, i nwere ike ikpebi ihe ị chọrọ ime, gwa ha ihe i kpebiri ime, ma kwụsie ike na ya. Mee elu mee ala, ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme.​—⁠Jọshụa 24:⁠15.

IHE M GA-EME

  • Olee otú m nwere ike isi merie nsogbu ndị ọgbọ m na-enye m?

  • Ọ bụrụ na ndị ọgbọ m agwa m mee ihe na-adịghị mma, gịnị ka m ga-eme?

CHỌPỤTA IHE NDỊ ỌZỌ

Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị

Lee katuun e sere na bọọdụ bụ́ Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị! dị́ na www.jw.org/⁠ig. (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya