AJỤJỤ NKE 7
Gịnị Ka M Ga-eme ma Mmadụ Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọahụ?
GỊNỊ KA Ị GA-EME?
Chegodị banyere ihe atụ a: O ruola naanị ọnwa abụọ Heather na Mike kpawara, ma ọ dị Heather ka ò ruola ọtụtụ afọ. Ha na-eji ekwentị edegara ibe ha ozi ọtụtụ ugboro. Ha na-anọ ọtụtụ awa ma ha kwurịtawa okwu n’ekwentị. Otu onye kwuwa okwu, onye nke ọzọ na-amadị ihe ọ chọrọ ikwu. Ma, ihe Mike chọziri ugbu a abụghị naanị ikwurịta okwu.
N’ime ọnwa abụọ ahụ ha kparala, naanị ihe Mike na Heather na-eme bụ ijide ibe ha aka na isusutụ ibe ha ọnụ. Heather achọghị ka ọ gafee otú ahụ. Ma, ọ chọghị ihe ga-eme ka Mike hapụ ya. O nweghị onye ọzọ na-eme ya obi ụtọ, na-emekwa ya ka ọ̀ bụ àkwá ugo otú Mike si eme ya. Heather gwara onwe ya, sị: ‘Mụ na Mike hụrụ ibe anyị n’anya . . . ’
Ọ bụrụ na i toruola ka gị na nwoke kpawa, ya abụrụ na ị bụ Heather, gịnị ka ị ga-eme?
CHEGODỊ ECHICHE
Mmekọahụ bụ onyinye Chineke nyere naanị ndị bụ́ di na nwunye. Mmadụ nwee mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye, ọ pụtara na o nweghị ihe o ji onyinye ahụ kpọrọ. Ọ ga-adị ka ebe mmadụ ji ọmarịcha uwe a zụtaara ya na-ehicha ụlọ
Mmadụ sí n’ebe dị́ ezigbo elu wụtuo, ọ ga-emerụ ahụ́. Otú ahụ ka ọ dị ma i nupụ isi n’iwu Chineke nke kwuru, sị: “Zere ịkwa iko.” —1 Ndị Tesalonaịka 4:3.
Olee nsogbu inupụrụ iwu ahụ isi na-akpata? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Olee otú o si bụrụ eziokwu?
A chọpụtala na ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye na-emecha nwee otu n’ime nsogbu ndị a ma ọ bụ karịa.
OBI MGBAWA. Ọtụtụ ndị na-eto eto nwerela mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye kwuru na ha mechara kwaa mmakwaara.
ATỤKWASỊGHỊ IBE HA OBI. Nwoke na nwaanyị nwee mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị, ihe onye ọ bụla n’ime ha ga na-eche bụ, ‘Ònye makwanụ onye ọzọ ya na ya nwerela mmekọahụ?’
ILEWE IBE HA ANYA ỌJỌỌ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ụmụ agbọghọ chọrọ ka ụmụ okorobịa ha na ha na-akpa na-echebe ha, ọ bụghị imebi ha. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na-achọpụta na ụmụ agbọghọ ndị kwere ka ha na ha nwee mmekọahụ anaghịzi amasịcha ha.
Ihe kacha mkpa: I nwee mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, i reela ùgwù gị n’ihi na ị tụfuola ihe bara ezigbo uru i nwere. (Ndị Rom 1:24) Ahụ́ gị bara ezigbo uru. I kwesịghị ikwe ka e mebie ya.
Gosi na i kpebisiri ike irube isi n’iwu ahụ Chineke nyere ‘ka anyị zere ịkwa iko.’ (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) I mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị ga-enwezi ike inwe mmekọahụ. Obi ga-adị gị ezigbo ụtọ inwe ya mgbe ahụ n’ihi na ị gaghị na-echegbu onwe gị, na-akwa mmakwaara, ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ ịkwa iko na-akpatakarị.—Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:3.
GỊNỊ KA I CHERE?
Onye hụrụ gị n’anya n’eziokwu ọ̀ ga-eme ihe ga-akpatara gị nsogbu ma ọ bụ ihe ga-eme ka obi na-ajọ gị njọ?
Onye na-echere gị echiche ọma n’eziokwu ọ̀ ga-eme ka i mee ihe ga-eme ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma?—Ndị Hibru 13:4.