Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 9 p. 28-p. 29 para. 1
  • Ebreham na Sera Mechara Mụta Nwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ebreham na Sera Mechara Mụta Nwa
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Kpọrọ Ya “Nne Ndị Eze”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ebreham na Sera—Ị Pụrụ Iṅomi Okwukwe Ha!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Ị Bụ Nwaanyị Mara Mma”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 9 p. 28-p. 29 para. 1
Ebe Sera nọ n’ime ụlọikwuu na-ege ihe ndị mmụọ ozi na-agwa Ebreham

ISI NKE 9

Ebreham na Sera Mechara Mụta Nwa

Ebreham na Sera alụọla ọtụtụ afọ. Ha hapụrụ ọmarịcha ụlọ ha n’obodo Ọọ, gaa biri n’ụlọikwuu. Ma, Sera emeghị mkpesa ọ bụla maka na ha kwapụrụ n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.

Ma, Sera chọsiri nwa ike nke na ọ gwara Ebreham, sị: ‘Ọ bụrụ na Hega, onye na-ejere m ozi amụta nwa, m ga-ewere ya ka nwa m.’ Ka oge na-aga, Hega mụtara nwa nwoke. Aha ya bụ Ishmel.

Mgbe Sera dị ime

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, n’oge Ebreham dị afọ iri itoolu na itoolu, nwunye ya Sera adịrịkwa afọ iri asatọ na itoolu, ndị ọbịa atọ bịara na nke ha. Ebreham gwara ha ka ha bịa zurutụ ike n’okpuru osisi ma soro ha rie nri. Ị̀ ma ndị ndị ọbịa ahụ bụ? Ha bụ ndị mmụọ ozi. Ha gwara Ebreham, sị: ‘N’ụdị oge a n’afọ ọzọ, gị na nwunye gị Sera ga-amụ nwa nwoke.’ Ma, Sera nọ n’ime ụlọikwuu na-ege ihe ha na-ekwu. Ọ chịrị ọchị n’obi ya, sị: ‘M̀ ga-amụli nwa ebe ọ bụ na mụ emeela agadi?’

Mgbe ọ na-erula otu afọ, Sera mụrụ nwa nwoke otú mmụọ ozi Jehova kwuru. Ebreham gụrụ ya Aịzik, nke pụtara “Ọchị.”

Mgbe Aịzik dị ihe dị ka afọ ise, Sera hụrụ ka Ishmel ji Aịzik na-eme ihe ọchị. Ọ chọrọ ichebe nwa ya nwoke. N’ihi ya, ọ gara gwa Ebreham ka ọ chụpụ Hega na nwa ya Ishmel. Ná mmalite, Ebreham achọghị ime ihe a nwunye ya gwara ya. Ma Jehova gwara Ebreham, sị: ‘Gee Sera ntị. M ga-elekọta Ishmel. Ma, m ga-esi n’aka Aịzik mezuo nkwa ahụ m kwere gị.’

Ebe Sera ji Aịzik aka ka Hega na Ishmel na-apụ

“Ọ bụkwa okwukwe mere ka Sera nwee ike ịdị ime . . . n’ihi na o kwetara na e kwesịrị ịtụkwasị Onye kwere nkwa ahụ obi.” ​—Ndị Hibru 11:11

Ajụjụ: Gịnị ka Sera nụrụ ndị mmụọ ozi ahụ na-agwa Ebreham? Olee otú Jehova si chebe Aịzik?

Jenesis 16:1-4, 15, 16; 17:25-27; 18:1-15; 21:1-14; Ndị Hibru 11:11

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya