Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 11 p. 32-p. 33 para. 2
  • Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Elee Okwukwe Ebreham Ule
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ihe Kacha Egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 11 p. 32-p. 33 para. 2
Ebe Ebreham na Aịzik na-aga n’Ugwu Moraya

ISI NKE 11

Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule

Ebreham kụziiri nwa ya Aịzik ka ọ hụ Jehova n’anya ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-emezu ihe ndị o kwuru. Ma, mgbe Aịzik dị ihe dị ka afọ iri abụọ na ise, Jehova gwara Ebreham ka o mee ihe ga-esiri mmadụ ike ime. Gịnị bụ ihe ahụ?

Chineke gwara Ebreham, sị: ‘Biko, were nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, chụọrọ m àjà n’ugwu dị na Moraya.’ Ebreham amaghị ihe mere Jehova ji gwa ya mee ihe a. Ma, o mere ihe Jehova gwara ya.

N’isi ụtụtụ echi ya, Ebreham kpọọrọ Aịzik na mmadụ abụọ na-ejere ya ozi gawa Moraya. Mgbe ha gara ije abalị atọ, ha nọ n’ebe dị anya lelie anya hụ ugwu ahụ. Ebreham gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha chere ka ya na Aịzik gaa chụọrọ Jehova àjà. Ebreham boro Aịzik nkụ, yanwa ewere mma. Mgbe ha na-aga, Aịzik jụrụ nna ya, sị: ‘Oleekwanụ atụrụ a ga-eji chụọ àjà?’ Ebreham gwara ya, sị: ‘Nwa m, Jehova ga-eweta ya.’

Mgbe ha mechara ruo n’ugwu ahụ, ha rụrụ ebe ịchụàjà. Ebreham kere Aịzik agbụ n’ụkwụ, keekwa ya n’aka ma kukwasị ya n’elu ebe ịchụàjà ahụ.

Ebe Ebreham kere Aịzik agbụ kukwasị ya n’ebe ịchụàjà. Ebreham jikwa mma n’aka

Ebreham weere mma, matịzie aka ka o gbuo nwa ya. Ma mmụọ ozi Jehova si n’eluigwe kpọọ ya òkù, sị: ‘Ebreham! Emerụla nwa ahụ ahụ́, n’ihi na amatala m ugbu a na i nwere okwukwe na Chineke ebe ị na-ajụghị iji nwa gị chụọ àjà.’ Ebreham lere anya n’ihu ya hụ ebule nke mpi ya konyere n’osisi. O mere ngwa ngwa tọọ agbụ ahụ o kere Aịzik ma werezie ebule ahụ chụọrọ Chineke àjà.

Jehova malitere ụbọchị ahụ kpọwa Ebreham enyi ya. Ị̀ ma ihe kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na Ebreham mere ihe niile Jehova gwara ya mee, ma mgbe ọ na-aghọtaghị ihe mere Jehova ji gwa ya mee ha.

Ebe Ebreham na-atọ Aịzik agbụ o kere ya

Jehova kweghachiri Ebreham nkwa o kweburu ya, sị: ‘M ga-agọzi gị, m ga-emekwa ka ụmụ gị dị ọtụtụ.’ Ihe a o kwuru pụtara na Jehova ga-esi n’ezinụlọ Ebreham gọzie ndị niile na-eme ihe ọ na-achọ.

“Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”​—Jọn 3:16

Ajụjụ: Gịnị ka Ebreham mere iji gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi? Olee nkwa Jehova kwere Ebreham?

Jenesis 22:1-18; Ndị Hibru 11:17-19; Jems 2:21-23

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya