Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 16 p. 44-p. 45 para. 4
  • Ònye Bụ Job?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Job?
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Nwee Olileanya n’Ebe Jehova Nọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Job Tachiri Obi—Anyị Pụkwara!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 16 p. 44-p. 45 para. 4
Ụmụ nwoke atọ ndị bịara ịhụ Job mgbe etuto toro ya n’ahụ́ niile

ISI NKE 16

Ònye Bụ Job?

E nwere otu nwoke na-efe Jehova n’obodo a na-akpọ Ọz. Aha ya bụ Job. Ọ bụ ezigbo ọgaranya, nweekwa ọtụtụ ụmụ. Ọ dị obiọma, ọ na-enyekwara ma ndị ogbenye ma ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ma ụmụ na-enweghị nne na nna aka. Ma, ọ̀ pụtara na e nweghị mgbe nsogbu ga-abịara ya maka na ọ na-eme ihe dị mma?

Setan bụ́ Ekwensu

Job amaghị na Setan bụ́ Ekwensu nọ na-ele ya. Jehova gwara Setan, sị: ‘Ị̀ hụla ohu m Job? E nweghị onye dị ka ya n’ụwa. Ọ na-erubere m isi ma na-eme ihe dị mma.’ Setan gwara Jehova, sị: ‘Ama m na Job na-erubere gị isi. Ị na-echebe ya ma na-agọzi ya. I nyere ya ala na ọtụtụ anụmanụ. Ọ bụrụ na ị napụ ya ihe a niile, ọ ga-akwụsị ịna-efe gị.’ Jehova gwara Setan, sị: ‘I nwere ike ịnwa Job. Ma egbukwala ya.’ Gịnị mere Jehova ji kwe ka Setan nwaa Job? Ọ bụ maka na obi siri Jehova ike na Job ga-erubere ya isi.

Setan malitere ịkpatara Job ọtụtụ nsogbu iji nwaa ya. Ihe mbụ o mere bụ iziga ndị Siba ka ha zuru ìgwè ehi na ìgwè jakị Job. O mekwara ka ọkụ regbuo atụrụ ya niile. Ndị Kaldia bịakwara zuru kamel niile Job nwere. E gbukwara ndị na-azụrụ ya anụmanụ ndị ahụ. Nke ka njọ meziri. Ụmụ Job niile nwụrụ mgbe ụlọ ha nọ na ya na-eri oriri dara. Ihe ndị a gbawara Job obi, ma ọ kwụsịghị ife Jehova.

Setan chọrọ ka Job takwuo ahụhụ. N’ihi ya, o mere ka etuto too ya n’ahụ́ ya niile. Ihe a mere ka ahụ́ niile na-egbu Job ezigbo mgbu. Job amaghị ihe mere ihe ndị a ji na-eme ya. Ma, ọ ka nọ na-efe Jehova. Obi tọrọ Chineke ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ na Job akwụsịghị ife ya.

Ihe ọzọ Setan mere bụ na o zitere ụmụ nwoke atọ ka ha bịa nwaa Job. Ha gwara Job, sị: ‘Ọ ga-abụrịrị na i meela ihe ọjọọ ma chọọ izo ya. Ọ bụ Chineke na-ata gị ahụhụ.’ Job kwuru, sị: ‘E nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere.’ Ma, Job malitere iche na ọ bụ Jehova na-akpatara ya nsogbu ndị ahụ. O kwuru na ihe Chineke na-eme ya adịghị mma.

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Elaịhu gbara nkịtị na-ege ihe ha na-ekwu. Mgbe ha kwuchara, ọ sịrị ha: ‘Ihe unu niile kwuru adịghị mma. Jehova dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata. Ọ naghị eme ihe ọjọọ. Ọ na-ahụ ihe niile ma na-enyere ndị nwere nsogbu aka.’

Ebe Job na nwunye ya na nwa ọhụrụ ha nọ

Jehova gwaziri Job, sị: ‘Olee ebe ị nọ mgbe m kere eluigwe na ụwa? Gịnị mere i ji ekwu na m na-eme gị ihe ọjọọ? Ị na-ekwu okwu, ma ị maghị ihe mere ihe ụfọdụ ji na-eme.’ Job kwetara na ihe ndị o kwuru adịghị mma. Ọ sịrị: ‘Emehiela m. Anụla m banyere gị, ma ugbu a, amatala m gị nke ọma. O nweghị ihe nyịrị gị. Biko, gbaghara m maka ihe ndị m kwuru.’

Mgbe Setan nwachara Job, Jehova mere ka Job gbakee, meekwa ka o nwee ihe karịa otú o nweburu. Job biri ogologo ndụ, obi tọkwara ya ụtọ. Jehova gọziri Job maka na o rubeere ya isi, ma mgbe nsogbu bịaara ya. Ị̀ ga-achọ ịna-efe Jehova ka Job n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ?

“Unu anụla otú Job si tachie obi, hụkwa ihe Jehova mechara mee.”​—Jems 5:11

Ajụjụ: Olee otú Setan si nwaa Job? Olee otú Jehova si gọzie Job?

Job 1:1–3:26; 4:7; 32:1-5; 34:5, 21; 35:2; 36:15, 26; 38:1-7; 40:8; 42:1-17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya