ISI NKE 18
Osisi Na-enwu Ọkụ
Mosis biri na Midian afọ iri anọ. Ọ lụrụ nwaanyị, mụọkwa ụmụ. Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-elekọta atụrụ ya n’ebe dị nso n’Ugwu Saịnaị, ọ hụrụ ihe dị ịtụnanya. Ọkụ nọ na-enwu n’otu osisi ogwu, ma o repịaghị osisi ogwu ahụ. Mgbe Mosis gara nso ka ọ mara ihe na-emenụ, olu si n’osisi ogwu ahụ kpọọ ya òkù, sị: ‘Mosis! Abịakwula nso ebe a. Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị n’ihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.’ Ọ bụ Jehova si n’ọnụ otu mmụọ ozi na-agwa Mosis okwu.
Ụjọ tụwara Mosis, ya ekpuchie ihu ya. Olu ahụ gwara ya, sị: ‘Ahụla m ahụhụ ndị Izrel na-ata. M ga-anapụta ha n’aka ndị Ijipt ma kpọba ha n’ala mara mma. Ọ bụ gị ga-akpọpụta ndị m n’Ijipt.’ Í cheghị na ihe a juru Mosis anya?
Mosis kwuru, sị: ‘Olee ihe m ga-agwa ndị Izrel ma ha jụọ m onye zitere m?’ Chineke gwara Mosis, sị: ‘Gwa ha na Jehova, bụ́ Chineke Ebreham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb zitere gị.’ Mosis gwaziri Jehova, sị: ‘Ọ bụrụkwanụ na ha egeghị m ntị?’ Jehova gwara Mosis ihe ọ ga-eme ka ha mata na ọ bụ yanwa zitere ya. Jehova gwara ya ka ọ tụpụ mkpara ya n’ala. Mgbe ọ tụpụrụ ya n’ala, ọ ghọrọ agwọ. Mgbe Mosis jidere agwọ ahụ n’ọdụ, ọ ghọrọ mkpara ọzọ. Jehova sịrị ya: ‘I mee ihe a, ha ga-amata na ọ bụ m zitere gị.’
Mosis kwuru, sị: ‘Amaghị m okwu ekwu.’ Jehova gwara ya, sị: ‘M ga-agwa gị ihe ị ga-ekwu, m ga-ezitekwara gị nwanne gị Erọn ka o nyere gị aka.’ Ihe ndị a Jehova gwara Mosis mere ka ọ ghọta na ọ nọnyeere ya. N’ihi ya, ọ kpọọrọ nwunye ya na ụmụ ya laghachi Ijipt.
“Unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu, n’ihi na a ga-agwa unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahụ.”—Matiu 10:19