ISI NKE 22
Jehova Rụrụ Ọrụ Ebube n’Oké Osimiri Uhie
Ozugbo Fero nụrụ na ndị Izrel ahapụla Ijipt, o wutere ya na ọ hapụrụ ha ka ha lawa. Ọ gwara ndị agha ya, sị: ‘Kwadebenụ ụgbọ ịnyịnya agha m niile ka anyị chụwa ha. Anyị agaraghị ahapụ ha ka ha lawa.’ Fero na ndị agha ya chụụrụ ndị Izrel gawa.
Jehova ji ígwé ojii na-edu ndị ya n’ehihie, jirikwa ọkụ na-edu ha n’abalị. O duuru ha ruo n’Oké Osimiri Uhie ma gwa ha maa ụlọikwuu n’ebe ahụ.
Ndị Izrel hụziri Fero na ndị agha ya ka ha chụ ha na-abịa. Ha nọ n’agbata oké osimiri ahụ na ndị agha Ijipt. Ha besaara Mosis ákwá, sị: ‘Anyị na-aga ịnwụ. Ị gaara ahapụ anyị n’Ijipt.’ Ma, Mosis gwara ha, sị: ‘Unu atụla egwu. Unu ga-ahụ otú Jehova ga-esi zọpụta anyị.’ Ọ̀ bụ na ihe a Mosis kwuru egosighị na ọ tụkwasịrị Jehova obi?
Jehova gwara ndị Izrel ka ha kwalie. N’abalị ahụ, Jehova mere ka ígwé ojii ahụ dịrị n’agbata ndị Izrel na ndị Ijipt. Ọchịchịrị gbara n’ebe ndị Ijipt nọ. Ma, ìhè dị n’ebe ndị Izrel nọ.
Jehova gwara Mosis ka o setịa aka ya n’elu oké osimiri ahụ. Jehova meziri ka oké ifufe fee n’abalị ahụ niile. Oké osimiri ahụ wee kewaa ụzọ abụọ, e nwee ụzọ n’etiti ya. Ọtụtụ nde ndị Izrel sizi n’ala nkịtị gafee oké osimiri ahụ. Mmiri ahụ dị ka mgbidi ma n’aka nri ma n’aka ekpe.
Ndị agha Fero chụụrụ ndị Izrel banye n’ala oké osimiri ahụ. Jehova meziri ka ndị agha Fero nọrọ n’ọgba aghara. Ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha malitere ịdapụsị. Ndị agha ahụ tiri mkpu, sị: ‘Ka anyị si ebe a pụọ. Jehova na-alụrụ ha agha.’
Jehova gwara Mosis, sị: ‘Setịa aka gị n’elu oké osimiri a.’ Ozugbo ahụ, mmiri ahụ dị ka mgbidi lọghachiri rikpuo ndị agha Ijipt. Fero na ndị agha ya niile nwụrụ. E nweghị otu n’ime ha fọrọ ndụ.
Ìgwè mmadụ ndị nọ n’akụkụ oké osimiri ahụ bụrụ abụ ha ji too Chineke. Ha sịrị: “Ka m bụkuo Jehova abụ n’ihi na o meela ihe a ga-eji na-akwanyere ya ezigbo ùgwù. Ọ tụbala ịnyịnya na onye na-agba ya n’oké osimiri.” Ka ha nọ na-abụ abụ a, ụmụ nwaanyị ha nọ na-agba egwú, na-akụkwa ịgbà. Obi tọrọ ha niile ụtọ na ha enwerela onwe ha.
“Ka anyị wee nwee obi ike ma sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?’”—Ndị Hibru 13:6