ISI NKE 30
Rehab Zoro Ndị Nnyopụta
Mgbe ndị Izrel abụọ gara inyopụta otú Jeriko dị, ha banyere n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Rehab. Eze Jeriko chọpụtara na ha gara n’ụlọ Rehab, ya eziga ndị agha ya ebe ahụ. Rehab zoro mmadụ abụọ ahụ n’uko ụlọ ya ma gwa ndị agha ahụ ka ha gaa chọọ ha ebe ọzọ. Ọ gwara ndị nnyopụta ahụ, sị: ‘M ga-enyere unu aka n’ihi na m ma na Jehova nọnyeere unu, amakwa m na unu ga-emeri obodo a. Biko, kwenụ m nkwa na unu ga-echebe ndị ezinụlọ anyị.’
Ndị nnyopụta ahụ gwara Rehab, sị: ‘Anyị na-ekwe gị nkwa na e nweghị ihe ga-eme onye ọ bụla nọ n’ụlọ gị.’ Ha sịkwara ya: ‘Kee ụdọ na-acha uhie uhie na windo gị. Ọ bụrụ na i kee ya, e nweghị ihe ga-eme ndị ezinụlọ unu.’
Rehab kegidere ụdọ na windo ya, ndị nnyopụta ahụ esi na ya rịtuo. Ha gara zoo n’ugwu ruo abalị atọ tupu ha alaghachikwuru Joshụa. Ndị Izrel mechara gafee Osimiri Jọdan ma jikere ka ha weghara Jeriko. Jeriko bụ obodo mbụ ha meriri. Jehova gwara ha ka ha gbaa obodo ahụ gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo abalị isii. N’ụbọchị nke asaa, ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe ha gbachara ya, ndị nchụàjà fụrụ opi ha, ndị agha tiri mkpu, tisie ya ike, mgbidi obodo ahụ adakasịa. Ma, ụlọ Rehab adaghị n’agbanyeghị na ọ dị ná mgbidi ahụ. E nweghị ihe mere Rehab na ezinụlọ ha n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi.
“Otú ahụ ka Chineke sikwa gụọ Rehab . . . n’onye ezi omume n’ihi ihe dị mma o mere. Ọ nabatara ndị bịara inyopụta otú obodo ha dị, nyekwara ha aka ha esi n’ụzọ ọzọ laa.”—Jems 2:25