Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 36 p. 88-p. 89 para. 1
  • Nkwa Jefta Kwere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwa Jefta Kwere
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkwa Jefta Kwere
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • O Mere Papa Ya Obi Ụtọ, Meekwa Jehova Obi Ụtọ
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Ndị Enyi Ya na Chineke Hụrụ Ya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ikwesị Ntụkwasị Obi Ga-eme Ka Chineke Gọzie Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 36 p. 88-p. 89 para. 1
Ebe Jefta na-adọwa uwe ya mgbe ada ya pụtara izute ya

ISI NKE 36

Nkwa Jefta Kwere

Ndị Izrel hapụrụ Jehova ọzọ ma malite ife arụsị dị iche iche. Mgbe ndị Amọn lụsoro ndị Izrel agha, chi ndị ahụ ha na-efe enyereghị ha aka. Ndị Izrel tara ahụhụ ọtụtụ afọ. Ha mechara gwa Jehova, sị: ‘Anyị emehiela. Biko, napụta anyị n’aka ndị iro anyị.’ Ndị Izrel bibiri arụsị ha niile, maliteghachi ife Jehova. Jehova achọghị ka ha nọgide na-ata ahụhụ.

Jehova họpụtara otu dike aha ya bụ Jefta ka o duru ndị Izrel gaa lụso ndị Amọn agha. Jefta gwara Jehova, sị: ‘Ọ bụrụ na i mee ka anyị merie n’agha a, m lọta, m ga-enye gị onye mbụ si n’ụlọ m pụta izute m.’ Jehova zara ekpere Jefta ma nyere ya aka ya emerie n’agha ahụ.

Mgbe Jefta lọtara, onye mbụ pụtara izute ya bụ nwa ya nwaanyị. Ọ bụ naanị ya ka ọ mụrụ. Ọ kụụrụ ịgbà, gbara egwú na-apụta izute nna ya. Gịnị ka Jefta ga-emezi? O chetara nkwa o kwere ma sị: ‘Ewoo, ada m! I mewaala m obi. Ekwere m Jehova nkwa. Ka m nwee ike imezu nkwa a, m ga-eziga gị n’ụlọikwuu dị na Shaịlo ka i jewere ya ozi.’ Ma, ọ gwara nna ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i kwere Jehova nkwa, mezuo ya. Biko, tupu mụ agaa, nye m ọnwa abụọ ka mụ na ndị enyi m gaa n’ugwu nọọ. Anyị lọta, mụ agawa.’ Ada Jefta ji obi ya niile jeere Chineke ozi n’ụlọikwuu n’oge niile ọ dị ndụ. N’afọ ọ bụla, ndị enyi ya na-aga eleta ya na Shaịlo.

Ebe ndị enyi ada Jefta bịara ileta ya n’ụlọikwuu

“Onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.”​—Matiu 10:37

Ajụjụ: Olee nkwa Jefta kwere Jehova? Gịnị ka ada Jefta mere mgbe ọ nụrụ nkwa nna ya kwere?

Ndị Ikpe 10:6–11:11; 11:29-40; 1 Samuel 12:10, 11

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya