Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 40 p. 98-p. 99 para. 2
  • Devid na Golayat

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Devid na Golayat
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Devid na Golayat
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ụjọ Atụghị Devid
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Ihe Mere na Devid Atụghị Egwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 40 p. 98-p. 99 para. 2
Ebe Devid na-agbapụ nkume o tinyere n’èbè ya ka ọ gbata ya Golayat

ISI NKE 40

Devid na Golayat

Jehova gwara Samuel, sị: ‘Gaa n’ụlọ Jesi. Otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke ga-abụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel.’ N’ihi ya, Samuel gara n’ụlọ Jesi. Mgbe ọ hụrụ ọkpara ya, o kwuru n’obi ya, sị: ‘Ọ ga-abụrịrị nwa okorobịa a.’ Ma, Jehova gwara Samuel na ọ bụghị ya. Ọ sịrị Samuel: ‘M na-ahụ ihe dị n’obi mmadụ, ọ bụghị naanị otú ọ dị n’elu ahụ́.’

Ebe Samuel na-ete Devid mmanụ

Jesi kpọpụtara ụmụ ya ndị nwoke isii ọzọ. Ma, Samuel sịrị ya: ‘Jehova ahọrọghị onye ọ bụla n’ime ha. Ì nwere ụmụ nwoke ndị ọzọ?’ Jesi sịrị ya: ‘Enwere m otu nwoke ọzọ. Ọ bụ ya bụ nke ikpeazụ. Aha ya bụ Devid. Ọ na-elekọtara m atụrụ n’ọhịa.’ Mgbe a kpọtara Devid, Jehova gwara Samuel, sị: ‘Ọ bụ onye a.’ Samuel wụrụ ya mmanụ n’isi, si otú a họpụta ya ka ọ bụrụ eze ga-achị ndị Izrel.

Golayat

Mgbe oge ụfọdụ gachara, ndị Izrel na ndị Filistia chọrọ ịlụ agha. Ndị Filistia nwere otu dike gbara ezigbo dimkpa na-alụrụ ha agha. Aha ya bụ Golayat. Ọ nọ na-akwa ndị Izrel emo kwa ụbọchị. O ji olu ike kwuo, sị: ‘Kpọpụtanụ otu nwoke ga-alụso m ọgụ. Ọ bụrụ na o merie m, anyị ga-abụ ndị ohu unu. Ma, ọ bụrụ na mụ emerie ya, unu ga-abụ ndị ohu anyị.’

Devid buteere ụmụnne ya, bụ́ ndị agha, nri n’ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu. Ọ nụrụ ihe Golayat kwuru ma kwuo, sị: ‘M ga-alụso ya ọgụ.’ Eze Sọl sịrị ya: ‘Ị ka bụ nwata.’ Devid asị ya: ‘Jehova ga-enyere m aka.’

Sọl nyere Devid ekike agha ya, ma Devid sịrị ya: ‘Agaghị m ejili ha lụọ agha.’ Devid weere èbè ya gaa n’iyi, họrọ nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ ma chịnye ha n’akpa ya. Ọ gbaara ọsọ gawa ebe Golayat nọ. Golayat agwa ya, sị: ‘Obere nwa a, bịa ebe a. M ga-ekesara ụmụ nnụnụ na anụ ọhịa anụ gị.’ Ụjọ atụghị Devid. Ọ gwara Golayat, sị: ‘I ji mma agha na ube bịa, ma eji m aha Jehova bịa. Ọ bụghị anyị ka ị na-alụso agha, kama ọ bụ Chineke. Mmadụ niile nọ ebe a ga-amara na Jehova ka mma agha na ube ike. Ọ ga-enyefe unu niile n’aka anyị.’

Devid tinyeziri otu nkume n’èbè ya, were ike ya niile fegharịa ya ma gbapụ ya. Jehova mere ka nkume ahụ gbata Golayat n’egedege ihu, ya abamie n’egedege ihu ya, Golayat adaa nwụọ. Mgbe ndị Filistịa hụrụ na Golayat anwụọla, ha agbaa ọsọ. Ị̀ tụkwasịrị Jehova obi ka Devid?

“N’anya ụmụ mmadụ, ihe a agaghị ekwe omume. Ma, e nweghị ihe nyịrị Chineke n’ihi na ihe niile kwere Chineke omume.”​—Mak 10:27

Ajụjụ: Ònye ka Jehova họọrọ ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel? Olee otú Devid si merie Golayat?

1 Samuel 16:1-13; 17:1-54

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya