ISI NKE 42
Jonatan Bụ Dike na Ezigbo Enyi Devid
Ọkpara Eze Sọl aha ya bụ Jonatan bụ dike n’agha. Devid kwuru na Jonatan na-efe ọsọ karịa ugo, dịkwa ike karịa ọdụm. Otu ụbọchị, Jonatan hụrụ ndị agha Filistia n’ugwu. Ha dị mmadụ iri abụọ. Ọ gwara onye na-eburu ya ngwá agha, sị: ‘Anyị ga-alụso ha agha ma ọ bụrụ na Jehova egosi anyị ihe àmà. Ọ bụrụ na ha asị anyị bịawa, anyị ga-amata na anyị kwesịrị ịlụso ha agha.’ Ndị agha Filistia tiri mkpu, sị: “Bịanụ lụso anyị agha.” N’ihi ya, Jonatan na onye na-eburu ya ngwá agha gbagooro n’ugwu lụso ha agha ma merie ha.
Jonatan gaara abụ eze ma nna ya nwụọ ebe ọ bụ ya bụ ọkpara. Ma, Jonatan ma na Jehova ahọrọla Devid ka ọ bụrụ eze ọzọ ga-achị ndị Izrel. N’agbanyeghị ya, o nwereghị ya anyaụfụ. Devid na Jonatan ghọrọ ezigbo enyi. Ha kwere ibe ha nkwa na ha ga na-enyere ibe ha aka ma na-agbachitere ibe ha. Jonatan nyere Devid uwe elu ya, mma agha ya, ụta ya, na ájị̀ ya iji gosi na ha abụrụla enyi.
Mgbe Devid na-agba ọsọ ka Sọl ghara igbu ya, Jonatan gakwuuru ya ma sị ya: ‘Dị ike ma nwee obi ike. Jehova ahọrọla gị ịbụ eze. Nna m makwa gbasara ya.’ Ị̀ ga-achọ inwe ezigbo enyi na-akpa àgwà ka Jonatan?
E nwere ihe karịrị otu ugboro Jonatan gaara anwụ maka na ọ chọrọ inyere Devid aka. Ọ ma na Eze Sọl nna ya chọrọ igbu Devid, n’ihi ya, ọ sịrị ya: ‘Ọ bụrụ na i gbuo Devid, i meela ihe ọjọọ n’ihi na o nweghị ihe o mere gị.’ Ihe a Jonatan kwuru were Sọl ezigbo iwe. Mgbe afọ ole na ole gachara, Sọl na Jonatan nwụrụ n’agha.
Mgbe Jonatan nwụrụ, Devid chọwara nwa Jonatan aha ya bụ Mefiboshet. Mgbe ọ chọtara ya, ọ gwara ya, sị: ‘M ga-elekọta gị ná ndụ gị niile n’ihi na nna gị bụ ezigbo enyi m mgbe ọ dị ndụ. Ị ga-ebi n’obí m, na-erikwa nri na tebụl m.’ Devid echefughị enyi ya Jonatan.
“Hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya. E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-enye ndụ ya maka ndị enyi ya.” —Jọn 15:12, 13