Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 43 p. 104
  • Mmehie Eze Devid Mere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmehie Eze Devid Mere
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Adị n’Ụlọ Devid
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Nkwupụta Mmehie nke Na-eduga n’Ọgwụgwọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Mgbe “Obi Tiwara Etiwa, nke Nọ ná Mwute” Na-arịọ Mgbaghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 43 p. 104
Ebe Netan onye amụma na-agwa Eze Devid okwu

ISI NKE 43

Mmehie Eze Devid Mere

Mgbe Sọl nwụrụ, Devid ghọrọ eze. Devid dị afọ iri atọ mgbe ahụ. Afọ ole na ole ọ chịwara, ọ nọ n’ụlọ elu ya n’abalị hụ otu nwaanyị mara mma. Devid chọpụtara na aha ya bụ Bat-shiba, nakwa na ọ bụ nwunye onye agha aha ya bụ Yuraya. Devid ziri ozi ka Bat-shiba bịa n’obí ya. Mgbe ọ bịara, ha kwara iko, Bat-shiba atụrụ ime. Devid gbalịrị izo ihe a o mere. Ọ gwara onyeisi ndị agha ya ka o ziga Yuraya n’ihu agha, ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ ma hapụ ya ebe ahụ laa azụ. E gburu Yuraya, Devid alụwazie Bat-shiba.

Ebe Eze Devid na-ekpe ekpere ka Chineke gbaghara ya

Ma Jehova hụrụ ihe ọjọọ a niile merenụ. Gịnị ka ọ ga-eme? Jehova ziri otu onye amụma aha ya bụ Netan ka ọ gaa hụ Devid. Netan gwara Devid, sị: ‘E nwere otu ọgaranya nwere ọtụtụ atụrụ, nweekwa otu ogbenye nwere naanị obere atụrụ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ọgaranya ahụ weere otu obere atụrụ ahụ ogbenye ahụ nwere.’ Mgbe Netan gwachara ya ihe a, Devid were iwe ma sị: ‘Ọgaranya ahụ kwesịrị ịnwụ.’ Netan gwaziri Devid, sị: ‘Ọ bụ gị bụ ọgaranya ahụ.’ Ihe a wutere Devid, ya agwa Netan, sị: “Emehiela m Jehova.” Mmehie a Devid mere wetaara ya na ezinụlọ ya ọtụtụ nsogbu. Jehova tara Devid ahụhụ, ma o gbughị ya n’ihi na o kwuru eziokwu ma dịrị umeala n’obi.

Devid chọrọ ịrụrụ Jehova ụlọ nsọ, ma Jehova họọrọ nwa ya nwoke aha ya bụ Solomọn ka ọ rụọ ya. Devid malitere ịkwadebere Solomọn ihe ndị ọ ga-eji arụ ya. Ọ sịrị: ‘Ụlọ nsọ Jehova ga-ama ezigbo mma. Solomọn ka bụ nwata, ma m ga-enyere ya aka ịkwadebe ihe ndị ọ ga-eji arụ ya.’ Devid nyere nnukwu ego maka ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Ọ kpọtara ndị nwere nkà. O wetara ọlaọcha na ọlaedo, meekwa ka e si n’obodo Taya na Saịdọn bute osisi sida. Mgbe oge ọnwụ ya ruwere, o nyere Solomọn akwụkwọ kwuru otú a ga-esi rụọ ụlọ nsọ ahụ. Devid kwuru, sị: ‘Jehova gwara m ihe ndị a m deere gị. Jehova ga-enyere gị aka. Atụla egwu. Nwee obi ike, bidokwa ọrụ.’

Ebe Devid na-agwa Solomọn nwa ya ka bụ nwata otú a ga-esi arụ ụlọ nsọ Chineke

“Ihe agaghị agaziri onye na-ezochi mmehie ya, ma a ga-emere onye ọ bụla kwupụtara mmehie ya ma hapụ ya ebere.”​—Ilu 28:13

Ajụjụ: Olee mmehie Devid mere? Gịnị ka Devid mere iji nyere Solomọn nwa ya aka?

2 Samuel 5:3, 4, 10; 7:1-16; 8:1-14; 11:1–12:14; 1 Ihe E Mere 22:1-19; 28:11-21; Abụ Ọma 51:1-19

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya