Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 55 p. 132
  • Mmụọ Ozi Jehova Napụtara Hezekaya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmụọ Ozi Jehova Napụtara Hezekaya
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Nye Ụgwọ Ọrụ Maka Okwukwe nke Otu Eze
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Chineke Enyere Eze Hezekaya Aka
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ole Ndị Taa Bụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Asaa na Ndị Isi Asatọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ọ Dịghị Enyemaka A Ga-enweta Site n’Ụwa A
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 55 p. 132
Ebe otu mmụọ ozi na-egbu ndị agha Asiria

ISI NKE 55

Mmụọ Ozi Jehova Napụtara Hezekaya

Ndị Asiria weghaara alaeze Izrel dị ebo iri. Senakerib eze Asiria chọwaziri iweghara alaeze Juda dị ebo abụọ. O ji nwayọọ nwayọọ na-ewekọrọ obodo ndị dị na Juda. Ma, obodo ọ chọsiri ike ka o weghara bụ Jeruselem. Ihe ọ na-amaghị bụ na Jehova na-echebe Jeruselem.

Hezekaya eze Juda nyere Senakerib nnukwu ego ka ọ hapụ iweghara Jeruselem. N’agbanyeghị na Senakerib naara ya ego ahụ, o zigakwara ndị agha ya ka ha gaa bibie Jeruselem. Mgbe ndị agha Asiria rutewere Jeruselem, ezigbo ụjọ jidere ndị Juda. Hezekaya gwaziri ha, sị: ‘Unu atụla egwu. Ndị agha Asiria siri ike, ma Jehova ga-eme ka anyị dị ike karịa ha.’

Senakerib zigara Rabshake ka ọ gaa Jeruselem kparịa ndị bi na ya. Rabshake gara guzoro n’akụkụ mgbidi Jeruselem ma jiri olu dara ụda na-agwa ha, sị: ‘Jehova agaghị enyeliri unu aka. Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu. E nweghị chi ga-anapụtali unu n’aka anyị.’

Hezekaya jụrụ Jehova ihe ya ga-eme. Jehova gwara ya, sị: ‘Ekwela ka ihe a Rabshake kwuru menye gị ụjọ. Senakerib agaghị eweghara Jeruselem.’ Senakerib mechara zigara Hezekaya akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ sịrị: ‘Chịlierenụ anyị aka elu. Jehova agaghị azọpụtali unu.’ Hezekaya rịọrọ Chineke, sị: ‘Jehova, biko, napụta anyị, ka onye ọ bụla mara na ọ bụ naanị gị bụ ezi Chineke.’ Jehova gwara ya, sị: ‘Eze Asiria agaghị abata na Jeruselem. M ga-echebe obodo m.’

Senakerib chere na o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara iweghara Jeruselem. Ma n’otu abalị, Jehova zigara otu mmụọ ozi ya n’ebe ndị agha Asiria mara ụlọikwuu. Mmụọ ozi ahụ gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na puku iri asatọ na puku ise (185,000). Ndị kacha ike ná ndị agha Eze Senakerib nwụrụ. O nweghị ihe ọzọ Senakerib ma ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ịla n’ụlọ ya n’ihi na e meriela ya. Jehova napụtara Hezekaya na Jeruselem otú o kwuru ọ ga-eme. Ọ bụrụ na ị nọ na Jeruselem n’oge ahụ, ị̀ gaara atụkwasị Jehova obi?

“Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.”​—Abụ Ọma 34:7

Ajụjụ: Olee otú Jehova si napụta Jeruselem? Ì chere na Jehova ga-anapụta gị?

2 Ndị Eze 17:1-6; 18:13-37; 19:1-37; 2 Ihe E Mere 32:1-23

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya