ISI NKE 62
Alaeze E Ji Tụnyere Nnukwu Osisi
Otu abalị, Nebukadneza rọrọ nrọ na-atụ ezigbo ụjọ. Mgbe o tetara, ọ kpọrọ ndị niile ma ihe ka ha kọwaara ya nrọ ahụ. Ma e nweghị onye n’ime ha nwere ike ịkọwa ya. Eze mechara gwa Daniel ka ọ kọwaara ya nrọ ahụ.
Nebukadneza gwara Daniel, sị: ‘Ná nrọ m rọrọ, ahụrụ m otu osisi. Osisi ahụ toro ezigbo ogologo nke na o ruru n’eluigwe. E nwere ike ịnọ n’ebe ọ bụla n’ụwa hụ ya. Akwụkwọ ya mara mma, mkpụrụ ọ mịrị dịkwa ọtụtụ. Anụ ọhịa na-anọ n’okpuru ya ezu ike, nnụnụ kpakwara akwụ́ ha n’alaka ya. Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a, otu mmụọ ozi si n’eluigwe gbadata. O ji oké olu kwuo, sị: “Gbutuonụ osisi a, gbukapụsịanụ alaka ya. Ma, hapụnụ úkwù osisi a na mgbọrọgwụ ya n’ala. Keekwanụ ya agbụ ígwè na agbụ ọla kọpa. Ka a gbanwee obi osisi a ka ọ ghara ịbụkwa obi mmadụ, ka ọ bụrụ obi anụ ọhịa, ka oge asaa gafeekwa. Mmadụ niile ga-amara na ọ bụ Chineke bụ Onye Na-achị Achị, o nwekwara ike inye onye ọ bụla ọ chọrọ alaeze.”’
Jehova mere ka Daniel ghọta ihe nrọ ahụ pụtara. Mgbe ọ ghọtara ya, ụjọ tụwara ya. O kwuru, sị: ‘Eze, ọ dị m ka nrọ a mezuo n’isi ndị iro gị, ma, ọ ga-emezu n’isi gị. Osisi ukwu ahụ e gbuturu bụ gị. A ga-anapụ gị alaeze gị, ị ga na-atakwa ahịhịa n’ọhịa ka anụ ọhịa. Ma, ebe ọ bụ na mmụọ ozi ahụ kwuru ka a hapụ úkwù osisi ahụ na mgbọrọgwụ ya, ị ga-emecha bụrụ eze ọzọ.’
Mgbe otu afọ gachara, Nebukadneza nọ na-agagharị n’elu ụlọ n’obí ya, na-ele otú Babịlọn si maa mma. O kwuru, sị: ‘Legodị otú obodo a m rụrụ si maa ezigbo mma. O nweghị onye dị ka m.’ Ka ọ nọ na-ekwu ihe a, otu olu si n’eluigwe gwa ya, sị: ‘Nebukadneza, a napụla gị alaeze gị.’
Ozugbo a gwachara Nebukadneza okwu a, ọ maghịzi onwe ya, ya emewe ka anụ ọhịa. A chụpụrụ ya n’obí ya, ya na anụ ọhịa ebiri n’ọhịa. Ntutu isi ya bịara too ogologo ka ábụ́bà ugo, mbọ́ ya adịkwa ka mbọ́ nnụnụ.
Mgbe Nebukadneza nọchara afọ asaa n’ọhịa, o nwetaghachiri onwe ya, Jehova emeekwa ka ọ bụrụ eze Babịlọn. Nebukadneza kwuziri, sị: ‘M na-eto Jehova, bụ́ Eze eluigwe. Amatala m ugbu a na Jehova bụ Onye Na-achị Achị. Ọ na-eweda ndị dị mpako ala, o nwekwara ike inye onye ọ bụla ọ chọrọ alaeze.’
“Nganga na-ala mmadụ n’iyi, mpako na-emekwa ka mmadụ daa.”—Ilu 16:18