Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 63 p. 150-p. 151 para. 1
  • Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Aka Dere ná Mgbidi
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ndị Chineke Ahapụ Babilọn
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Okwu Anọ Ndị Gbanwere Ụwa
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Alaeze Ukwu Efunahụ Otu Eze Dị Nganga
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 63 p. 150-p. 151 para. 1
Ebe otu aka na-ede ihe n’ahụ́ ájá

ISI NKE 63

Ihe E Dere n’Ahụ́ Ájá

Ka oge na-aga, Belshaza ghọrọ eze Babịlọn. N’otu abalị, ọ kpọrọ otu puku (1,000) mmadụ bụ́ ndị ọnụ na-eru n’okwu na Babịlọn oriri. Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha chịpụta iko ọlaedo ndị Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ Jehova. Belshaza na ndị ahụ ọ kpọrọ oriri malitere iji iko ndị ahụ na-aṅụ mmanya ma na-eto chi ha. Na mberede, ha hụrụ aka mmadụ nke malitere ide ihe n’ahụ́ ájá. E nweghịkwa onye nwere ike ịgụta ihe aka ahụ na-ede.

Ezigbo ụjọ bịara Belshaza, ya akpọọ ndị anwansi ya ma kwe ha nkwa, sị: ‘Onye ọ bụla ga-akọwara m ihe ihe ndị a e dere pụtara, m ga-eme ya onye nke atọ na-achị Babịlọn.’ Ha gbalịrị ka ha kọwaa ya, ma o nweghị onye n’ime ha nwere ike ịkọwa ya. Nne Belshaza batara ma gwaa ya, sị: ‘E nwere otu nwoke aha ya bụ Daniel, onye na-akọwara Nebukadneza nrọ ya. Ọ ga-akọwali ihe ndị a e dere.’

Daniel bịara n’ihu eze Belshaza, ya agwa ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i nwee ike ịgụ ihe ndị a e dere ma kọwaa ha, m ga-enye gị ihe olu ọlaedo, meekwa gị onye nke atọ na-achị Babịlọn.’ Daniel sịrị ya: ‘Achọghị m onyinye gị, ma m ga-akọwara gị ihe okwu ndị a pụtara. Nebukadneza nna gị buliri onwe ya elu, ma Jehova wedara ya ala. Ị ma ihe niile mere ya. Ma, ị kparịrị Jehova, gaa were iko ọlaedo si n’ụlọ nsọ ya na-aṅụ mmanya. Ọ bụ ya mere Chineke ji dee okwu ndị a: Mini, Mini, Tikel, na Pasịn. Ihe okwu ndị a pụtara bụ na ndị Midia na ndị Peshia ga-emeri Babịlọn, ị gaghịzi abụ eze.’

Ebe ndị agha Saịrọs ji ụkwụ na-agafe osimiri ma garuo n’ọnụ ụzọ ámá Babịlọn

Otú obodo Babịlọn dị mere ka o yie ka e nweghị onye ga-emerili ya. Nnukwu mmiri na nnukwu mgbidi gbara ya gburugburu. Ma, n’abalị ahụ Belshaza kpọrọ oriri ahụ, ndị Midia na ndị Peshia bịara lụso ha agha. Saịrọs, Eze Peshia mere ka mmiri ahụ gbara Babịlọn gburugburu sọrọ gawa ebe ọzọ ka ndị agha ya nwee ike iji ụkwụ ruo n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ. Mgbe ha ruru, ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ mepere emepe. Ndị agha ahụ banyere n’ime obodo ahụ, merie ha, gbuokwa eze ha. Saịrọs maliteziri ịchị Babịlọn.

Mgbe Saịrọs chịrị ihe dị ka otu afọ, o kwuru, sị: ‘Jehova gwara m ka m rụghachi ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem. Onye ọ bụla n’ime ndị ya chọrọ ịga nye aka rụghachi ya, nwere ike ịga.’ N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu laghachiri Jeruselem mgbe afọ iri asaa e bibiri Jeruselem gachara, otú Jehova kwere ná nkwa. Saịrọs chịghachiri iko ọlaedo na ọlaọcha na ihe ndị ọzọ Nebukadneza bukọọrọ n’ụlọ nsọ Chineke. Ị̀ hụrụ otú Jehova si jiri Saịrọs napụta ndị Juu?

“Babịlọn Ukwu ahụ adaala! Ọ daala! Ọ ghọọla ebe ndị mmụọ ọjọọ bi.”​—Mkpughe 18:2

Ajụjụ: Gịnị ka ihe ahụ e dere n’ahụ́ ájá pụtara? Olee ihe Jehova gwara Saịrọs ka o mee?

Ezra 1:1-11; Daniel 5:1-30; Aịzaya 44:27–45:2; Jeremaya 25:11, 12

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya