ISI NKE 65
Esta Napụtara Ndị Obodo Ha
Esta bụ nwa agbọghọ onye Juu. O biri n’obodo dị na Peshia aha ya bụ Shushan. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ezinụlọ ha so ná ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha. Ọ bụ nwa nwanne papa Esta aha ya bụ Mọdekaị zụrụ ya. Mọdekaị na-ejere eze ndị Peshia aha ya bụ Ahazuirọs ozi.
Eze Ahazuirọs chọrọ ịlụ nwaanyị ọhụrụ. Ndị na-ejere ya ozi kpọtaara ya ụmụ nwaanyị ndị kacha maa mma na Peshia. Esta sokwa ná ndị a kpọtaara ya. N’ime ụmụ nwaanyị niile a kpọtaara ya, eze họọrọ Esta ka ọ bụrụ nwunye ya. Mọdekaị gwara Esta ka ọ ghara ịgwa onye ọ bụla na yanwa bụ́ Esta bụ onye Juu.
E nwere otu nwoke dị mpako aha ya bụ Heman. Ọ bụ ya bụ onyeisi ndị niile e mere ndị isi na Peshia. Ọ chọrọ ka onye ọ bụla na-akpọrọ ya isiala. Mọdekaị ekweghị akpọrọ ya isiala. N’ihi ya, ezigbo iwe were ya nke na ọ chọwara igbu Mọdekaị. Mgbe Heman chọpụtara na Mọdekaị bụ onye Juu, ọ kpara nkata otú a ga-esi egbu ndị Juu niile bi na Peshia. Ọ gwara eze, sị: ‘Ndị Juu bụ ndị ọjọọ. I kwesịrị igbu ha niile.’ Ahazuirọs gwara ya, sị: ‘Mee ihe ọ bụla ị chọrọ ime.’ O nyekwara Heman ikike ime iwu ga-akwado ihe a ọ chọrọ ime. Heman mere iwu kwuru ka e gbuo ndị Juu niile n’abalị iri na atọ n’ọnwa ndị Juu a na-akpọ Eda. Jehova nọ na-ele ihe na-emenụ.
Esta amaghị banyere iwu a. N’ihi ya, Mọdekaị zigaara ya otu n’ime akwụkwọ e dere iwu a ma sị ya: ‘Gaa gwa eze okwu.’ Esta gwara ya, sị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ agaa ịhụ eze ma ọ́ bụghị eze kpọrọ ya, a ga-egbu onye ahụ. Eze akpọbeghị m ka m bịa hụ ya kemgbe ụbọchị iri atọ ugbu a. Ma, m ga-agakwuru ya. Ọ bụrụ na o setịara m mkpanaka ya, a gaghị egbu m. Ọ bụrụkwanụ na o setịrịghị m mkpanaka ya, a ga-egbu m.’
Esta banyere n’obí eze. Mgbe eze hụrụ ya, o setịịrị ya mkpanaka ya. Ọ gakwuuru eze, eze ajụọ ya, sị: ‘Esta, gịnị ka m ga-emere gị?’ Esta gwara ya, sị: ‘M chọrọ ka gị na Heman bịa oriri n’ụlọ m.’ Ka ha nọ na-eri ihe, Esta kpọkwara ha oriri ọzọ. Mgbe ha gara, eze jụrụ Esta ọzọ, sị: ‘Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?’ Esta gwara ya, sị: ‘E nwere onye chọrọ igbu mụ na ndị obodo anyị. Biko, napụta anyị.’ Eze jụrụ ya, sị: ‘Ònye chọrọ igbu gị?’ Esta gwara ya, sị: ‘Ọ bụ Heman ọjọọ a.’ Ezigbo iwe were Ahazuirọs nke na o nyere iwu ka e gbuo Heman ozugbo.
Ma, ọ dịghị onye nwere ike ịkagbu iwu ahụ Heman mere. Eze enwedịghị ike ịkagbu ya. Eze meziri Mọdekaị onyeisi ndị isi niile e nwere na Peshia ma nye ya ikike ime iwu ọhụrụ. Mọdekaị mere iwu nke nyere ndị Juu ikike igbu onye ọ bụla bịara igbu ha. Ndị Juu meriri ndị iro ha n’abalị iri na atọ n’ọnwa Eda. Kemgbe ahụ, ha na-eme ememme kwa afọ iji cheta mmeri ahụ ha meriri.
“A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka unu si otú ahụ gbaara ha na ndị mba ọzọ àmà.”—Matiu 10:18