ISI NKE 72
Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ
Josef na Meri na nwa ha Jizọs nakwa ụmụ ha ndị nwoke ndị ọzọ na ụmụ ha ndị nwaanyị bi na Nazaret. Josef bụ ọkwá nkà. Ọ bụ ọrụ o ji akpa afọ ezinụlọ ya. Ọ na-akụzikwara ha gbasara Jehova na Iwu ya. Ha na-aga n’ụlọ nzukọ ndị Juu mgbe niile efe Chineke, na-agakwa Jeruselem otu ugboro n’afọ maka Ememme Ngabiga.
Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, ndị ezinụlọ ha gbara okporo gaa Jeruselem otú ha si eme kwa afọ. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa Jeruselem maka Ememme Ngabiga, ya emee ka ndị mmadụ ju ebe niile n’obodo a. Mgbe e mechara ememme a, Josef na Meri na ọtụtụ ndị ikwu ha so na-ala, ha echee na Jizọs sokwa ha. Ka ha na-ala, ha chọrọ ya n’etiti ndị ikwu ha, ma ha ahụghị ya.
Josef na Meri laghachiri Jeruselem na-achọgharị Jizọs. Ha chọrọ ya abalị atọ, mechaa hụ ya n’ụlọ nsọ. Ha hụrụ ya ebe ọ nọ ọdụ n’etiti ndị na-akụzi ihe n’ụlọ nsọ, na-ege ha ntị nke ọma ma na-ajụ ha ezigbo ajụjụ. Otú o si gee ha ntị na ajụjụ ndị ọ nọ na-ajụ ha masịrị ha nke na ha malitere ịjụ ya ajụjụ. Ihe Jizọs zara ha jukwara ha anya. Ha chọpụtara na ọ ma Iwu Jehova nke ọma.
Obi erughị Josef na Meri ala oge niile ahụ ha nọ na-achọ Jizọs. Ọ bụ ya mere Meri ji gwa Jizọs, sị: ‘Nwa m, mụ na papa gị nọ na-achọgharị gị kemgbe. Olee ebe ị nọ kemgbe?’ Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”
Jizọs sooro ndị mụrụ ya laghachi Nazaret. Josef kụziiri Jizọs ọrụ ịkwa nkà ọ na-arụ. Olee ụdị onye i chere Jizọs bụ mgbe ọ na-eto eto? Ka ọ na-eto, ọ nọ na-enwekwu amamihe, ihe ya nọkwa na-amasị ma Chineke ma ndị mmadụ.
“Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ, iwu gị dịkwa n’ime ime obi m.”—Abụ Ọma 40:8