Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 94 p. 220-p. 221 para. 1
  • Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ha Nọ Na Jeruselem Na-echere
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • ‘N’aha nke Mmụọ Nsọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jehova Bụ Onye Na-achị Anyị!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 94 p. 220-p. 221 para. 1
O juru ndị nọ na Jeruselem anya ịnụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-agwa ndị nọ na Jeruselem okwu n’asụsụ ha

ISI NKE 94

Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

Abalị iri Jizọs laghachiri eluigwe, mmụọ nsọ dakwasịrị ndị na-eso ụzọ ya n’oge Ememme Pentikọst nke afọ 33. Ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa Jeruselem maka ememme a. Ndị na-eso ụzọ Jizọs, ndị dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ (120), zukọrọ n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu otu ụlọ. Na mberede, ihe dị ịtụnanya mere. Ihe dị ka ọkụ bịara dịrị n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha, ha niile ebido kwuwe okwu n’asụsụ dị iche iche. Ụzụ nke dị ka ụzụ oké ifufe nọ na-adasi ike n’ụlọ ahụ.

Ndị si ebe dị iche iche bịa Jeruselem nụrụ ụzụ a ma gbara gaa n’ụlọ ahụ ka ha mara ihe na-emenụ. O juru ha anya mgbe ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Ha sịrị: ‘Ndị a niile bụ ndị Galili. Oleezi otú ha si na-asụ asụsụ anyị?’

Pita na ndịozi ndị ọzọ guzoro n’ihu ìgwè mmadụ ahụ. Pita gwara ha otú e si gbuo Jizọs nakwa na Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ sịrị: ‘Ugbu a, Jizọs nọ n’eluigwe, n’aka nri Chineke. Ọ wụsala anyị mmụọ nsọ a o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere unu ji nụ ma hụ ọrụ ebube ndị a.’

Ihe ndị ahụ Pita kwuru ruru ìgwè mmadụ ahụ n’obi, ha ajụọ, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” Ọ gwara ha, sị: ‘Chegharịanụ, ka e meekwa unu baptizim n’aha Jizọs. Unu ga-anatakwa mmụọ nsọ Chineke na-enye n’efu.’ N’ụbọchị ahụ, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ (3,000) baptizim. Si mgbe ahụ gawa, ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere na-amụba n’ike n’ike na Jeruselem. Mmụọ nsọ mere ka ndịozi Jizọs malite ọgbakọ ọhụrụ dị iche iche nke mere ka ha nwee ike ịkụziri ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe niile o nyere ha n’iwu.

“Ọ bụrụ na i ji ọnụ gị ekwusa n’ihu ọha na Jizọs bụ Onyenwe anyị ma nwee okwukwe n’obi gị na Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, a ga-azọpụta gị.”​—Ndị Rom 10:9

Ajụjụ: Gịnị mere n’oge Ememme Pentikọst nke afọ 33? Gịnị mere e ji mee ọtụtụ mmadụ baptizim?

Ọrụ Ndịozi 1:15; 2:1-42; 4:4; Jọn 15:26

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya