ISI NKE 96
Jizọs Họọrọ Sọl
Sọl bụ nwa amaala Rom a mụrụ na Tasọs. Ọ bụ onye Farisii ma iwu ndị Juu nke ọma. Ọ kpọkwara Ndị Kraịst asị. Ọ na-aga n’ụlọ Ndị Kraịst kpụrụ ha gaa tụba n’ụlọ mkpọrọ. O guzodị na-ele ka ìgwè mmadụ iwe ji ji okwute tụgbuo otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Stivin.
Ma, ịkpụrụ Ndị Kraịst nọ na Jeruselem gaa tụba n’ụlọ mkpọrọ ezurughị Sọl. Ọ gwara nnukwu onye nchụàjà ka o ziga ya Damaskọs ka ọ gaa jidekwa Ndị Kraịst nọ ebe ahụ. Mgbe Sọl ruwere Damaskọs, ìhè si n’elu nwuo gburugburu ya na mberede, ya adaa n’ala. Ọ nụrụ olu kwuru, sị: “Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” Sọl ajụọ, sị: ‘Ị̀ bụ onye?’ Olu ahụ zara ya, sị: ‘Abụ m Jizọs. Banye Damaskọs, a ga-agwa gị ihe ị ga-eme.’ Ozugbo ahụ, Sọl kpuru ìsì, e sere ya n’aka ma duru ya banye n’obodo ahụ.
E nwere ezigbo Onye Kraịst bi na Damaskọs aha ya bụ Ananayas. Jizọs gwara ya n’ọhụụ, sị: ‘Gaa chọọ Sọl n’ụlọ Judas nke dị n’okporo àmà a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ.’ Ananayas sịrị: ‘Onyenwe anyị, ama m ọtụtụ ihe gbasara nwoke ahụ. Ọ na-atụba ndị na-eso ụzọ gị n’ụlọ mkpọrọ.’ Ma, Jizọs gwara ya, sị: ‘Gakwuru ya. Ahọrọla m ya ka ọ gaa kwusaara mba dị iche iche ozi ọma.’
Ananayas gara ebe ahụ ma gwa Sọl, sị: ‘Sọl, nwanna m, Jizọs zitere m ka m mee ka ị hụwa ụzọ.’ Ozugbo ahụ, Sọl hụwara ụzọ ọzọ. A kụziiri ya banyere Jizọs, mee ya baptizim, ya abụrụzie Onye Kraịst. Ọ maliteziri iso Ndị Kraịst ibe ya na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ. Olee otú i chere obi dị ndị Juu mgbe ha hụrụ Sọl ka ọ na-akụziri ndị mmadụ banyere Jizọs? O juru ha anya. Ha sịrị: ‘Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ na-ejide ndị na-eso ụzọ Jizọs?’
Sọl nọrọ na Damaskọs afọ atọ na-ekwusa ozi ọma. Ndị Juu kpọziri ya asị ma chọwa otú ha ga-esi egbu ya. Ma, mgbe ụmụnna matara ihe ha chọrọ ime, ha nyeere ya aka ka ọ gbapụ. Ha tinyere ya na nkata ma si n’oghere dị na mgbidi obodo ahụ butuo ya.
Mgbe Sọl gara Jeruselem, ọ gbalịrị ka o sonyere ụmụnna ndị nọ ebe ahụ. Ma, ha nọ na-atụ ya ụjọ. Otu onye dị obiọma, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Banabas, kpọọrọ Sọl gakwuru ndịozi Jizọs ma mee ka ha ghọta na Sọl agbanweela. Sọl sooro ọgbakọ dị na Jeruselem kwusasiwe ozi ọma ike. O mechara zawa Pọl.
“Kraịst Jizọs bịara n’ụwa a ka ọ zọpụta ndị mmehie. . . . N’ime ndị mmehie a niile, ọ bụ m kacha bụrụ onye mmehie.”—1 Timoti 1:15