IGBE 2B
Ihe Ndị Mere N’oge Ezikiel
Ezikiel pụtara “Chineke Na-enye Ike.” Ọ bụ eziokwu na Ezikiel ji amụma ndị o buru dọọ ndị mmadụ aka ná ntị, ihe niile o dere dabara n’ihe aha ya pụtara. Ihe ndị ahụ mere ka okwukwe ndị chọrọ ife Chineke ezigbo ofufe sie ike.
NDỊ AMỤMA HA NA EZIKIEL DỊKỌRỌ NDỤ
JEREMAYA
si n’ezinụlọ ndị nchụàjà. Ọ bụ na Jeruselem ka ọ kacha buo amụma (647-580 T.O.N.K.)
HỌLDA
buru amụma n’oge a chọtara akwụkwọ Iwu Mosis n’ụlọ nsọ n’ihe dị ka afọ 642 T.O.N.K.
DANIEL
si n’ezinụlọ ndị eze Juda. A kpọọrọ ya gaa Babịlọn n’afọ 617 T.O.N.K.
HABAKỌK
buru amụma na Juda. Ọ ga-abụ na o buru ya obere oge Jehoyakim malitere ịchị
OBEDAYA
buru amụma ihe a ga-eme Ịdọm. Ọ ga-abụ na o buru amụma n’oge e bibiri Jeruselem
OLEE MGBE HA BURU AMỤMA? (OGE A NIILE BỤ T.O.N.K.)
IHE NDỊ BỤ́ ISI MERE NÁ NDỤ EZIKIEL (OGE A NIILE BỤ T.O.N.K.)
dk.643: Mgbe a mụrụ ya
617: A dọọrọ ya n’agha laa Babịlọn
613: Ọ malitere ibu amụma; Jehova mere ka ọ hụ ọhụụ
612: Ọ hụrụ ọhụụ ebe ndị hapụrụ Chineke nọ n’ụlọ nsọ na-efe arụsị
611: Ọ malitere ikwu ikpe a ga-ama Jeruselem
609: Nwunye ya nwụrụ. Ndị agha malitere ịnọchibido Jeruselem nke ikpeazụ ya
607: O nwetara ozi na e bibiela Jeruselem
593: Ọ hụrụ ụlọ nsọ n’ọhụụ
591: O buru amụma na Nebukadneza ga-alụso Ijipt agha. O dechara akwụkwọ ya
NDỊ EZE JUDA NA NDỊ EZE BABỊLỌN
659-629: Josaya nyeere ndị mmadụ aka ka ha fee Chineke otú kwesịrị ekwesị. Ma ọ nwụrụ mgbe ọ gara ịlụso Fero Niko agha
628: Jehoahaz bụ eze ọjọọ chịrị ọnwa atọ. Fero Niko nwụchiri ya
628-618: Jehoyakim bụ eze ọjọọ. Fero Niko mere ka Jehoyakim nọrọ n’okpuru ya
625: Nebukadneza meriri ndị agha Ijipt
620: Nebukadneza lụsoro Juda agha nke mbụ ya, meekwa Jehoyakim eze ga-anọ n’okpuru ya na Jeruselem
618: Jehoyakim nupụụrụ Nebukadneza isi. Ma ọ ga-abụ na ọ nwụrụ mgbe Nebukadneza bịara agha nke ugboro abụọ n’Ala Nkwa ahụ
617: Jehoyakin, onye a na-akpọkwa Jekonaya, bụ eze ọjọọ chịrị ọnwa atọ ma chịliere Nebukadneza aka elu
617-607: Zedekaya bụ eze ọjọọ, bụrụkwa onye ụjọ. Nebukadneza mere ya eze ga-anọ n’okpuru ya
609: Zedekaya nupụụrụ Nebukadneza isi. Nebukadneza lụsoziri Juda agha nke ugboro atọ ya
607: Nebukadneza bibiri Jeruselem. O jidere Zedekaya, rụkpọọ ya anya, kpụrụzie ya laa Babịlọn