Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lmd ihe ọmụmụ 12
  • Nwee Obi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nwee Obi Ike
  • Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Jizọs Mere
  • Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?
  • Na-eme Ka Jizọs
  • Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Abụọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Otú E Si Eduziri Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl Ga-eme Ka O Ruo Eru Ime Baptizim—Agba nke Mbụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • ‘Ya Mere, Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
lmd ihe ọmụmụ 12

IME KA HA BỤRỤ NDỊ NA-ESO ỤZỌ JIZỌS

Ebe Jizọs medara obi na-agwa otu nwoke okwu. Nwoke ahụ gbusara ikpere n’ala n’ihu Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya.

Mak 10:17-22

IHE ỌMỤMỤ NKE 12

Nwee Obi Ike

Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Mmanụ na ihe na-esi ísì ọma na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ. Ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-emekwa ka obi dị enyi ya ụtọ.”​—Ilu 27:9.

Ihe Jizọs Mere

Ebe Jizọs medara obi na-agwa otu nwoke okwu. Nwoke ahụ gbusara ikpere n’ala n’ihu Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya.

VIDIO: Jizọs Nyere Otu Nwa Okorobịa Bara Ọgaranya Bụ́ Onye Ọchịchị Ndụmọdụ

1. Lee VIDIO, ma ọ bụ gị agụọ Mak 10:17-22. Zazie ajụjụ ndị a:

  1. Olee àgwà ndị dị mma o nwere ike ịbụ na Jizọs chọpụtara na nwa okorobịa ahụ bụ́ onye ọchịchị nwere?

  2. Gịnị mere Jizọs ji kwesị ịhụ nwoke ahụ n’anya ma nwee obi ike ka o nwee ike inye ya ndụmọdụ?

Gịnị Ka Anyị Na-amụta n’Aka Jizọs?

2. Anyị kwesịrị igosi ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na anyị hụrụ ha n’anya ma kọwaara ha n’ezoghị ọnụ ihe ha kwesịrị ime ka ha na Jehova dịrịkwuo ná mma.

Na-eme Ka Jizọs

3. Nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ikpebi ihe ndị ọ ga-eme ma mee ha.

  1. a. Jiri “Ihe Ị Ga-agba Mbọ Mee” nke dị n’isi nke ọ bụla n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nyere ya aka.

  2. b. Nyere ya aka ka ọ chọpụta ihe ndị ọ ga-eme ka o nwee ike ime ihe ndị o kpebiri ime, ma ndị ga-ewe obere oge ma ndị ga-ewe ogologo oge.

  3. ch. Na-aja ya mma mgbe niile maka otú o si eme nke ọma.

4. Chọpụta ihe ndị na-eme ka ọ ghara ịna-eme nke ọma, nyekwara ya aka imeri ha.

  1. Jụọ onwe gị, sị:

    • ‘Ọ bụrụ na onye m na-amụrụ Baịbụl anaghị agba mbọ ime baptizim, gịnị na-egbochi ya?’

    • ‘Olee ihe m ga-eme ka m nyere ya aka?’

  2. Kpee ekpere ka Jehova mee ka i jiri obi ike gwa ya hoo haa ihe o kwesịrị ime, kwuokwa ya otú na-egosi na ị hụrụ ya n’anya.

5. Kwụsị ọmụmụ Baịbụl ahụ ma ọ bụrụ na ọ naghị eme nke ọma.

  1. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a ka ị mata ma onye ị na-amụrụ Baịbụl ọ̀ na-eme nke ọma:

    • ‘Onye m na-amụrụ ihe ọ̀ na-eme ihe ọ na-amụta?’

    • ‘Ọ̀ na-abịa ọmụmụ ihe ma na-agwa ndị ọzọ eziokwu ọ na-amụta?’

    • ‘Ọ̀ bụrụ na ọ mụọla ihe ruo ogologo oge, ọ̀ chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova?’

  2. Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe achọghị ime nke ọma:

    • Gwa ya ka o chebara ihe o nwere ike ịbụ ya mere na ọ naghị eme nke ọma echiche.

    • Meda obi kọwaara ya ihe mere i ji akwụsị ọmụmụ ihe gị na ya.

    • Gwa ya ihe o kwesịrị ime tupu gị amụwara ya ihe ọzọ.

I NWEKWARA IKE ỊGỤ

Ọma 141:5; Ilu 25:12; 27:6; 1 Kọr. 9:26; Kọl. 4:5, 6

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya