Nkwusa Zuru Ụwa Ọnụ nke Ozi Ọma
ALAEZE Chineke na-achị achị! Nke a bụ ozi kachasị ozi nile mma. Ọ bụ ya mere na n’afọ 1989, ihe karịrị 3,700,000 Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ji ịnụ ọkụ n’obi kpọsaa “ozi ọma” ahụ Jisọs buru amụma ya nakwa “ozi ọma” ahụ nke mmụọ ozi ahụ Jọn hụrụ n’ọhụụ zisara. (Matiu 24:14; Mkpughe 14:6) Dị ka Pọl onyeozi si kọọ: “N’ụwa nile ka olu ha pụrụ jezuo, ná nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.” (Ndị Rom 10:18) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị mmadụ sitere ná mba nile na ebo nile na asụsụ nile na ndị nile jikwa obi ụtọ nakwere òkù ahụ ha kpọrọ ‘ịtụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto.’ —Mkpughe 14:7.
Ịnshọransị nke Ndụ Agaghị Adịkwa Ọzọ
Otu n’ime ndị dị otú ahụ bụ otu nwoke bi n’England, onye na-achọta ihe ọ na-eri site n’ọnọdụ ndụ nke a na-ejighị n’aka. Ken bụ onye ọrụ ịnshọransị, mgbe o jekwara n’ụlọ nke otu ezinụlọ Ndịàmà Jehova, ha jụrụ ya, sị: “Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ime ụwa ebe idejupụta akwụkwọ ịnshọransị nke ndụ na-agaghị adị mkpa?” Gịnị ka ihe ha na-ekwu pụtara? Ọ bụ na dị ka Bible si kwuo, n’okpuru Alaeze Chineke, ọtụtụ ihe ndị na-eme ka ndụ bụrụ ihe a na-ejighị n’aka ugbu a, gụnyere ọrịa na ọnwụ, agaghị adịkwa ọzọ.
Ihe dị otú ahụ ọ̀ pụrụ ime eme? Ee, Chineke n’onwe ya ekwewo nkwa ya. Dị ka ihe atụ, Bible na-asị: “Chineke . . . ga-ebinyekwara ha [ụmụ mmadụ]. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Gịnị ga-eweta ụdị mgbanwe nke a? Ọ bụ Alaeze Chineke. Dị ka Okwu Chineke si kwuo, n’oge na-adịghị anya, nke a gaje ‘itipịa alaeze ndị a [nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị oge a] nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.’—Daniel 2:44.
Ndịàmà Jehova dọọrọ uche ọtụtụ narị nde mmadụ gaa n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị yiri ndị a n’oge ọrụ nkwusa ha zuru ụwa ọnụ. Ọtụtụ ndị, dị ka Ken, mesịrị ghọta na nke a abụghị ọchịchọ efu e chepụtara n’uche. Ihe àmà e nwere bụ nke doro anya. A pụrụ nnọọ ịtụkwasị nkwa Chineke ndị a obi, ha gajekwa imezu n’oge na-adịghị anya.
Ụzọ Ile Ihe Anya A Gbanwere Agbanwe
Ndị na-ege Ndịàmà Jehova ntị ka ha nọ na-eme mkpọsa ahụ na-enye ọnụ nke mmụọ ozi ahụ na-aghọta na ịtụ egwu Chineke na inye ya otuto gụnyere ihe karịrị nanị ikwere ná nkwa Bible nile. Ọ na-agbanwe ụzọ ha si ele ndụ anya n’ozuzu ya, na-ewepụkwa ọtụtụ nchekasị a na-enwe ná ndụ.
Rafael na nwunye ya hụtara na nke a bụ eziokwu. Ha bi n’Argentina, mgbe ha lụkwara di na nwunye ihe karịrị 40 afọ gara aga, ha mere ka ọ bụrụ isi ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ ịrụsi ọrụ ike iji wee chebe ego maka ọdịnihu e ji n’aka. Otú ọ dị, mgbe 21 afọ gasịrị, nanị ihe ha rụpụtaworo ná mgbalị ha nile bụ nwa ụlọ nta nke ọ dị mkpa ka a na-arụzigharị mgbe mgbe. Ha enweghị mmetụta nke ndị nọ ná ntụkwasị obi karịa ka ha nwere na mgbe ahụ ha lụrụ di na nwunye ọhụrụ.
Mgbe ahụ, ha nụrụ ozi ọma site n’ọnụ Ndịàmà Jehova wee mụta banyere ụdị akụ ka mma na ụdị ịnọ ná ntụkwasị obi ka mma. Jisọs, n’Ozizi Elu Ugwu ya, kwuru banyere nke a mgbe ọ sịrị: “Unu akpadola akụ n’ụwa nye onwe unu, ebe nlá na nchara na-erichapụ, ebe ndị ohi na-egwupukwa na-ezukwa ohi: kama kpadoonụ akụ n’eluigwe nye onwe unu, ebe nlá ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ, ebe ndị ohi na-adịghị egwupukwa, ha adịghị ezukwa ohi.”—Matiu 6:19, 20.
Ọ bụ ezie na Bible adịghị akụziri anyị ịghara ime ihe kwesịrị ekwesị n’ihe banyere ihe onwunwe a na-ahụ anya, ma ọ na-agba anyị ume ka anyị ghara itinye olileanya anyị n’ihe ndị dị otú ahụ. (Eklisiastis 7:12) Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịrụsi ọrụ ike inweta ihe onwunwe ime mmụọ site n’ịmụ Bible, ịmụta ihe bụ uche Chineke, na idebe ime uche ya ahụ n’ọkwá mbụ ná ndụ anyị. (Matiu 6:33) Rafael na nwunye ya malitere ịkwakọba akụ ime mmụọ nke a, ugbu a, ha nwekwara mmetụta nke ịbụ ndị bara ọgaranya n’ezie, ọ bụghị n’ihi ọnọdụ ego ha, kama n’ihi mmekọrịta ha na Chineke nwere. (Mkpughe 3: 17, 18) Ozi nke Alaeze Chineke bụụrụ ha ozi dị mma nke ukwuu.
Alụmdi na Nwunye nke E Mekwatara
Ozi ọma ahụ nwere nnọọ ike ịrụzu ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, John, onye bi n’England, enweghị mmasị na Bible, ma nwunye ya na ụmụ ya nwere mmasị. Ya mere, ha malitere ịdị na-eje nzukọ Ndịàmà Jehova dị iche iche ebe John na ndị enyi ya nọ na-aga na-aṅụrụ mmanya. N’ihi nke a, ọ dabara n’ịṅụbiga mmanya ókè, ise sịga, na, mgbe e mesịrị, ịkwa iko. N’ikpeazụ, ọ hapụrụ nwunye ya ije binyere nwanyị ọzọ.
Ha malitere itinye akwụkwọ ndị na-eduje n’ịgba alụkwaghịm. Ma ọ bụụrụ John ihe ijuanya ịhụ na nwunye ya—onye mụtaworo àgwà ndị Kraịst site n’ọmụmụ ọ na-amụ ozi ọma ahụ—ka na-emeso ya omume dị mma. John apụghị ịghọta ihe kpatara nke a. Izu atọ tupu e kwubie okwu ịgba alụkwaghịm ahụ, àgwà ndị Kraịst nke nwunye John nwere mmetụta pụtara ìhè. Ọ kwara ụta nke ukwuu maka omume ya, a kwụsịkwara okwu ịgba alụkwaghịm ahụ. Ugbu a, John lebara anya n’ozi ọma ahụ n’onwe ya wee sorokwa Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ugbu a, ya onwe ya bụkwa onye Kraịst, ya na nwunye ya na-agwakwa ndị ọzọ okwu banyere ozi ọma ahụ nke Alaeze.
N’ụbọchị ndị a mgbe ọnọdụ ezinụlọ dị iche iche na-adakpọsị, enyemaka nke ozi ọma ahụ dabeere na Bible na-enye dị ọtụtụ ndị mkpa. Otu n’ime Ndịàmà Jehova na Peru nọ n’akụkụ otu onye soja nọ n’ọkwa colonel n’oge ha nọ n’otu njem ụgbọ elu. Ha malitere inwe mkparịta ụka, onye colonel ahụ wee malite ịkọ nsogbu nile nke ezinụlọ ya, gụnyere eziokwu ahụ nke bụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ eriwo nwunye ya ahụ, na ọ na-achọkwa ịhapụ ya ịlakwuru otu nwa okorobịa. Onyeàmà ahụ ji akọ gosi ya na Bible na-enye ezi ndụmọdụ siri ike n’okwu ndị metụtara ezinụlọ, na o nyewokwara ya onwe ya aka idozi nsogbu dị iche iche n’ezinụlọ nke ya.—Ndị Efesọs 5:21-6:4.
Onye colonel ahụ kelere Onyeàmà ahụ maka okwu agbamume ya nile wee tụọkwa ụtụ maka magazin Ụlọ Nche na Teta! ka o wee mụbakwuo ihe ọmụma ya banyere ozi ọma ahụ. Mgbe ahụ, mgbe Onyeàmà ahụ na-ahapụ ụgbọ elu ahụ, otu nwa okorobịa na nwunye ya gasiri ike iji bịakwute ya wee sị na ọ dị ihe ha chọrọ ịgwa ya. “Anyị nọ n’oche dị n’ihu nke gị,” ka ha sịrị, “anyị nụkwara mkparịta ụka gị na nwoke ahụ nwere. Ọ ga-amasịkwa anyị ịtụ ụtụ magazin ndị ahụ.” Ha onwe ha chọkwara ịmụta ozi ọma ahụ nke pụrụ imeziwanye ndụ.
Ndụ A Gbanwere Agbanwe
Ọzọkwa, ozi ọma ahụ nke dabeere na Bible na-agbanwe ụmụ mmadụ. Dị ka Pọl onyeozi kwuru: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Nke a bụ eziokwu n’ihe banyere otu nwa okorobịa bi na Masedonia, Gris. Ọ bụụrụ ya ihe ịtụnanya ịmụta na, dị ka Bible si kwuo, na aha Chineke bụ Jehova. O wee rịọ otu enyi ya ka o mee ka ya na Ndịàmà Jehova zute n’oge na-adịghị anya. E mere ndokwa iso Ndịàmà ahụ nwee mkparịta ụka ugbo abụọ, nke nke ọ bụla n’ime ha dịruru awa anọ. Mgbe ahụ, nwa okorobịa ahụ malitere ọmụmụ Bible a na-enwe mgbe nile, nke mbụ ya dịrukwara elekere abụọ nke isi ụtụtụ!
Malite n’ọmụmụ ihe nke mbụ ahụ, nwa okorobịa ahụ mere ihe ngwa ngwa ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Bible nile. O sooro Ndịàmà Jehova na-eje nzukọ ofufe dị iche iche, hụkwa Onye Okike ahụ n’anya nke ukwuu. Jehova gọzikwara ya. N’izu mbụ nke ọmụmụ Bible ya, ọ kpalatara agịrị isi ogologo ya. N’izu nke abụọ, ọ kwụsịrị ije n’ụlọ mmanya na ebe dị iche iche a na-ete egwú disco maka ịchọta ndị mkpakọrịta na-enye ya mkpali. N’izu nke atọ, ọ kwụsịrị ise siga kpam kpam. Mgbe ọ mụsịrị ihe ruo ọnwa abụọ, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova ahụ na-eje ịgwa ndị ọzọ ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ee, o nwere obi ụtọ na Ndịàmà Jehova wetara ozi ọma ahụ n’akụkụ ụwa ebe o bi.
Ozi Ọma n’Ime Ụlọ Mkpọrọ
Ọbụna ihe mkpọchi ụlọ mkpọrọ adịghị egbochi ozi ọma ahụ. Na Spain, otu nwa okorobịa aha ya bụ José, ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ruo ogologo oge n’ihi iji égbè ezu ohi tinyere mpụ ndị ọzọ o mere. Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova nwere ike ịgwa ya ozi ọma, ozi Bible ahụ gbanwekwara ụzọ o si ele ihe anya kpam kpam. Jehova ‘nyere ya ike.’—Ndị Filipaị 4:13.
José kwuru na ya pụrụ nnọọ ịnọ ihe fọdụrụ ná ndụ ya n’ime usoro ihe nke dị ugbu a n’ime ụlọ mkpọrọ n’ihi àgwà ndị ọ kpara na mbụ. Ma, o mewo baptism, ọ bụkwa onye Kraịst ugbu a. Nwunye ya na-enye ya ezi nkwado, na-agbalịkwa inye nwa ha nwoke dị nta ọzụzụ ndị Kraịst. Ka ọ dị ugbu a, José na-eso ndị mkpọrọ ibe ya na-ekerịta ozi ọma ahụ, bụ́ mmadụ ndị ọ ga-esiri ndị bi n’èzí nke ụlọ mkpọrọ ahụ ike irute ha. Ugbu a, onye ya na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ bụkwa onye Kraịst meworo baptism.
Ndị a bụ nanị ihe atụ ole na ole iji gosi ihe a na-arụpụta site n’ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na-arụ. N’eziokwu, Ndịàmà Jehova emewo ka ozi ọma ahụ nke mmụọ ozi a na-adịghị ahụ anya na-ekwusa dapụtaghachi ụda ‘dị ka ozi ọma nye ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.’
Ọ bụ ozi kachasị ozi nile mma, ọ bụkwa nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Anyị na-agba gị ume ka i gee ntị na ya. Dị ka Ken na John n’England, dị ka Rafael na nwunye ya n’Argentina, dị ka José na Spain, dịkwa ka ọtụtụ ìgwè ndị ọzọ, anyị na-esonyere mmụọ ozi ahụ n’ịgba mmadụ nile ume sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa ya otuto; n’ihi na oge awa nke ikpe ya abịawo: kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ́ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri na isi iyi nile nke mmiri nile.”—Mkpughe 14:7.