Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 3/15 p. 3-6
  • Gịnị Ka Ọnwụ Jisọs Pụtara nye Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ọnwụ Jisọs Pụtara nye Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Ọ Bụ?
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
  • Ihe O Mere Ka O Kwe Omume
  • Onye Ka A Gbapụtara?
  • Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Ekele
  • Gịnị Ka Ị Ga-eme?
  • Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Jehova Enye “Ihe Mgbapụta n’Ọnọdụ Ọtụtụ Mmadụ”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ihe Mgbapụta Kraịst—Ụzọ Nzọpụta nke Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 3/15 p. 3-6

Gịnị Ka Ọnwụ Jisọs Pụtara nye Gị?

“Ọ BỤRỤ na a chịkọta ndị agha nile a zụrụ maka ịlụ agha n’elu ala, usoro ndị agha ime mmiri nile e wuliteworo mgbe ọ bụla, òtù nzukọ ndị ọchịchị nile nọdụworo n’ọkwa ọchịchị mgbe ọ bụla, na ndị eze nile chịtụworo mgbe ọ bụla, ọ dịghị nke ọ bụla nweworo mmetụta ná ndụ mmadụ n’elu ala nke a n’ụzọ siri ike dị ka nke otu onye a meworo.” Otú a ka onye na-ede akwụkwọ bụ James A. Francis dere banyere Jisọs Kraịst.

Ndị mmadụ na-ele Jisọs anya n’ụzọ dị ịche ịche, ma Bible na-eme ka a mata ya dị ka Ọkpara Chineke na nwoke nke nwere ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà. Jisọs hotara otu ụzọ bụ isi nke o si gosipụta ịhụnanya ahụ mgbe o kwuru banyere onwe ya, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere ya ozị, kama ka o jee ozị, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”—Matiu 20:28.

Gịnị bụ abamuru nke ihe mgbapụta nke a? N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa? Olee ndị ka a gbapụtara? N’ezie, gịnị ka ọnwụ Jisọs pụtara nye gị?

Gịnị Ka Ọ Bụ?

Ihe mgbapụta bụ ihe na-atọhapụ ihe. Ịgbapụta mmadụ pụtara ịnapụta ya sịte ná ndọta n’agha ma ọ bụ ntaramahụhụ site n’ịkwụ ọnụ ahịa. N’ụzọ ịme mmụọ, “ịgbapụta” pụtara iweta nnapụta pụọ n’aka mmehie na ahụhụ ọ na-eweta. Ọ bụ n’ihi nke ahụ ka Jisọs ji nwụọ ọnwụ. Dị ka onyeozi ndị Kraịst bụ Pọl si dee: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebị n’ịme Kraịst Jịsọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 6:23.

N’ime Akwụkwọ nsọ a na-ejikọta ọnụ ahịa mgbapụta na ịkwụ ụgwọ maka mgbapụta. Abụ Ọma 49:6-9 na-ekwu, sị: “Ndị na-atụkwasị obi n’akụ ha, na-anyakwa isi n’ịba ụba nke ọgaranya ha bụ, ọ dịghị onye ọ bụla ga-agbaputa nwanne ya ma ọlị, ọ gaghị enye Chineke ihe mgbapụta ya: (n’ihi na mgbapụta mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ ahịa, ọ ga-arakwa ya aka ruo mgbe ebịghị ebi) ka o wee dịgịde ndụ ruo mgbe ebịghị ebi, ghara ịhụ mbibi anya.” Ihe mgba-pụta ahụ bụ mgbapụta nke e sitere n’aka Chineke rụzuo, ọ bụghị sịte n’aka mmadụ ọ bụla n’ezughị òkè.

N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?

Ihe mgbapụta ahụ dị mkpa n’ihi na Adam, nna anyị mbụ bụ mmadụ mehiere. O si otú a tụfuo ndụ zuru òkè nke na-enweghị ọgwụgwụ, bụrụ onye a mara ịkpe ọnwụ n’ụzọ ziri ezi, o wee mesịa nwụọ. (Jenesis 2:15-17; 3:1-7, 17-19; 5:5) Dị ka ụmụ ya, anyị eketawo mmehie na ọnwụ. “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa,” ka Pọl dere “ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehịe-re.” (Ndị Rom 5:12) Ee, “ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam.” (Ndị Kọrint 15:22) Ya mere onye ọbụ abụ bụ Devid ziri ezi n’ikwu, sị: “N’ajọ omume ka a mụpụtara m; ọ bụkwa ná mmehịe ka nne m tụụrụ ime m.”—Abụ Ọma 51:5.

Nnapụta pụọ n’ịkpe ọmụma nke mmehịe na ọnwụ dị mkpa ma ọ bụrụ na nwa ọ bụla nke Adam bụ́ onye mmehie ga-enweta ndụ ebighị ebi. Ebe ụmụ mmadụ na-ezughị òkè na-apụghị iweta ịhe mgbapụta nke a, Jehova, site n’ịhụnanya, mere otú ahụ site n’aka Jisọs Kraịst. Ma, gịnị ka e ji ihe mgbapụta ahụ zụta? Otu ọ dị, mgbe Adam mehiere, ọ tụfuru ndụ ebighị ebi zuru òkè nke mmadụ, ya na ihe nile ruuru ya, na ọdịnihu ọma ya dị iche iche. N’ihi ya, site n’àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst, a gbapụtara otu ịhe ahụ.

Ihe O Mere Ka O Kwe Omume

E mezuru ikpe ziri ezi site na mmadụ ịnwụ ọnwụ, nke bụ ahụhụ nke mmehịe. Ya mere ihe mgbapụta ahụ bụ ọrụ obi ebere nke Chineke na ebere ịhụnanya ya. Ndụ mmadụ zuru oke nke Jisọs, ya na ịhe nịle ruuru ya na ọdịnịhu ọma ya dị ịche ịche, ka a tọgbọrọ n’ọnwụ n’ewereghachighịkwa ya ọzọ, n’ịhi na e meghị ka o si n’ọnwụ bilie dị ka mmadụ nke anụ ahụ na ọbara kama dị ka mmụọ e kere eke nke na-apụghị ịnwụ anwụ. (1 Ndị Kọrint 15:50; 1 Pita 3:18) Otụ́ a ndụ mmadụ nke Jisọs Kraịst nke a chụrụ n’àjà nọgidere na-enwe ike nnapụta, ma ọ bụ mgbapụta.

Dị ka mmadụ nke na-emeghị mmehie, Jisọs nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ Adam zuru okè nọ na mbụ. N’ihi na Jisọs rubeere Chineke isi ruo ọnwụ, e mere ya Onyeisi Nchụàjà Ukwu, o jikwa uru nke àjà mmadụ ya ahụ zuru okè wee banye n’eluigwe. (Ndị Hịbru 9:24-26) N’ihi na Chineke nabatara ọnụ ahịa mgbapụta nke a, Jisọs pụrụ ịgbapụta ụmụ Adam ndị na-egosi okwukwe pụọ ná mmehie na ọnwụ site n’itinye uru nke àjà ya n’ihi ha n’ọrụ. (1 Ndị Kọrịnt 6:20; 7:23; 1 Jọn 2:1, 2) Otú’a Jisọs “ghọọrọ ndị nile na-aṅa ya ntị onye na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.” (Ndị Hibru 5:8, 9) Nke a na-eme ka o kwe omume ha iru eru ịbụ ndị a gụrụ dị ka ndị ezị omume n’ihu Chineke site n’aka Ọkpara ya.

Onye Ka A Gbapụtara?

Mgbe ahụ, olee ndị na-erite uru ihe mgbapụta ahụ? Ọ bụ ụmụ mmadụ ndị na-egosị okwukwe n’onyinye nke a wee si otú a soro Chineke na-enwe nkwekọ. Sịte n’ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasi obị, a pụrụ ime ka ha nwere onwe ha pụọ ná mmehie na ahụhụ ya bụ ọnwụ ma nata ndụ ebighị ebị.—Jọn 17:3.

Mmadụ mbụ ahụ pụrụ ikpebiworịị ma ọ̀ ga-erubere Chineke isi ma ọ bụ na ọ gaghị. Ọ họọrọ inupụ isi. “Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọrọ aghụghọ,” ma ọ nwụrụ dị ka onye nke kpachapụrụ anya mehịe. (1 Timoti 2:14) Ma, gịnị banyere ụmụ Adam? Ha pụrụ ịkpebị ijere Chineke ozi ruo ókè nile ezughị okè ha kwere ha mee ma ọ bụ ịnupụrụ Onye Okike ha isi.—Joshua 24:15.

Jisọs bịara “ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ịhe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mak 10:45) Ma olee ndị “ọtụtụ ndị” ahụ bụ? O doro anya na Adam esoghị ya n’ihi na ọ bụ mmadụ zuru okè bụ́ onye kpachapụrụ anya họrọ inupụrụ Chineke isi wee nwụọ dị ka onye mmehịe leziri anya mee mmehie, nke na-enwe-ghị nchegharị. Ma gịnị banyere ezịnụlọ ukwu ya, nke ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ puku nde? N’iji ọnụ ahịa ha nhata, Jịsọs Kraịst kwụrụ ụgwọ ikpe ọmụma ahụ e ketara eketa nke na-adịkwasị n’ezinụlọ Adam. (Tụlee 1 Timoti 2:5, 6.) N’ihi “ọtụtụ ndị” ahụ kwere ekwe, Jisọs na-etinye uru nke ọnụ ahịa mgbapụta ya ahụ n’ọrụ.

Ndị ahụ kwere ekwe a gbapụtara agbapụta na-agụnye ma ndị Juu ma ndị Jentaịl, ma ọ bụ ndị mba ọzọ. Pọl na-ekwu, sị: “Dị ka ịkpe ahụ sitere n’otu ndahịe bịa ruo mmadụ nịle iwetara ha amamikpe; ọbụna otú a ka onyinye amara ahụ sitere n’otu ọrụ ezi omume bịa ruo mmadụ nile ịgụ ha ná ndị ezi omume ka ha nata ndụ.” (Ndị Rom 5:18) Site n’ịnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, “Kraịst gbapụtara [ndị Juu] n’ọbụbụ ọnụ nke Iwu ahụ, ebe ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ n’ọnọdụ [ha]: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onye a na-abụ ọnụ ka ọ bụ, bụ́ onye ọ bụla nke a na-akwụba n’elu osịsị.” (Ndị Galatia 3:13; Deuteronomi 21:23) Ndị Rom 4:11 na-ekwu banyere ndị Jentaịl mgbe ọ na-ekwu na ọ bụ ezie na Abraham, bụ́ nna ochie nke ndị Juu, bụ onye a na-ebịbeghị ụ́gwù, ọ ghọrọ “nna nke ndị nile kwere ekwe, ọ bụ ezie na ha nọ n’ebighị úgwù.” Ya mere, àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst na-abara ndị Juu na ndị Jentaịl uru, bụ́ ndị kwere ekwe.

Ụzọ onye ọ bụla na-agbaso na-ekpebi ma ọ ga-erite uru sịte n’àjà Jịsọs. Dị ka Adam, ọ bụghị ihe a na-eme ná mmanye ime ka ndị ji nlezi anya na-eme ihe ọjọọ nweta uru nke mgbapụta ahụ na ndụ ebighị ebi. Dị ka Kraịst si kwuo: “Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebị; ma onye na-ekweghị n’Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.” (Jọn 3:36) Mgbapụta ahụ na-emekwa ka mbilite n’ọnwụ kwe omume maka ndị ahụ nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke. (Jọn 5:28, 29) Ọ bụrụ na ha erube isi ma gosị ekele, itinye abamuru dị iche iche nke mgbapụta ahụ n’ọrụ maka ha pụtara na ha ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebị. Ma nye ndị ahụ na-adị ndụ na mgbe “ikpeazụ nke a” ịdị ndụ ebịghị ebị n’enweghị mkpa nke ịnwụ ọnwụ ma ọlị pụrụ ịkwe omume.—2 Tímoti 3:1-5; Matiu 24:3-14, 21, 34; Jọn 11:25, 26.

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Nwee Ekele

Onye ọ bụla nke na-enwe ọchịchọ nke irite uru site ná mgbapụta ahụ aghaghị inwe ekele dị omimi maka ya. Leekwa nnọọ ka ekele dị otú a sị kwesị ekwesị! E kwuwerị, mgbapụta ahụ chọrọ ịhụnanya dị ukwuu n’akụkụ nke Chineke na Kraịst.

Jehova Chịneke gosịrị ịhụnanya dị ukwuu n’ịnye ịhe mgbapụta ahụ site n’ọnwụ nke Ọkpara ya. Jisọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ịhe akpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebị. N’ịhị na Chịneke ezịteghị Ọkpara ya n’ụwa ka o kpee ụwa ikpe; kama ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.” (Jọn 3:16, 17) Ọ̀ bụ na o kwesighị ka i nwee ekele maka ngosipụta nke a nke ịhụnanya Chineke?

Cheekwa echiche banyere ịdị omimi nke ịhụnanya Jehova n’ime ndokwa maka ihe mgbapụta ahụ. Tupu e zite Ọkpara Chineke n’elu ụwa ịbịa dị ndụ ma nwụọ dị ka mmadụ zuru okè, ọ dịrị adị dị ka mmụọ. Ọ bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ịhe nile e kere eke,” onye “e kere ihe nile, nke dị n’ime eluigwe na nke dị n’elu ụwa, ihe a pụrụ ịhụ anya na ịhe anapụghị ịhụ anya,” site n’aka ya. (Ndị Kọlọsị 1:13-16) Lee nnọọ ka Jehova sị hụ Ọkpara ya n’anya! Otú o sịna dị, Chịneke ezịteghị nnọọ nke ọ bụla n’ime ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi bụ́ ndị ezị omume n’elu ala. O nwere nnọọ ịhụnanya dị ukwuu maka ihe akpọrọ mmadụ nke na o zitere Ọkpara ya o buru ụzọ mụọ.

Tụleekwa, ịhụnanya dị omimi nke Jisọs gosiri n’ihe banyere ihe mgbapụta ahụ. Dị ka mmụọ e kere eke n’eluigwe, ọ bụ “onyeọkà” nke Chineke. N’ezie, “ihe na-atọ [Ọkpara Chineke] ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.” (Ilu 8:22-31) Ma, ọ dịghịrị ya mfe ịhapụ eluịgwe, ya na ọnọdụ ya ndị mara mma na nnọkọ nke ya na Nna ya na ìgwè ndị mmụọ ozị bụ́ ndị ezi omume. Site n’ọnọdụ dị elu n’eluịgwe, Ọkpara Chineke pụrụ ịhụ ọnọdụ ọjọọ ndị dị n’elu ala na mbibi ndị mmehie na ọnwụ wetawooro ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ makwaara na inye ihe mgbapụta ahụ ga-eweta ọnwụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ “[naara] ụdị nke ohu, e wee mee ya n’oyịyị nke mmadụ; . . . o wedakwara onwe ya, wee bụrụ onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ.” Maka ịkwesị ntụkwasị obị dị otú ahụ e buliri Jisọs gaa ná ndụ eluigwe nke dị ebube. (Ndị Filipaị 2:5-11) Lee nnọọ ịhụnanya o gosịrị n’ihe banyere ihe mgbapụta ahụ! Ì nwere ekele maka ihe Jisọs mere?

Gịnị Ka Ị Ga-eme?

Onye bishọp England bụ Richard nke Chichester (ihe dị ka 1198-1253) kpere ekpere n’otu mgbe ka ndị ịkom na ndị ịnyom nwee ịke “ịmara Jisọs Kraịst n’ụzọ doro anya karị, ịhụ ya n’anya n’ụzọ dị ukwuu karị na isochi ya anya karị.” Àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst n’ezịe na-enye otu ihe doro anya mere a ga-eji mara ya, hụ ya n’anya, na-esokwa ya.

A sị na ọ bụghị n’ihi ihe mgbapụta ahụ, dị ka ndị mmehie anyị gaara anwụ n’enweghị olileanya, n’ịhi na “ihe ọgbụgba nke ọnwụ bụ mmehie.” (1 Ndị Kọrint 15:56) Ya mere, ka ị wee bụrụ onye a zọpụtara site n’ọnwụ nke gị ịbụ onye mmehie gbaworo ga-arụpụta, gịnị ka ị na-aghaghị ime? Ọ dị gị mkpa ịmụ banyere ihe Chineke nyeworo maka nzọpụta site na Jisọs Kraịst. Mgbe ahụ ị ghaghị igosịpụta na i nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’igosi ekele si n’ala ala obi maka ya na ịrara onwe gị nye Chịneke, na-agwakwa ndị ọzọ banyere ihe onyinye nke a dị ebube maka nzọpụta.

Ịgbaso ụzọ nke a pụrụ itinye gị n’etiti “oké ìgwè mmadụ” ahụ ndị “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta, . . . ha sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara nwa atụrụ ahụ,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 7:9, 14) Olileanya ha bụ ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala. (Luk 23:43) Ee, ị pụkwara ịbụ akụkụ nke ìgwè mmadụ ahụ nwere obi ụtọ, ma ọ bụrụ na ọnwụ Jisọs bụ n’ezie ihe dị oké ọnụ ahịa nye gị.

[Foto dị na peeji nke 4]

Jisọs nke na-emeghị mmehie nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ Adam zuru okè nọ na mbụ

[Foto dị na peeji nke 6]

Ị̀ na-aghota ihe ọ pụtara n’ezie bụ́ ọnwụ nke Jisọs?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya